Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Nna

Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Nna

 Gịnị bụ ọrụ nna?

  •   Mgbe nwunye gị dị ime. Otú i si emeso nwunye gị n’oge a ga-egosi ụdị nna ị ga-abụ n’ọdịnihu. Akwụkwọ bụ́ Do Fathers Matter? kwuru, sị:

     “Ọ bụrụ na nwoke ana-enyere nwunye ya dị ime aka na-azụta ihe, na-edu ya aga ụlọ ọgwụ, nọrọkwa ya mgbe a na-ele nwunye ya ahụ́ ka a mata otú nwa o bu n’afọ si eku ume, ya na nwunye ya na nwa ahụ ga na-emekọ ihe nke ọma ma a mụọ ya.”

     “Mgbe nwunye m dị ime, m nyeere ya aka otú m nwere ike maka na achọghị m ka ọ dị ya ka ime ahụ ọ dị agbasaghị m. Ọ bụ mụ na ya gbakọrọ aka dozie ebe nwa anyị ga-anọ ma a mụọ ya. Oge ahụ mụ na nwunye m ji na-ahazi ihe maka nwa ọhụrụ anyị pụrụ nnọọ iche.”​—James.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”​—Ndị Filipaị 2:4.

  •   Mgbe nwunye gị mụrụ nwa. Gị na nwa gị ga-adị n’ezigbo mma ma ị na-egwusa ya egwu, na-ekukwa ya. N’ihi ya, soro na-elekọta nwa gị. Otú i si enye aka na-elekọta nwa gị ga-eso ekpebi otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ma o tolitewe. Mbọ ị na-agba ka gị na nwa gị dị ná mma na-egosi na ị hụrụ ya n’anya.

     “Soro nwa gị na-egwu egwu. Na-eme ihe ọ ga-eji chịa ọchị. Tụsara ahụ́, ekwela ka obere ihe ọ bụla wee gị iwe. Cheta na ọ bụ n’aka gị bụ ebe mbụ nwa gị ga-esi mata ihe bụ ịhụnanya.”​—Richard

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ụmụ bụ onyinye si n’aka Jehova. Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ Chineke na-akwụ.”​—Abụ Ọma 127:3.

  •   Mgbe nwa gị na-etolite. Nchọpụta e mere gosiri na ụmụaka ndị ha na nna ha dị ná mma na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ha anaghị echegbukarị onwe ha, ha anaghịkwa esokarị ná ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ndị na-eme isi ike. Wepụta oge iji mee ka gị na nwa gị dịrị n’ezigbo mma.

     “Nwa m nwoke gwara m na o mechaa kwapụ n’ụlọ anyị, ihe ga-akacha ewute ya bụ na mụ na ya agaghịzi na-akpa nkata otú anyị na-eme ma anyị nọrọ n’ụgbọala na-aga ihe ma ọ bụ anyị riwe nri abalị. Mgbe anyị kparịtara gbasara ụfọdụ ihe ndị dị ezigbo mkpa bụdị mgbe m na-atụghị anya ya. Ihe mere anyị ji nwee ike ịkparịta ihe ndị ahụ bụ maka na mụ na ya na-anọrị ọtụtụ mgbe.”​—Dennis

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—Ndị Efesọs 5:15, 16.

 Olee otú ọrụ nna si pụọ iche?

 Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ ndị nna kwesịrị ịna-akpa afọ ezinụlọ ha ma na-echebe ha, ndị nne ana-arụ ọrụ ụlọ ma na-elekọta ndị ezinụlọ ha. (Diuterọnọmi 1:31; Aịzaya 49:15) N’ezinụlọ ụfọdụ, ndị nna nwere ike ịna-eme ihe ụfọdụ ndị nne kwesịrị ịna-eme, ndị nne ana-emekwa ihe ụfọdụ ndị nna kwesịrị ịna-eme. N’agbanyeghị otú ihe dị, ndị na-eme nchọnchọ kwuru na nna na nne nwere ọrụ pụrụ iche onye nke ọ bụla ga na-arụ n’ịzụ ụmụ. a

 Otu nwaanyị aha ya bụ Judith Wallerstein, onye na-eme nchọnchọ n’okwu gbasara ezinụlọ, kọrọ ihe mere ya nke mere ka ihe a na-ekwu dokwuo anya. O dere, sị: “Mgbe ụgbọala kụturu nwa m nwaanyị dị afọ iri na abụọ, ọ gwara papa ya ka o soro ya nọrọ n’ụgbọala e ji ebu ndị merụrụ ahụ́ n’ihi na obi siri ya ike na papa ya ga-echebe ya. Ma mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, ọ gwara m ka mụnwa nọnyere ya ka m wee lekọta ya. b

 “Nna na-echebe ndị ezinụlọ ya ma na-eme ka ihe na-aga aga, o nwekwara ike isiri nne ike ime ihe ndị a. Ma, ọ bụ nne na-eme ka ụmụ ha ghọta na ha hụrụ ha n’anya, ọ na-agbakwa mbọ ịghọta otú obi dị ha. N’ihi ya, nne na nna na-arụkọ ọrụ.”​—Daniel

 Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Nwa m, nabata aka ná ntị nna gị na-adọ gị, ahapụkwala ntụziaka nne gị nyere gị.”​—Ilu 1:8.

 Ndị nna na ụmụ ha ndị nwaanyị

 Ọ bụ gị bụ́ nna ga-akụziri nwa gị nwaanyị otú ụmụ nwoke kwesịrị isi na-emeso ya. Ọ ga-esi n’ụzọ abụọ ndị a mụta ya:

  •   Otú i si emeso mama ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị gosiri na ị hụrụ nwunye gị n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù, nwa gị nwaanyị ga-amata ụdị àgwà onye ọ ga-achọ ịlụ kwesịrị inwe.​—1 Pita 3:7.

  •   Otú i si emeso ya. Ọ bụrụ na ị na-akwanyere nwa gị nwaanyị ùgwù, ọ ga-amụta ịkwanyere onwe ya ùgwù. Ọ ga-amụtakwa na ọ bụ otú ahụ ka ụmụ nwoke ndị ọzọ kwesịrị isi na-emeso ya.

     Ma, ọ bụrụ na nna ana-akatọ nwa ya nwaanyị oge niile, ihere onwe ya ga na-eme ya. O nwekwara ike ime ka nwa ahụ chọwa ụmụ nwoke ndị ga-anabata ya, ụmụ nwoke ndị ahụ nwekwara ike ibu ihe ọjọọ n’obi.

     “Ọ bụrụ na nna hụrụ nwa ya nwaanyị n’anya ma na-akwado ya, ọ ga-esi ike nwa ya nwaanyị ekweta ịlụ nwoke na-enweghị àgwà ọma.”​—Wayne

a E nweela ọtụtụ ndị nne naanị ha zụrụ ụmụ ha, ụmụ ha ana-emekwa nke ọma.

b Akụkọ a si n’akwụkwọ bụ́ The Unexpected Legacy of Divorce.