Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Chineke Chọrọ Ka M Jiri Ndụ M Mee?

Gịnị Ka Chineke Chọrọ Ka M Jiri Ndụ M Mee?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Chineke chọrọ ka ị mata onye ọ bụ, bịaruo ya nso, hụ ya n’anya, ma jiri obi gị niile na-efe ya. (Matiu 22:37, 38; Jems 4:8) Otú Jizọs si bie ndụ na ihe ndị ọ kụziri ga-enyere gị aka ime uche Chineke. (Jọn 7:16, 17) Ihe Jizọs mere abụghị naanị ịgwa ndị ọzọ ka ha mee uche Chineke, kama yanwa mekwara uche Chineke. Jizọs kwudịrị na ihe bụ́ isi ná ndụ ya bụ ‘ime uche onye zitere ya, ọ bụghị ime uche nke ya.’—Jọn 6:38.

Chineke ọ̀ ga-agwa m ná nrọ ma ọ bụ kpugheere m ma ọ bụkwanụ kpọọ m n’ụzọ pụrụ iche gwa m ihe ọ chọrọ ka m mee?

 Mba, n’ihi na Chineke emeela ka e dee ihe niile ọ chọrọ ịgwa ụmụ mmadụ na Baịbụl. Ihe niile ga-eme ka ị “bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile” dị na Baịbụl. (2 Timoti 3:16, 17) Chineke chọrọ ka i jiri “ike iche echiche” gị mụọ Baịbụl ka ị mata ihe ọ chọrọ ka i mee.—Ndị Rom 12:1, 2; Ndị Efesọs 5:17.

M̀ ga-emeli uche Chineke?

 Ee, ị ga-emeli ya n’ihi na Baịbụl kwuru na, ‘Idebezu iwu Chineke niile adịghị enye nsogbu.’ (1 Jọn 5:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ma, ọ pụtaghị na o nweghị mgbe ọ ga-esitụrụ gị ike idebe iwu Chineke. Ma, uru ị ga-erite ga-akarị mbọ ị gbara. Jizọs sịrị na “obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:28.