Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ọpụpụ 20:12​—“Sọpụrụ Nne Gị na Nna Gị”

Ọpụpụ 20:12​—“Sọpụrụ Nne Gị na Nna Gị”

 “Sọpụrụ nne gị na nna gị, ka i wee dị ogologo ndụ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.”​—Ọpụpụ 20:​12, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n’elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nenye gi.”​—Ọpụpụ 20:12, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Ọpụpụ 20:12 Pụtara

 Chineke nyere ndị Izrel oge ochie iwu ka ha na-asọpụrụ nne ha na nna ha. Chineke kwukwara na ya ga-emere ndị rubere isi n’iwu a ihe. Nkwa a o kwere bụ ihe ọzọ mere ha kwesịrị iji rube isi. Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst anaghịzi edebe iwu ahụ Chineke nyere ndị Izrel, nke a na-akpọ Iwu Mosis, ma, ihe ndị e kwuru na ya ka bara uru taa. E nwere eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’Iwu ndị ahụ Chineke nyere. Ndị Kraịst ka kwesịkwara ịna-erube isi na ha.​—Ndị Kọlọsi 3:20.

 Ụmụ, ma ndị torola eto ma ụmụaka, kwesịrị ịna-akwanyere nne ha na nna ha ùgwù ma na-erubere ha isi. (Levitikọs 19:3; Ilu 1:8) Ọ bụrụgodị na mmadụ etoola, nweekwa ezinụlọ nke ya, ọ ka kwesịkwara ịna-ahụ nne na nna ya n’anya ma na-enyere ha aka. Dị ka ihe atụ, ọ ga-agba mbọ hụ na ọ na-elekọta nne na nna ya mere agadi, ọ bụnadị ịna-egboro ha mkpa ego mgbe ọ dị mkpa.​—Matiu 15:​4-6; 1 Timoti 5:​4, 8.

 Cheta na e nyere ndị Izrel iwu ka ha na-asọpụrụ ma nna ha ma nne ha, si otú ahụ gosi na ha ghọtara na nne bara ezigbo uru n’ezinụlọ. (Ilu 6:20; 19:26) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ịna-akwanyere nne na nna ya ùgwù taa.

 Ma, e nwere mgbe mmadụ na-ekwesịghị irube isi n’iwu a bụ́ “sọpụrụ nne gị na nna gị.” Ụmụaka ndị Izrel agaghị erubere nne na nna ha ma ọ bụkwanụ mmadụ ọ bụla ọzọ isi ma ọ bụrụ na ime otú ahụ ga-eme ka ha nupụrụ Chineke isi. (Diuterọnọmi 13:​6-8) Taakwa, Ndị Kraịst ‘na-erubere Chineke isi karịa mmadụ.’​—Ọrụ Ndịozi 5:29.

 N’Iwu ahụ Chineke nyere ndị Izrel, o kwere ha nkwa na ụmụaka ndị sọpụụrụ nne ha na nna ha ‘ga-adị ogologo ndụ, ihe agaziekwara ha’ n’ala Chineke ga-enye ha. (Diuterọnọmi 5:16) A gaghị ata ha ahụhụ a tara ndị toro eto ndị leghaara iwu Chineke anya ma nupụrụ nne na nna ha isi. (Diuterọnọmi 21:​18-21) Iwu a Chineke nyere agbanwebeghị. (Ndị Efesọs 6:​1-3) Ma ànyị bụ nwata ma ànyị bụ okenye, anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka otú anyị si rubere ya isi. Chineke ga-emezukwa nkwa o kwere, nke bụ́ na ụmụaka ndị na-erubere ya isi, na-erubekwara nne na nna ha isi ga-adị ogologo ndụ. N’eziokwu, ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—1 Timoti 4:8; 6:​18, 19.

Ihe Ndị Gbara Ọpụpụ 20:12 Gburugburu

 E nwere ihe anyị ga-amụta n’ebe iwu a si n’Ọpụpụ 20:12 gbara n’ime Iwu Iri ahụ ma ọ bụ Okwu Iri ahụ. (Ọpụpụ 20:​1-17) Iwu ndị bu ya ụzọ kwuru ihe ndị Izrel kwesịrị ịna-emere Chineke, ya bụ, na ha kwesịrị ịna-efe naanị ya. Iwu ndị na-esotezi ya kwuru ihe ndị Izrel ga na-emere mmadụ ibe ha, dị ka di na nwunye ịghara ịgba n’èzí nakwa ka mmadụ ghara izu ohi. Iwu ahụ bụ́ “sọpụrụ nne gị na nna gị” nọzi n’etiti iwu abụọ ndị ahụ. Ụfọdụ weere ya na ọ bụ otú dị mma e si si n’iwu ndị nke mbụ ahụ gafee n’iwu ndị nke abụọ.

Gụọ Ọpụpụ isi 20 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.