Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ihe Mere Ịgụ Ihe Ji Dịrị Ụmụaka Mkpa​—Nke 1: Ịgụ Akwụkwọ Ka Ọ̀ Bụ Ile Vidio?

Ihe Mere Ịgụ Ihe Ji Dịrị Ụmụaka Mkpa​—Nke 1: Ịgụ Akwụkwọ Ka Ọ̀ Bụ Ile Vidio?

 N’oge ụmụ gị ji ezu ike, olee ihe na-akara ha mma ime, ọ̀ bụ ile vidio ka ọ̀ bụ ịgụ akwụkwọ? Olee nke ha nwere ike ibu ụzọ were, ọ̀ bụ ekwentị ka ọ̀ bụ akwụkwọ?

 Kemgbe ọtụtụ afọ, e nwere ihe ndị na-eme ka o siere ndị mmadụ ike ịgụ akwụkwọ. O nwere ike ịbụ tiivi ma ọ bụ iji ekwentị ele vidio ma ọ bụ eme ihe ndị ọzọ. N’afọ 1990, otu nwaanyị aha ya bụ Jane Healy dere n’akwụkwọ ya bụ́ Endangered Minds, sị: “Ka oge na-aga, ịgụ akwụkwọ nwere ike bụrụ ihe mgbe ochie.”

 N’oge ahụ, ihe ahụ o kwuru yiri ihe na-agaghị ekwe omume. Ma ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gara, ụfọdụ ndị nkụzi bi n’obodo mepere emepe kwuru na ọtụtụ ndị na-eto eto amaghịzi agụ ihe ka ndị oge ochie.

Ihe dị n’isiokwu a

 Gịnị mere ụmụaka ji kwesị ịna-agụ ihe?

  •   Ịgụ ihe na-eme ka mmadụ jiri uche ya na-ahụ ihe ọ na-agụ. Dị ka ihe atụ, ị na-agụ akụkọ, olee otú olu ndị a kọrọ akụkọ ha na-ada? Olee otú ha dị n’anya? Olee otú ebe ihe ahụ a kọrọ nọ mee dị? Onye dere akụkọ ahụ na-ekwu ihe ụfọdụ. Mana, ọ bụzi onye na-agụ akụkọ ahụ ga-eji uche ya gbakọta ihe ndị nke fọrọ afọ.

     Otu nne aha ya bụ Laura sịrị: “Anyị lewe vidio, ihe anyị na-ahụ bụ ihe onye ọzọ chere n’echiche. Ọ bụ eziokwu na ọ na-atọ ụtọ, ma e nwere ihe pụrụ iche gbasara ịgụ ihe. Ọ na-eme ka i jiri uche gị na-ahụ ihe onye ọzọ dere.”

  •   Ịgụ ihe na-eme ka ụmụaka mụta ezigbo àgwà. Ụmụaka na-agụ ihe, ha na-amụta ichebara nsogbu echiche na ịma ihe ha ga-eme gbasara ya. Uche ụmụaka kwesịkwara ịdị n’ihe ha na-agụ ma ha gụwa ihe. Ọ na-enyere ha aka ịmụta àgwà ndị dị ka ndidi, ijide onwe ha, na inwere ndị ọzọ ọmịiko.

     Ọ̀ bụ eziokwu na ịgụ ihe ga-emeli ka ụmụaka mụta inwe ọmịiko? Ee. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwetara na ụmụaka iji nwayọọ na-agụ akwụkwọ ma na-echebara ihe ha na-agụ echiche na-enyere ha aka ịna-eche gbasara onye ha na-agụ akụkọ ya. Ime otú ahụ nwere ike inyere ụmụaka aka ịmụta inwere ndị mmadụ ọmịiko.

  •   Ịgụ ihe na-eme ka mmadụ na-echebara ihe echiche. Ndị na-akpachapụ anya agụ ihe na-eji nwayọọ agụ ihe. Ha na-agụghachidị ebe ụfọdụ iji jide n’aka na ha ghọtara ihe onye dere akụkọ ahụ na-ekwu. Ha na-eme otú ahụ, o nwere ike inyere ha aka ịna-echeta ihe ha gụrụ, ya abaakwara ha uru.​—1 Timoti 4:15.

