Gaa n'Isiokwu

È KERE YA EKE?

Otú Urukurubụba A Na-akpọ Cabbage White Si Edowe Nku Ya Ka V Ma Ọ Nyawa Anwụ

Otú Urukurubụba A Na-akpọ Cabbage White Si Edowe Nku Ya Ka V Ma Ọ Nyawa Anwụ

 Okpomọkụ si n’anyanwụ na-eme ka uru ahụ́ na-enyere urukurubụba aka ife efe kporo ọkụ, tupu ya enwee ike ife efe. Ma n’ụbọchị ndị anwụ na-adịghị acha, urukurubụba ndị Bekee na-akpọ cabbage white na-ebu urukurubụba ndị ọzọ ụzọ efeli. Gịnị na-enyere ya aka ime ya?

 Ihe ị ga-echebara echiche: Tupu urukurubụba dị iche iche efelie, ha na-agbasa nku ha ma ọ bụ mechie ya ma ha na-anya anwụ. Ma nke a a na-akpọ cabbage white na-eme ka nku ya yie ebe e dere V ma ọ nyawa anwụ. Nchọpụta e mere gosiri na ọ bụrụ na ahụ́ ga-ekporo urukurubụba ezigbo ọkụ, ọ ga-emepetụ nku ya ka ebe e dere v. Ha dowe nku ha otú ahụ, ọ ga-eme ka anwụ na-achaba ha n’uru ahụ́ ha nke ọma otú ga-eme ka ha nwee ike ifeli.

 Ndị na-eme nchọpụta na mahadum Exeter dị n’Ịngland gbaliri ime ka ihe ndị sayensị rụpụtara na-esi n’anyanwụ enweta ikike eletrik kakwuo mma. Ha mere ya ka ọ dị otú ahụ urukurubụba a si edowe nku ya ma ọ nyawa anwụ. Nke a mere ka ikike eletrik ihe ndị ahụ na-emepụta jiri okpukpu iri ise ka mma.

 Ndị ahụ na-eme nchọpụta chọpụtakwara na elu nku urukurubụba a na-egbuke egbuke ka enyo. Ha leere urukurubụba a anya mepụta ihe ndị na-esi n’anyanwụ enweta ikike eletrik na-arụ ọrụ nke ọma karịa, ndị na-adịchaghịkwa arọ. Ọ bụ nke a mere otu prọfesọ so ná ndị mere nchọpụta a aha ya bụ Richard ffrench-Constant ji kwuo na urukurụbụba a bụ “ọkaibe n’inweta okpomọkụ si n’anyanwụ.”

 Gịnị ka i chere? Urukurubụba a na-edowe nku ya ka v, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka, è kere ya eke?