Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?

Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?

Ihe Baịbụl kwuru

 Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ, naanị ya achịwazie ụwa niile. (Daniel 2:44; Mkpughe 16:14) Ya bidohaala ịchị ụwa niile, lee ihe ndị ọ ga-eme.

  •   Ọ ga-ewepụ ndị ọjọọ niile, ha agaghịzi na-enye anyị nsogbu. Ilu 2:22 kwuru na “a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa.”

  •   Ọ ga-eme ka agha kwụsị. Abụ Ọma 46:9 kwuru na Chineke ga-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.

  •   Ọ ga-eme ka ihe dịrị ụmụ mmadụ mma, meekwa ka obi ruo onye ọ bụla ala. Maịka 4:4 kwuru, sị: “Onye ọ bụla ga-ebi n’udo n’ime ụlọ nke aka ya, ihe ga-agakwara mmadụ nile nke ọma, n’ihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ.” (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society)

  •   Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Aịzaya 35:1 kwuru, sị: “Ala ịkpa na ógbè mmiri na-adịghị ga-enwe aṅụrị, mbara ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, waakwa okooko.”

  •   Ọ ga-eme ka onye ọ bụla nwee ihe ọ na-arụ ga na-eme ya obi ụtọ. Aịzaya 65:21-23 sịrị na “ndị [Chineke] họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”

  •   Ọrịa agaghịzi adị. Aịzaya 33:24 kwuru, sị: “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”

  •   O nweghịzi onye ga-eme agadi. Job 33:25 sịrị: “Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata; ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.”

  •   A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Jọn 5:28, 29 sịrị na “ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.”