Gaa n'Isiokwu

Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka

Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka

Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka

Otú Baịbụl si dịrị kemgbe e dere ya ruo taa bụ ezigbote ọrụ ebube. E dechara ya kemgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị itoolu (1,900). E bu ụzọ dee ya n’ihe ndị na-emebi emebi, ya bụ, n’akwụkwọ e ji ahịhịa papaịrọs mee nakwa n’akpụkpọ anụ. Asụsụ ndị e jikwa dee ya n’oge ahụ bụ asụsụ ndị ọtụtụ ndị na-anaghịzi asụ taa. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị a na-anụ aha ha, ndị dị ka ndị ọchịchị na ndị isi okpukpe, mere ike ha niile ka ọ gharazie ịdị.

N’AGBANYEGHỊ nkata niile a kpara ka a laa akwụkwọ a pụrụ iche n’iyi, oleezi otú e si chebe ya ruo taa, ya abịa bụrụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha agụ? Ka anyị leba anya na abụọ n’ime ihe ndị nyere aka chebe ya.

E Depụtaghachiri Ọtụtụ Ya

Ọ bụ ndị Izrel ka Chineke nyefere Akwụkwọ Nsọ ndị mbụ e dere. Ha lekọtara ha nke ọma ka ihe ọ bụla ghara ime ha, depụtaghachikwa ha ka ha dị ọtụtụ. Dị ka ihe atụ, a gwara ndị eze Izrel ka ha ‘lere anya n’akwụkwọ Iwu, nke ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị ji, depụtara ya onwe ha.’​—Diuterọnọmi 17:18.

Ịgụ Akwụkwọ Nsọ na-atọ ọtụtụ ndị Izrel ụtọ maka na ha ma na ọ bụ Okwu Chineke. N’ihi ya, ndị odeakwụkwọ a zụrụ nke ọma na-akpachapụ anya mgbe ha na-edepụtaghachi ya. E nwere ihe Baịbụl kwuru gbasara otu nwoke na-atụ egwu Chineke aha ya bụ Ezra. Ọ sịrị na ọ bụ ‘odeakwụkwọ ma Iwu Mosis nke ọma, nke Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere.’ (Ezra 7:6) N’agbata afọ 500 na afọ 900, ndị a na-akpọ ndị Masoret depụtaghachiri Akwụkwọ Nsọ Hibru ma ọ bụ “Agba Ochie.” Ha na-agụ mkpụrụ akwụkwọ dị na ya ọnụ ka ha jide n’aka na e nweghị nke ha na-edeghị. Otú a ha si kpachapụ anya mgbe ha na-edepụta ya mere ka ha ghara idehie ihe, nyekwa aka mee ka Baịbụl n’onwe ya dịrị ruo taa n’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ gbara ka ha mee ka ọ ghara ịdị.

Dị ka ihe atụ, n’afọ 168 Tupu Oge Anyị, onye na-achị Siria aha ya bụ Antiokọs nke Anọ nwara ibibi Akwụkwọ Nsọ Hibru niile dị na Palestaịn. Otu akwụkwọ kọrọ gbasara ndị Juu kwuru, sị: “Ha dọkara akwụkwọ mpịakọta ọ bụla ha hụrụ e dere iwu Chineke, gbaakwa ya ọkụ.” Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia kwuru, sị: “Ndị agha e nyere ọrụ a eleghị anya n’azụ mgbe ha na-arụ ya . . . Ha gburu onye ọ bụla ha . . . hụrụ nwere Akwụkwọ Nsọ.” Ma, e nwere Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtaghachiri, ndị ha na-ebibighị. Ma ndị Juu bi na Palestaịn ma ndị nke bi n’obodo ndị ọzọ nwere ha.

Ozugbo e si n’ike mmụọ nsọ dechaa akwụkwọ ozi, amụma, na akụkọ dị iche iche dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ,” ndị mmadụ depụtaghachiri ha, ha ejukwa ebe niile. Dị ka ihe atụ, Jọn nọ n’Efesọs ma ọ bụkwanụ ebe dị Efesọs nso dee akwụkwọ Jọn. Ma, a hụrụ otu ibé ya n’Ijipt, bụ́ ebe dị ezigbo anya n’Efesọs. Ndị ọkachamara na-ekwu na ibé akwụkwọ Jọn ahụ a hụrụ n’Ijipt so n’akwụkwọ ndị e depụtaghachiri n’ihe na-erughị afọ iri ise mgbe Jọn dechara akwụkwọ ya. Ibé akwụkwọ ahụ a hụrụ n’Ijipt gosiri na Ndị Kraịst bi ebe dị iche iche nwetara akwụkwọ ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee, n’agbanyeghị na ọ dịbeghị anya e dechara ha n’oge ahụ.

