Gaa n'Isiokwu

Olee Ihe Abụọ Na-eme Ka Chineke Ghara Ịza Ekpere Ụfọdụ?

Olee Ihe Abụọ Na-eme Ka Chineke Ghara Ịza Ekpere Ụfọdụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 E nwere ekpere ndị Chineke na-anaghị aza. Legodị ụzọ ihe abụọ na-eme ka Chineke ghara ịza mmadụ ekpere.

1. Ekpere na-adabaghị n’uche Chineke

 Chineke anaghị aza ekpere megidere uche ya ma ọ bụ nke na-adabaghị n’ihe ọ gwara anyị na Baịbụl ka anyị na-eme. (1 Jọn 5:14) Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru ka anyị zere anyaukwu. Ma, ịgba chaa chaa na-eme ka mmadụ dịrị anyaukwu. (1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10) Ebe ọ dị otú ahụ, Chineke agaghị aza gị ma i kpegara ya ekpere ka o mee ka i rite ego na lọtrị. Chineke abụghị ohu anyị nke anyị ga na-agwa ka o meere anyị ihe ọ bụla anyị chọrọ. Obi kwesịrị ịdị gị ụtọ na Chineke adịghị otú ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, ụjọ ga na-atụ gị na Chineke nwere ike imemila gị ma ndị iro gị gwa ya mee otú ahụ.—Jems 4:3.

2. Onye na-ekpe ekpere ma na-enupụrụ Chineke isi

 Chineke anaghị aza ekpere ndị gbara isi akwara na-enupụrụ ya isi. Dị ka ihe atụ, o nwere ihe Chineke gwara ndị na-ekwu n’ọnụ na ha na-efe ya ma n’otu mgbe ahụ na-enupụrụ ya isi. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, adịghị m ege ntị; aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịzaya 1:15) A sị na ha gbanwere àgwà ọjọọ ha ma mee ka ha na Chineke “kpezie,” ọ gaara ege ntị n’ekpere ha.—Aịzaya 1:18.