Gaa n'Isiokwu

Iwu Na-achịkwa Ihe Ọ Bụla Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị

Iwu Na-achịkwa Ihe Ọ Bụla Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị

ỌKWA DỊ MKPA: Ọ BỤRỤ NA Ị NA-AGA N’EBE ANYỊ NA-EDEWE IHE N’ỊNTANET EME IHE Ọ BỤLA, GWAKWA ANYỊ IHE Ọ BỤLA GBASARA ONWE GỊ, Ọ PỤTARA NA I KWETARA NA ANYỊ NWERE IKE IJI IHE NIILE Ị GWARA ANYỊ GBASARA ONWE GỊ MEE IHE E KWURU EBE A NAKWA IHE E KWURU N’IWU NA-ACHỊKWA IHE A GA-EJI IHE MMADỤ KWURU GBASARA ONWE YA EME.

Iwu Na-achịkwa Ihe Ọ Bụla Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị

  • Anyị Agaghị Eme Ka Ndị Ọzọ Mara Ihe Ị Na-achọghị Ka Ha Mara Gbasara Gị

  • Ihe I kwesịrị Ịma Gbasara Ihe Ndị Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị

  • Ihe Ndị E Mere Iji Hụ na Ndị Ọzọ Agaghị Ama Ihe Ndị Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị

  • Ndị Ka Bụ́ Obere Nwa

  • Ebe Ndị Ọzọ Na-edebe Ihe n’Ịntanet Na-enyere Anyị Aka Ime Ihe Ụfọdụ

  • Ime Ka Ị Mara ma A Gbanwee Ihe E Kwuru Ebe A

  • Gbasara Ihe Ndị Bekee Na-akpọ Active Scripting ma Ọ Bụ JavaScript

Gụọkwa Isiokwu Ndị A

ANYỊ AGAGHỊ EME KA NDỊ ỌZỌ MARA IHE Ị NA-ACHỌGHỊ KA HA MARA GBASARA GỊ

Anyị anaghị etinye anya n’ihe gbasara gị ị na-achọghị ka ndị ọzọ mara ma ọ bụkwanụ gwa ndị ọzọ ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị. Ihe a ị na-agụ kwuru otú anyị ga-esi eji ihe ndị anyị ma gbasara gị ma ọ bụ ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị na-eme ihe n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. O nwere ihe ụfọdụ gbasara gị anyị na-amata ma ị baa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Anyị makwa na anyị kwesịrị ịgwa gị ihe ndị anyị ga-eji ha eme nakwa na anyị agaghị eme ka ndị ọzọ mara ihe ndị ahụ. I nwere ike iji aka gị gwa anyị ihe ụfọdụ gbasara onwe gị. ‘Ihe gbasara onwe gị’ a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ihe ndị dị ka aha gị, adres iimel gị, ebe i bi, nọmba ekwentị gị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike iji mata gị. Ọ bụghị iwu na ị ga-agwa anyị ihe gbasara onwe gị tupu gị agaa n’ebe e mere maka ọhaneze n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet. Ihe ụfọdụ so n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet anyị na-ekwu okwu ya ebe a bụ ebe a ị nọ ugbu a nakwa ebe ndị ọzọ yiri ya, dị ka apps.ps8318.com, tv.ps8318.com, stream.ps8318.com, and wol.ps8318.com.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA GBASARA IHE NDỊ Ị GWARA ANYỊ GBASARA ONWE GỊ

Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., nke anyị ga na-akpọ (“Watchtower”), bụ́ nke dị na Niu Yọk, nwe ebe a anyị na-edewe ihe n’Ịntanet. Ụlọ ọrụ a abụghịkwa maka ịkpa ego. Kama, ọ na-akwado ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ nakwa Baịbụl ha na-akụzi. Ọ bụrụ na i kpebie imepe akaụnt n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, isi na ya nye onyinye, isi na ya rịọ ka Onyeàmà Jehova na-abịa akụziri gị Baịbụl n’efu, ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ị ga-eji maka ya gwa anyị gbasara onwe gị, ọ pụtara na i kwetara ihe niile e kwuru ebe a, kwetakwa ka e dee ihe gbasara gị na kọmputa anyị ndị dị n’Amerịka. Ọ pụtakwara na i kwetara, na ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ka Watchtower na ụlọ ọrụ ndị ọzọ na-enyere Ndịàmà Jehova aka ná mba dị iche iche were ihe ndị ha maara gbasara gị, hazie ha, zipụ ha, nakwa cheekwa ha iji meere gị ihe ị chọrọ ka e meere gị. Watchtower na-eji ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị iche iche e nwere n’ụwa niile arụ ọrụ. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị iche iche dị n’obodo gị, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị iche iche, nakwa ụlọ ọrụ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova nwe so na ha.

Ọ bụ ihe i mere n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ka anyị ga-eji amata ihe ụfọdụ gbasara gị. Dị ka ihe atụ, ị gaa na ya nye otu n’ime ụlọ ọrụ anyị dị n’otu mba onyinye, a ga-eme ka ụlọ ọrụ anyị ahụ mara aha gị na ebe i bi, dịkwa ka a gwara gị na a ga-eme mgbe ị na-enye onyinye ahụ. Ihe atụ ọzọ bụ na ọ bụrụ na ị gara n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet rịọ ka Onyeàmà Jehova na-abịa akụziri gị Baịbụl, a ga-agwa alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova e nwere ná mba i bi na ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe i bi aha gị na adres gị ka ha nwee ike meere gị ihe ị chọrọ.

Iji nyere gị aka, ọ bụrụ na mba i bi na ya nwere iwu gbasara ichebe ihe mmadụ kwuru banyere onwe ya, i nwere ike ịhụ ha n’ebe e depụtara Ndị Ị Ga-akpọtụrụ Maka Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị.

IHE NDỊ E MERE IJI HỤ NA NDỊ A NA-ACHỌGHỊ AMAGHỊ IHE NDỊ Ị GWARA ANYỊ GBASARA ONWE GỊ

Anyị na-akpachara ezigbo anya iji hụ na ndị a na-achọghị amaghị ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị. Anyị na-eji ngwá ọrụ ndị kacha mma e nwere, ndị ọ na-agaghịkwa adịrị ndị a na-achọghị mfe ịbanye na ha, edekọ ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị, jirikwa ha hụ na eji ha mee ihe otú kwesịrịnụ, na a gwaghị ha ndị na-ekwesịghị ịma ha, na a gbanweghị ihe na ya n’anataghị ikike, na ebibighị ha mgbe ọ na-abụghị ihe iwu kwuru ka e mee, ma ọ bụkwanụ na ọ fughị n’amaghị ama. Iwu ji ndị niile nwere ike ịmata ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị nakwa ndị mepụtara ebe ndị ọzọ na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ ndị na-enyere anyị aka ime ihe ụfọdụ, ịghara ime ka ndị a na-achọghị mata ihe gbasara gị. Anyị na-edoweru ihe ndị anyị ma gbasara gị ruo afọ ole ha ga-abara anyị uru ma ọ bụ ruo afọ ole iwu kwuru ka e doweruo ha.

Iji hụ na ndị ọzọ agụghị ihe anyị ma gbasara gị mgbe ana-eziga ya ebe ọzọ, a na-eji kọmputa eziga ha otú ọ na-agaghị ekwe ndị ọzọ na-abụghị ndị a na-ezigara ya ọgụgụ. Anyị na-etinye ihe ndị i mere ka anyị mara gbasara gị na kọmputa ndị ọ na-abụghị onye ọ bụla ga-abanyeli, nke dịkwa n’ebe ndị e ji ihe dị iche iche gbachie, ka ihe ghara ime ha nakwa ka ndị ọzọ ghara ịmata ha. Anyị na-eme ihe buru ibu iji hụ na ndị a na-achọghị abataghị n’ebe ndị e dowere ihe ndị a.

