Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke Idina Nwoke na Nwaanyị Idina Nwaanyị?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke Idina Nwoke na Nwaanyị Idina Nwaanyị?

Ihe Baịbụl kwuru

 Chineke kere ụmụ mmadụ ka ọ bụrụ naanị di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 1:​27, 28; Levitikọs 18:22; Ilu 5:​18, 19) Baịbụl kagburu ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ, nakwa mmadụ iso nwoke ibe ya na nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ. (1 Ndị Kọrịnt 6:​18) Ịpị ma ọ bụ ịdịda mmadụ aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, iji ọnụ amị ihe mmadụ bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, na i si n’otule enwe mmekọahụ socha ná mmekọahụ Baịbụl kagburu.

 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kagburu nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị, ma, o kwughị ka a kpọọ ndị na-eme ụdị omume ahụ asị. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ‘sọpụrụ ụdị mmadụ niile.’​—1 Pita 2:​17.

 Mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ò nwere ike ịbụ ebumpụta ụwa?

Baịbụl ekwughị kpọmkwem gbasara otú ahụ́ ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha si arụ ọrụ. Ma ihe o kwuru bụ na a mụrụ anyị otú ga-eme ka ọ na-agụ anyị agụụ imebi iwu Chineke. (Ndị Rom 7:​21-​25) Baịbụl abịaghị kwuwe ihe mere o ji agụ ụfọdụ ndị idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, kama ime otú ahụ, ọ kagburu mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya.

 Otú ị ga-esi eme ihe Chineke na-achọ n’agbanyeghị na ọ na-adị agụ gị agụụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị.

Baịbụl sịrị anyị mee ‘ka akụkụ ahụ́ anyị nwụọ n’ihe banyere agụụ mmekọahụ’ na-ezighị ezi.’ (Ndị Kọlọsi 3:5) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ gị agụụ, i kwesịrị ịma ụdị ihe ị ga na-eche. Ọ bụrụ na ihe ị na-eche mgbe niile bụ ihe dị mma, ọ ga-eme agụụ ime ihe ọjọọ bata gị n’obi, gị ewepụ ya ngwa ngwa. (Ndị Filipaị 4:8; Jems 1:​14, 15) Ọ bụ eziokwu na iwepụ ihe ọjọọ batara gị n’obi ngwa ngwa nwere ike isiri gị ike ná mmalite, ma nwayọọ nwayọọ, ọ ga-adịrị gị mfe. Chineke kwere nkwa na ya ga-enyere gị aka ‘ka ike nke na-eduzi uche gị dị ọhụrụ.’​—Ndị Efesọs 4:​22-​24.

 E nwekwara ọtụtụ ndị mmekọ nwoke na nwaanyị na-agụ agụụ ma ha ana-agbalị iwepụ ya n’obi ha n’ihi na ha chọrọ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, na-anaghị atụ anya na ha ga-alụ, ma ọ bụkwanụ ndị ọnọdụ di ha ma ọ bụ nwunye ha na-agaghị ekwe ha na-enwe mmekọahụ. Ha na-ejide onwe ha n’agbanyeghị na ọnwụnwa ịkwa iko na-abịara ha. Ha na-enwekwa obi ụtọ ná ndụ ha. Ndị ọ na-agụ agụụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwekwara ike ịmụta ijide onwe ha ma ọ bụrụ n’eziokwu na ha chọrọ ime ihe dị Chineke mma.​—Diuterọnọmi 30:19.