Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?

Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?

Ihe Baịbụl kwuru

 Anụ ọhịa nwere isi asaa e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1 nọchiri anya ọchịchị niile e nwere n’ụwa.

  •   O nwere ikike, nwee ocheeze, na-akpakwa ike. Ihe a gosiri na ọ bụ ọchịchị.​—Mkpughe 13:2.

  •   Ọ na-achị “ebo niile na ndị niile na asụsụ niile na mba niile.” N’ihi ya, ọ karịrị otu ọchịchị na-achị otu obodo.​—Mkpughe 13:7.

  •   Ya na anụ ọhịa anọ e kwuru okwu ha na Daniel 7:​2-8 yiri. Dị ka ihe atụ, ọ dị ka agụ owuru, nwee ụkwụ anụ ọhịa bea, nwee ọnụ ọdụm, nweekwa mpi iri. Anụ ọhịa ndị ahụ e kwuru okwu ha n’amụma Daniel pụtara ndị eze dị iche iche ma ọ bụ alaeze dị iche iche, ndị ga-achị ụwa ma ibe ha chịchaa. (Daniel 7:​17, 23) N’ihi ya, anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 nọchiri anya ọchịchị niile e nwere n’ụwa.

  •   O si “n’oké osimiri” pụta. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ụmụ mmadụ jụrụ ife Chineke ka ọchịchị ụmụ mmadụ si n’aka. Ha na-akpa aghara ka ebe osimiri na-amali elu.​—Mkpughe 13:1; Aịzaya 17:​12, 13.

  •   Baịbụl kwuru na aha anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba ya bụ 666, kwuokwa na ọ bụ “nọmba nke mmadụ.” (Mkpughe 13:​17, 18) Ihe a a kpọrọ ya gosiri na anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 gbasara ụmụ mmadụ, ọ bụghị mmụọ ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ.

 Ọ bụ eziokwu na mba dị iche iche anaghị ekwekọrịta n’ọtụtụ ihe, ma ha niile kpebisiri ike na ha ga na-achị kama ikwe ka Alaeze Chineke chịwa ha. (Abụ Ọma 2:2) Ha niile ga-agbakọta aka lụso Jizọs Kraịst na ndị mmụọ ozi Chineke agha n’Amagedọn. Ma, a ga-ebibi ha niile n’agha ahụ.​—Mkpughe 16:​14, 16; 19:​19, 20.

“Mpi iri na isi asaa”

 Ọnụ ọgụgụ ụfọdụ e dere na Baịbụl nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, asaa na iri pụtara ihe zuru ezu. Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe “mpi iri na isi asaa” nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 pụtara? Ọ bụ ihe Baịbụl mechara kwuo gbasara “onyinyo nke anụ ọhịa ahụ.” O kwuru na ọ bụ anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri. (Mkpughe 13:​1, 14, 15; 17:3) Baịbụl kwuru na isi asaa nke anụ ọhịa a na-acha uhie uhie pụtara “ndị eze asaa,” ma ọ bụ ọchịchị dị iche iche.​—Mkpughe 17:​9, 10.

 N’ihi ya, isi asaa nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1 nọchiri anya ọchịchị asaa a ma ama chịrị ụwa, ndị kachakwa kpagbuo ndị Chineke. Ha bụ Ijipt, Asiria, Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, Rom, nakwa Briten na Amerịka. Ebe ọ bụ na mpi iri ahụ nọchiri anya mba niile na-achị onwe ha, ma ndị ukwu ma ndị nta, ihe ọ pụtara bụ na okpueze nke dị na mpi nke ọ bụla na-egosi na ọ bụ n’otu oge ahụ ọchịchị ndị ahụ a ma ama na-achị ụwa na-achị ka mba ndị ahụ na-achị onwe ha na-achịkwa.