Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ekwensu Dị?

Olee Otú Ekwensu Dị?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ekwensu bụ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, nke pụtara na o nweghị ahụ́ nkịtị a na-ahụ anya.​—⁠Ndị Efesọs 6:​11, 12.

 Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ sewe Ekwensu n’akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ, ha na-ese ya ka o yie ewu nwere mpi na ogologo ọdụ, jidekwa fọk toro ogologo n’aka. Ụfọdụ ndị kwuru na ọ bụ ndị na-ese ihe n’oge ochie malitere ise ya otú ahụ. Ọ bụkwanụ akụkọ ifo na akụkọ ndị mgbe ochie ndị ha nụrụ mere ha ji sewe ya otú ahụ.

 Olee otú Baịbụl si kọwaa onye Ekwensu bụ?

 E nwere ọtụtụ ụzọ Baịbụl si kọwaa onye Ekwensu bụ. Ụzọ ndị ahụ e si kọwaa ya na-enyere anyị aka ịmata ụdị onye ọ bụ, ọ bụghị otú ọ dị. Ụzọ ụfọdụ e si kọwaa ya bụ:

  •   Mmụọ ozi nke ìhè. Ọ na-eme ka o yie ka ọ na-enye ndị mmadụ ihe ndị dị mma, ma ọ chọrọ iji ya rata ha ka ha kweta n’ihe ndị ọ na-agwa ha kama iso ihe Chineke na-agwa ha.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 11:⁠14.

  •   Ọdụm na-ebigbọ ebigbọ. Ọ na-eji obi ọjọọ na-emegide ndị na-efe Chineke.​—⁠1 Pita 5:⁠8.

  •   Dragọn ukwu. Ọ dị ike, na-eyi egwu, na-emebisikwa ihe.​—Mkpughe 12:⁠9.