NDỊ KA BỤ́ OBERE NWA

Ọ bụrụ na ị ka bụ obere, dị ka iwu obodo ị nọ na ya kwuru, ma banye n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, i nwere ike ịgwa anyị gbasara onwe gị n’ebe ahụ naanị ma onye ma ọ bụ ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye gị na ya bi kwe ka i mee otú ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne, nna, ma ọ bụ onye ya na mmadụ bi, gị akwado ka nwa gị ma ọ bụ onye gị na ya bi ka bụ́ obere nwa n’iwu obodo unu bi, gwa anyị gbasara onwe ya n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ọ pụtara na ị na-ekwetara obere nwa ahụ n’ihe ndị e kwuru ebe a.

EBE NDỊ ỌZỌ NA-EDEBE IHE N’ỊNTANET NA-ENYERE ANYỊ AKA IME IHE ỤFỌDỤ

Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịnọ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet hụ ihe ga-ebuga gị n’adres Ịntanet ndị ọzọ, bụ́ nke na-enyere anyị aka ime ihe ụfọdụ (dị ka idejupụta fọm n’Ịntanet). Ị ga-amata na ị banyela n’adres Ịntanet ndị ọzọ n’ihi na ụcha ya ga-adị iche, aha ga-adịkwa n’ebe ahụ mmadụ na-edenye adres Ịntanet ọ chọrọ ịga na ya ga-adịkwa iche. N’oge anyị na-amalite iji adres Ịntanet ndị ọzọ arụ ọrụ, anyị na-atụle iwu ndị ha na-agbaso iji gbochie ndị ọzọ ịmata ihe ndị mmadụ kwuru gbasara onwe ha ka anyị nwee ike ijide n’aka na ọ bụ iwu ndị ahụ anyị na-agbaso ka hanwa na-agbasokwa. Ọ na-abụkwa anyị gụrụ gụrụ, anyị atụleghachi ha. Ị chọọ ịma iwu ndị nwe adres Ịntanet ndị na-enyere anyị aka ime ihe ụfọdụ na-agbaso, biko, gaa n’ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet ha gụọ ya.

IME KA Ị MARA MA A GBANWEE IHE E KWURU EBE A

Ọ na-abụ anyị nọtụ, anyị emee ka ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet kakwuo mma, tinyekwa ihe ọhụrụ na ya. N’ihi ihe ndị a anyị na-agbanwe mgbe ụfọdụ, nakwa mgbanwe ndị a na-enwe n’iwu obodo nakwa na nkà na ụzụ, iwu ndị na-achịkwa ihe anyị ga-eji ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị ga na-agbanwe. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka anyị gbanwee ihe ọ bụla n’ime ihe ndị anyị kwuru ebe a, anyị ga-ede ya ebe a ka i nwee ike ịma ihe gbasara gị anyị na-ewere na ihe anyị ga-eji ya eme.

GBASARA IHE NDỊ BEKEE NA-AKPỌ ACTIVE SCRIPTING MA Ọ BỤ JAVASCRIPT

Active Scripting na-eme ka ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-arụkwu ọrụ nke ọma. Ọ na-eme ka ọ dịrị ya iwepụtara mmadụ ihe ọ bụla ọ pịrị ngwa ngwa. Anyị anaghị eji ya achọ ịma ihe ị na-achọghị ka anyị mara gbasara gị, anyị anaghịkwa eji ha etinyere gị ngwá ọrụ kọmputa ị na-achọghị na kọmputa gị.

Ị ga-agbanyerịrị Active Scripting ma ọ bụ JavaScript dị n’ihe ị na-eji abanye n’Ịntanet ka ihe ụfọdụ dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nwee ike ịna-arụrụ gị ọrụ nke ọma. N’ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji abanye n’Ịntanet, ọ bụ onye nwe kọmputa ga-eji aka ya gbanye ya ma ọ bụkwanụ gbanyụọ ya. Ị chọọ ịma otú ị ga-esi gbanye nke gị, gaa n’ebe e dere ihe ndị ga-enyere gị aka n’ihe ahụ i ji abanye n’Ịntanet.