     Otu nna aha ya bụ Joseph sịrị: “Ị na-agụ ihe, ọ na-adị mfe iche gbasara ihe ihe ị na-agụ pụtara, iji ya tụnyere ihe ị mabu, nakwa ichebara ihe ị ga-amụta na ya echiche. Ile vidio anaghị enyere mmadụ aka ichebara ihe echiche.”

 Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụ eziokwu na vidio na ihe ndị ọzọ a na-ele ele nwere ike ịba uru, ọ bụrụ na nwa gị anaghị ewepụta oge na-agụ akwụkwọ, o nwere ike ime ka ihe dị mkpa kwaa ya.

 Ihe ga-eme ka ịgụ ihe na-agụ ha agụụ

  •   Malite n’oge. Otu nwaanyị mụrụ ụmụ abụọ sịrị: “Anyị na-amalite ịgụrụ ụmụ anyị ihe mgbe ha ka nọ n’afọ. Anyị na-agụkwara ha ya mgbe a mụchara ha. Obi dị anyị ụtọ na anyị akwụsịghị ịgụrụ ha ihe. Ka oge na-aga, ịgụ ihe maara ha ahụ́, na-atọkwa ha ụtọ.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “I si n’oge ị bụ nwata mara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.”​—2 Timoti 3:15.

  •   Mee ka ụlọ unu bụrụ ebe ịgụ ihe ga na-atọ ụmụaka ụtọ. Mee ka ịgụ ihe dịrị ụmụ gị mfe. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịhụ na e nwere akwụkwọ ụmụ gị nwere ike ịgụ. Otu nwaanyị aha ya bụ Tamara mụrụ ụmụ anọ sịrị: “Chọta akwụkwọ ndị nwa gị nwere ike ịgụ ma dowe ha n’akụkụ àkwà ya.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso. Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.”​—Ilu 22:6.

  •   Ekwela ka ha na-aba n’Ịntanet mgbe niile. Otu nna aha ya bụ Daniel kwuru na ọ ga-adị mma ka e wepụta otu mgbede a na-enweghị onye ga-apị ekwentị ya ma ọ bụ kọmputa ya. Ọ sịrị: “Anyị na-ewepụta ọ bụrụgodị otu mgbede n’izu a na-agaghị agbanye tiivi n’ụlọ. Anyị na-eji oge ahụ gụkọọ ihe ọnụ ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla agụọ nke ya.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—Ndị Filipaị 1:10.

  •   Gosi ụmụ gị otú e si agụ ihe. Otu nwaanyị mụrụ ụmụ abụọ aha ya bụ Karina sịrị: “Ị gụwara ụmụ gị ihe, na-agụ ya ka ọ dị ha ka hà nọ mgbe ihe ahụ na-eme, na-agụkwa ya otú gosiri na ihe ị na-agụ na-atọ gị ụtọ. Ọ bụrụ na ịgụ ihe ana-atọ gị ụtọ, o nwere ike ime ka ọ tọwakwa ụmụ gị ụtọ.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-agbasi mbọ ike n’ịgụpụta ihe n’ihu ọha.”​—1 Timoti 4:13.

 Ọ bụghị ụmụaka niile ka ịgụ ihe ga-amasị. Ma, ọ bụrụ na ị na-agba ha ume ịgụ ihe, o nwere ike ime ka ọ masịwa ha. Otu nwoke aha ya bụ David mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. O nwere ihe ọzọ o mere. Ọ sịrị: “M na-agụ akwụkwọ ụmụ m na-agụ. Ọ na-eme ka m mata ihe na-amasị ha, ya emee ka e nwee ihe mụ na ha na-ekwurịta. Anyị na-agụkọ akwụkwọ ọnụ. Ihe a na-atọgbu onwe ya.”