Ihe ọzọ so mee ka Akwụkwọ Nsọ ka dịrị ọtụtụ afọ Kraịst bịachara n’ụwa bụ na ọtụtụ ndị nwere ya. Dị ka ihe atụ, e kwuru na eze ukwu Rom aha ya bụ Dayọklishan nọ na-ele ndị agha ya o dunyere ka ha nọ na-akụpịa ọnụ ụzọ otu chọọchị ma gbaa Akwụkwọ Nsọ ndị dị na ya ọkụ n’isi ụtụtụ abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Febụwarị afọ 303. Dayọklishan chere na a gaghịzi enwe Ndị Kraịst ma o bibichaa Akwụkwọ Nsọ ha. N’echi ya, o nyere iwu ka a nọrọ n’ihu ọha gbaa Akwụkwọ Nsọ ọ bụla a hụrụ n’ebe ọ bụla Rom na-achị ọkụ. Ma, e nwere ndị ha na-ahụghị gbaa ọkụ, ndị mmadụ jikwa ndị ahụ depụtaghachi ndị ọzọ. N’eziokwu, ọtụtụ nkebi n’ime Baịbụl Grik abụọ ọ ga-abụ na e depụtaghachiri n’oge na-adịghị anya mgbe Dayọklishan nwachara ibibi Baịbụl ka dị ruo taa. Otu dị na Rom, nke ọzọ adịrị n’Ọ́bá Akwụkwọ Briten dị na Lọndọn n’Ịngland.

Ọ bụ eziokwu na e nwebeghị Baịbụl ọ bụla a hụrụ bụ́ nke ndị dere Baịbụl ji aka ha dee, ma ọtụtụ puku Baịbụl ndị mmadụ depụtaghachiri ka dị ruo taa. Ụfọdụ n’ime ha bụ Baịbụl zuru ezu, ndị ọzọ abụrụ ndị nke na-ezughị ezu. Ụfọdụ n’ime ha emeekwala ochie. À gbanwere ihe dị na Baịbụl mgbe a na-edepụtaghachi ya? E nwere ihe otu ọkachamara aha ya bụ W. H. Green kwuru gbasara Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ sịrị: “E nwere ike ikwu hoo haa na e nweghị akwụkwọ mgbe ochie ọzọ e depụtaghachiri ihe dị na ya nke ọma otú a n’ewepụghị ya ihe ọ bụla.” Nwoke ọzọ aha ya bụ Sir Frederic Kenyon, onye bụ́ a gawa a kpọtụrụ n’akụkọ gbasara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nwere ihe o kwuru. Ọ sịrị: “E nwere akwụkwọ Baịbụl ndị e ji aka depụtaghachi n’oge ochie ka dị taa. I were mgbe e dere ha tụnyere mgbe ndị so dee Baịbụl dere ya, ị ga-achọpụta na oge gafere tupu e depụtaghachi ha ebughị ibu. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na ihe dị na Baịbụl anyị nwere taa adịghị iche n’ihe e dere na ya ná mmalite. E nwere ike ikwu na o doola ezigbo anya na ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị dị n’Agba Ọhụrụ bụ eziokwu, e nweghịkwa ihe kwesịrị ịdị na ha na-adịghị ya.” Sir Frederic Kenyon sịkwara: “Anyị elebachaala ihe niile anya, ma, obi siri anyị ike ikwu na ọ bụ ihe ndị mbụ dere Baịbụl dere dị na Baịbụl anyị nwere taa. . . . O nweghị akwụkwọ ọzọ e dere n’oge ochie dị n’ụwa nke e nwere ike ikwu ụdị ihe a gbasara ya.”

Ịsụgharị Baịbụl

Ihe nke abụọ kacha soro mee ka Baịbụl bụrụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha agụ bụ na ọ dị n’ọtụtụ asụsụ. Ọ bụkwa otú Chineke chọrọ ka ọ dị. Ọ chọrọ ka ndị mba niile na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche mara ya. Ọ chọkwara ka ha na-efe ya “n’ime mmụọ na n’eziokwu.”​—Jọn 4:​23, 24; Maịka 4:2.

Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ a sụgharịrị bụ nke a sụgharịrị n’asụsụ Grik. A na-akpọ ya Septuagint. A sụgharịrị ya maka ndị Juu na-asụ Grik ndị na-ebighị na Palestaịn. A sụgharịchara ya n’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu Jizọs abịa jee ozi n’ụwa. Narị afọ ole na ole e dechara Baịbụl, a sụgharịrị ma Akwụkwọ Nsọ Hibru ma Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ọtụtụ asụsụ. Ma, ka oge na-aga, ndị eze na ndị ụkọchukwu, ndị a tụrụ anya na ha ga-eme ike ha niile ka ndị mmadụ nweta Baịbụl, mere ike ha niile ka ha ghara inweta ya. Ndị ụkọchukwu a achọghị ka ndị òtù ha mata eziokwu dị n’Okwu Chineke, n’ihi ya, ha gbara mbọ ime ka a ghara ịsụgharị ya n’asụsụ dị iche iche.

Ma, ụfọdụ ndị katara obi sụgharịa Baịbụl n’asụsụ dị iche iche ndị mmadụ na-asụ n’agbanyeghị na ha ma na ọ bụ inupụrụ ndị ọchịchị na ndị ụkọchukwu isi nakwa na o nwere ike ịta isi ha. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1530, onye Ịngland aha ya bụ William Tyndale, onye gụrụ akwụkwọ na mahadum Oxford, sụgharịrị Pentatuk. Pentatuk bụ akwụkwọ ise mbụ dị na n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya bụ, malite na Jenesis ruo na Diuterọnọmi. N’agbanyeghị mkpagbu na-enweghị atụ, ọ bụ ya bụ onye mbụ si n’asụsụ Hibru sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Bekee. Ọ bụ ya bụkwa onye mbụ dere aha Chineke bụ́ Jehova na Baịbụl Bekee. Mgbe otu ọkà mmụta Baịbụl na Spen aha ya bụ Casiodoro de Reina nọ na-asụgharị otu n’ime Baịbụl ndị mbụ a sụgharịrị n’asụsụ Spanish, ndị na-arụrụ ndị chọọchị Katọlik ọrụ nwara ugboro ugboro igbu ya. Ọ gara ebe dị iche iche ka o nwee ike sụgharịchaa Baịbụl ahụ. Ebe ndị ahụ ọ gara bụ: Ịngland, Jamanị, Frans, Họland, na Swizaland. *

A ka na-asụgharị Baịbụl n’ike n’ike taa n’ọtụtụ asụsụ, a na-ebipụtakwa ọtụtụ nde n’ime ya. Otú e si chebe Baịbụl, ya adịrị ruo taa ma bụrụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha agụ na-egosi na ihe Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ahịhịa na-akpọnwụ, okooko ya na-adapụkwa, ma okwu Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.”​—1 Pita 1:​24, 25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 E bipụtara Baịbụl ahụ Reina sụgharịrị n’afọ 1569. Cipriano de Valera degharịkwara ya n’afọ 1602.

[Igbo/​Foto]

OLEE BAỊBỤL NKE M KWESỊRỊ ỊNA-AGỤ?

Ọtụtụ ndị nwere nsụgharị Baịbụl dị iche iche n’asụsụ ha. E nwere Baịbụl ụfọdụ e ji okwu ndị mgbe ochie na-esi ike nghọta sụgharịa, nwee ndị nke a chịkọtara ihe e dere na ha achịkọta. Ihe bụ́ mkpa ndị sụgharịrị ha abụghị ma hà sụgharịtakwara ihe dị na Baịbụl mbụ, kama ọ bụ ka ihe ha sụgharịrị dị mfe ọgụgụ. E nwekwara Baịbụl ndị otú e si sụgharịa ha bụ ide ihe okwu nke ọ bụla pụtara, ya bụ, a sụgharịghị ha otú a ga-aghọta ihe onye dere ihe ahụ bụ n’obi mgbe o dere ya.

Ọ bụ Ndịàmà Jehova wepụtara Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Kọmitii sụgharịrị nke Bekee ya si na Baịbụl e dere n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl sụgharịa ya, ha achọghịkwa ka a mata ndị ha bụ. E sizi na Baịbụl Bekee ahụ ha sụgharịrị na-asụgharị Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Ma, ndị na-asụgharị ha na-ejide n’aka na ihe dị na Baịbụl nke Bekee a dabara n’ihe e dere na Baịbụl dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya. Ndị na-asụgharị Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-agba mbọ ka ha sụgharịa ihe okwu nke ọ bụla bụ n’asụsụ ha ma ọ bụrụhaala na ime otú ahụ agaghị eme ka ihe ha sụgharịrị ghara ido anya. Mkpa ha bụ ka ndị na-agụ Baịbụl ha sụgharịrị na-aghọta ya nke ọma otú ahụ ndị gụrụ Baịbụl dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya ghọtara ya.

Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe gbasara asụsụ eleruola Baịbụl dị iche iche a sụgharịrị n’oge a anya ka ha chọpụta ndị ihe e dere na ha dị iche n’ihe dị na Baịbụl e ji asụsụ ndị mbụ dee nakwa ndị ihe ndị sụgharịrị ha kweere mere ka ha sụgharịa ihe na-adịghị mma. Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ so na Baịbụl ndị ha leruru anya. Otu n’ime ndị ọkachamara ahụ bụ Jason David BeDuhn. Ọ bụ osote prọfesọ n’ihe gbasara okpukpe. Ọ na-akụzi na mahadum Northern Arizona dị n’Amerịka. N’afọ 2003, o bipụtara akwụkwọ dị narị peeji abụọ (200) gbasara “Baịbụl itoolu ndị mmadụ kacha agụ n’asụsụ Bekee.” * N’akwụkwọ ahụ, o dere gbasara ọtụtụ amaokwu Baịbụl ndị ọkachamara na-ekwetaghị na otú e si sụgharịa ha dị mma maka na “ọ ga-abụ ihe ndị sụgharịrị ha kweere mere ka ha sụgharịa ha otú ha si sụgharịa ha.” Ihe o mere bụ, o kwuo otu amaokwu Baịbụl, ya ejiri ihe dị na Baịbụl e dere n’asụsụ Grik tụnyere otú e si sụgharịa ya n’asụsụ Bekee, na-ele ma ndị sụgharịrị ya hà gbanwere ihe e kwesịrị ide ebe ahụ ka ọ daba n’ihe ha kweere. Gịnị ka ọ chọpụtara?

BeDuhn sịrị na ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl nakwa ọhaneze chere na ihe mere Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji dị iche na Baịbụl ndị ọzọ bụ na ndị sụgharịrị ya sụgharịrị ya ka ọ daba n’ihe ha kweere. Ma, ọ sịziri: “Ihe mere ọtụtụ ihe ji dị iche na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ na a sụgharịrị ya ka ihe dị na ya bụrụ kpọmkwem ihe dị na Baịbụl e si sụgharịa ya, e deghịkwa ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere na ya.” Ọ bụ eziokwu na e nwere ebe ụfọdụ otú e si sụgharịa ha ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-adịghị BeDuhn mma, ọ sịrị na “ọ bụ ya bụ Baịbụl a kacha sụgharịta n’ime Baịbụl niile ha leruru anya.” Ọ sịrị na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ “pụrụ iche.”

Onye ọzọ kwuru ụdị ihe ahụ gbasara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ otu onye Izrel bụ́ ọkachamara n’asụsụ Hibru. Aha ya bụ Dr. Benjamin Kedar. N’afọ 1989, ọ sịrị: “Otú e si sụgharịa Baịbụl a gosiri na ndị sụgharịrị ya gbasiri mbọ ike ka ihe ha sụgharịrị bụrụ ihe dị na Baịbụl mbụ. . . . E nwetụbeghị ihe m hụrụ ná Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ gosiri na ndị sụgharịrị ya gbanwere ihe ọ bụla na ya ka ọ daba n’ihe ha kweere.”

Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ụdị Baịbụl na-amasị m ịgụ? Ihe m chọrọ ọ̀ bụ Baịbụl dị mfe ọgụgụ, nke a na-asụgharịchaghị nke ọma? Ka ọ̀ bụ Baịbụl ndị sụgharịrị ya mere ike ha niile ka ihe dị na ya bụrụ ihe dị na Baịbụl mbụ ahụ e si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee?’ (2 Pita 1:​20, 21) Ọ bụ ụdị Baịbụl na-amasị gị ga-enyere gị aka ịhọrọ nke ị ga na-agụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 E wezụga Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee, Baịbụl ndị nke ọzọ bụ The Amplified New Testament, The Living Bible, The New American Bible With Revised New Testament, New American Standard Bible, The Holy Bible​—New International Version, The New Revised Standard Version, The Bible in Today’s English Version, na King James Version.

[Foto]

“Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ” dị n’ọtụtụ asụsụ

[Foto]

Baịbụl ndị Masoret dere

[Foto]

Ibé akwụkwọ e dere ihe dị na Luk 12:​7, “. . . Unu atụla egwu. Unu bara uru karịa ọtụtụ nza”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Foto dị n’elu elu: National Library of Russia, St. Petersburg; nke abụọ na nke atọ: Bibelmuseum, Münster; n’ala ala: © The Trustees of the Chester Beatty Library, Dublin