Gaa n'Isiokwu

È KERE YA EKE?

Otú Ahụhụ A Na-akpọ Carpenter Ant Si Eme Ka Mpi Ya Dị Ọcha

Otú Ahụhụ A Na-akpọ Carpenter Ant Si Eme Ka Mpi Ya Dị Ọcha

 Ịdị ọcha na-enyere ahụhụ aka ife efe, ịrị elu, ma ọ bụ ịchọpụta otú gburugburu ya dị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mpi ahụhụ adịghị ọcha, ọ na-esiri ya ike ịna-agagharị, izigara ahụhụ ibe ya ozi, nakwa ịmata ísì ihe. Otu ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ anụmanụ aha ya bụ Alexander Hackmann kwuru, sị: “Ị gaghị ahụ ahụhụ na-adịghị ọcha. Ha niile ma otú ha si edowe onwe ha ọcha.”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Hackmann na ndị ọkà mmụta ibe ya mụrụ gbasara otú otu ụdị Carpenter Ant si edewe mpi ya ọcha. Ha chọpụtara na otú ụdị ahụhụ a si ewepụsị ụmụ irighiri ihe ndị mesara na mpi ya bụ iwere ụkwụ ya koro mpi ya, hichaa ya. Ajị ndị siri ike dị n’ụkwụ ya ka ọ na-eji ewepụ unyi ndị buru ibu. Ọ na-eji ajị ndị dị ka mbọ́ na-esighị ike na-ewepụ unyi ndị na-ebughị ibu. Ohere ndị dị n’agbata ajị nke ọ bụla hà ka ajị ndị dị na mpi ahụhụ a. Ọ na-ejizi ajị ndị kacha dị pekepeke ewepụ unyi ndị kacha pee mpe.

 Lee vidio ebe Carpenter Ant na-ewepụsị unyi ndị dị na mpi ya

 Hackmann na ndị ọkà mmụta ibe ya na-atụ anya na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe ga-elere otú ụmụ ahụhụ si eme ka mpi ha dị ọcha mepụta ihe. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ilere otú ahụhụ a si eme rụọ ihe nwere ike ịna-edebe ebe a na-emepụta obere ngwá elektroniks ọcha ka unyi ọ bụla ghara imesa ya, ma mebie ya.

 Gịnị ka i chere: Otú a ahụhụ a na-akpọ Carpenter Ant si eme ka mpi ya dị ọcha, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka, è kere ya eke?