Gaa n'Isiokwu

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Ihe Baịbụl kwuru

 Maịkel bụ aha a kpọrọ Jizọs mgbe ọ nọ n’eluigwe nakwa mgbe o si n’ụwa laghachi n’eluigwe. Ụfọdụ okpukpe na-akpọ ya St Maịkel. * Maịkel na Setan sere okwu banyere ozu Mozis, o nyekwaara otu mmụọ aka ya aga zie Daniel onye amụma ozi Chineke ziri ya. (Daniel 10:13, 21; Jud 9) Maịkel mezuru ihe aha ya pụtara nke bụ́, “Ònye Dị ka Chineke?” maka na ọ gbachiteere ọchịchị Chineke, lusookwa ndị iro Chineke ọgụ.—Daniel 12:1; Mkpughe 12:7.

 Legodị ihe mere anyị ji kwuo na Jizọs bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi.

  •   Maịkel bụ “onyeisi ndị mmụọ ozi.” (Jud 9) Utu aha ahụ bụ́ “onyeisi ndị mmụọ ozi” nke pụtara “onye ndú ndị mmụọ ozi,” dị naanị ụzọ ebe abụọ n’ime Baịbụl. Amaokwu Baịbụl abụọ ahụ na-ekwucha maka otu onye, nke pụtara na ọ bụ naanị otu mmụọ ozi nwe utu aha a. Otu n’ime amaokwu ahụ kwuru na Onyenwe anyị Jizọs “ga-esi n’eluigwe rịdata, ọ ga-eji olu dara ụda kpọọ òkù bụ olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi.” (1 Ndị Tesalonaịka 4: 16) Jizọs nwere olu onyeisi ndị mmụọ ozi maka na ọ bụ ya bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi.

  •   Maịkel na-edu ụsụụ ndị agha bụ ndị mmụọ ozi. “Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha” ya bụ Setan. (Mkpughe 12:7) Maịkel nwere ike karịa ndị mmụọ niile e kere eke, ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya “otu n’ime ndị isi kasịnụ” nakwa “nnukwu onyeisi.” (Daniel 10:13, 21; 12:1) Otu ọkachamara aha ya bụ David E. Aune, onye na-amụ gbasara Agba Ọhụrụ kwuru na utu aha ahụ bụ Maịkel pụtara na ọ bụ ya bụ “onye ndú nke ụsụụ ndị agha bụ ndị mmụọ ozi.”

     Baịbụl kpọrọ naanị aha otu onye nwere ike n’ebe ụsụụ ndị agha bụ ndị mmụọ ozi nọ. O kwuru banyere “mgbe a ga-ekpughe Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe ya na ndị mmụọ ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu mgbe ọ na-abọ ọbọ.” (2 Ndị Tesalonaịka 1: 7, 8; Matiu 16:27) Jizọs “gara n’eluigwe; e mekwara ka ndị mmụọ ozi na ndị na-achị achị na ndị di ike nọrọ n’okpuru ya.” (1 Pita 3: 21, 22) Ọ ganụghị ekwe omume Chineke ịhọpụta Jizọs nakwa Maịkel ka ha bụrụ ndị isi abụọ nke ndị mmụọ ozi dị nsọ. Kama, ọ kacha mma ikwu na ma Jizọs ma Maịkel bụ aha otu onye.

  •   Maịkel ‘ga-ebili . . . n’oge ahụhụ’ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya. (Daniel 12:1) N’akwụkwọ Daniel, a na-ejikarị okwu bụ́ “ga-ebili” akọwa na otu eze biliri ime otu ihe dị mkpa. (Daniel 11: 2-4, 21) Jizọs Kraịst bụ onye a kpọrọ “Okwu Chineke” bụ “Eze nke ndị eze” ga-ebibi ndị iro Chineke ma chebe ndị na-efe ya. (Mkpughe 19:11-16) Ọ ga-eme ya n’oge “oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere.”—Matiu 24:21, 42.

^ Na Baịbụl e nwere ụfọdụ ndị nwere ihe karịrị otu aha a na-akpọ ha, dị ka Jekọb (a na-akpọkwa ya Izrel), Pita (a na-akpọkwa ya Saịmọn) nakwa Tadiọs (a na-akpọkwa ya Judas).—Jenesis 49: 1, 2; Matiu 10: 2, 3; Mak 3: 18; Ọrụ Ndịozi 1:13.