Gaa n'Isiokwu

Mmadụ Ò Kwesịrị Inwe Okpukpe Ọ Nọ na Ya?

Mmadụ Ò Kwesịrị Inwe Okpukpe Ọ Nọ na Ya?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Ee, n’ihi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ na-ezukọta na-efe ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

 Jizọs kwuru ihe gosiri na ndị na-eso ụzọ ya ga-amalite otu okpukpe a haziri ahazi. Ọ gwara ha sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Otu ụzọ ndị na-eso ụzọ ya ga-esi egosi ịhụnanya a bụ ma ha na ndị kwere ekwe ibe ha na-emekọ ihe. Ha ga na-ezukọtakwa n’ọgbakọ dị iche iche mgbe mgbe maka ife Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 16:19) Ha niile ga-aghọ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.—1 Pita 2:17.

Mmadụ inwe okpukpe ọ nọ na ya abụghị ebe okwu biri

 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịna-abịakọ ọnụ na-efe Chineke, ma ọ pụtaghị na okpukpe ọ bụla mmadụ nọ na ya dị Chineke mma. Ihe ga-eme ka okpukpe anyị nọ na ya na-amasị Chineke bụ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka anyị na-akpa àgwà ọma. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jems 1:27, Bible Nsọ nke Union Version.