Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe

E bipụtara akwụkwọ a iji nyere gị aka ka ị bụrụ aka ochie n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ihe anyị na-akụziri ndị ọzọ bụ ihe kacha mkpa a kụzitụụrụla ụmụ mmadụ.

IHE ỌMỤMỤ NKE 1

Okwu Mmeghe Na-adọrọ Mmasị

Okwu mmeghe na-adọrọ mmasị na-aba uru atọ.

IHE ỌMỤMỤ NKE 2

Ikwu Okwu Ka Ebe Mmadụ na Ibe Ya Na-akparịta Ụka

Ikwu okwu ka ebe mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka na-eme ka ahụ́ ruo ndị anyị na-agwa okwu ala, ha egeekwa anyị ntị.

IHE ỌMỤMỤ NKE 3

Ịjụ Ajụjụ

Jiri akọ jụọ ndị na-ege gị ntị ajụjụ ndị ga-eme ka ha nwee mmasị n’ihe ị na-ekwu, chebara ihe ị na-ekwu echiche, meekwa ka isi ihe ndị dị n’okwu gị doo anya.

IHE ỌMỤMỤ NKE 4

Webata Akwụkwọ Nsọ Otú Dị Mma

Gụọ ihe ọmụmụ a ka ị mụta otú ị ga-esi na-akwadebe obi ndị na-ege gị ntị tupu gị agụọrọ ha Baịbụl.

IHE ỌMỤMỤ NKE 5

Igụzi Ihe Agụzi

Ịgụzi ihe agụzi dị ezigbo mkpa ma a bịa n’ịkụziri ndị mmadụ ihe gbasara Jehova.

IHE ỌMỤMỤ NKE 6

Kọwaa Ihe Ị Gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Otú Ga-edo Anya

Mee ka ndị ị na-agwa okwu ghọta ihe jikọrọ amaokwu ị gụrụ na ihe ị na-agwa ha.

IHE ỌMỤMỤ NKE 7

Kụzie Ihe Bụ́ Eziokwu Otú Ga-eme Ka Ndị Ị Na-agwa Okwu Kweta Ya

Ikụzi ihe bụ́ eziokwu otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu kweta ya ga-enyere ndị ị na-agwa okwu aka ikweta n’ihe ị na-ekwu.

IHE ỌMỤMỤ NKE 8

Jiri Ihe Atụ Na-akụzi Ihe

Jiri ihe atụ ndị dị mfe ga-amasị ndị ị na-agwa okwu mee ka otú i si akụzi ihe kakwuo mma.

IHE ỌMỤMỤ NKE 9

Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Akụzi Ihe nke Ọma

Jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ka ndị mmadụ na-echeta ihe ndị ị kụziiri ha.

IHE ỌMỤMỤ NKE 10

Ịgbanwe Ụda Olu

Na-agbanwe ụda olu gị otú ga-eme ka ihe ị na-ekwu ruo ndị ị na-agwa okwu n’obi, ha emeekwa ihe.

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Ịnụ Ọkụ n’Obi

Iji ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu ga-egosi ndị ị na-agwa okwu otú obi dị gị n’ihe ị na-ekwu, meekwa ka uche ha dịrị n’ihe ị na-akụzi.

IHE ỌMỤMỤ NKE 12

Jiri Mmetụta Kwuo Okwu

Ọ bụrụ na i jiri mmetụta na-ekwu okwu, ọ ga-egosi ndị na-ege gị ntị na ị na-eche banyere ha.

IHE ỌMỤMỤ NKE 13

Mee Ka Uru Ihe Ị Na-ekwu Bara Doo Anya

Nyere ndị na-ege gị ntị aka ịghọta otú ihe ị na-ekwu si gbasa ndụ ha, gosikwa ha otú ha ga-esi jiri ihe ha mụtara nyere onwe ha aka.

IHE ỌMỤMỤ NKE 14

Mee Ka Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ n’Okwu Gị Doo Anya

Nyere ndị ị na-agwa okwu aka ka ha na-aghọta ihe niile ị na-ekwu. Meekwa ka ha ghọta otú nke ọ bụla n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’okwu gị si gbasa isiokwu gị na ihe i bu n’obi na-ekwu okwu ahụ.

IHE ỌMỤMỤ NKE 15

Gosi na I Kwetasiri ike n’Ihe Ị Na-ekwu

Kwuo okwu otú ga-egosi na i kwetasiri ike na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu nakwa na ọ dị ezigbo mkpa.

IHE ỌMỤMỤ NKE 16

Okwu Na-agba Ume Ma Na-aba Uru

Na-agba ndị mmadụ ume kama ịkatọ ha. Jiri okwu ndị na-agba ume dị n’Okwu Chineke na-akụzi ihe.

IHE ỌMỤMỤ NKE 17

Ikwu Ihe Ndị Ọzọ Ga-aghọtali

Gbaa mbọ ka ndị ọzọ na-aghọta ihe ị na-ekwu. Kọwaa ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ otú doro anya.

IHE ỌMỤMỤ NKE 18

Mee Ka Ndị Na-ege Ntị Mụta Ihe Na Ya

Kwuo okwu otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu chebara ihe ị na-ekwu echiche, ma hụkwa uru ọ baara ha.

IHE ỌMỤMỤ NKE 19

Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Gbaa ndị na-ege gị ntị ume ka ha hụ Chineke na Okwu ya bụ́ Baịbụl n’anya.

IHE ỌMỤMỤ NKE 20

Mee Ka Okwu Mmechi Gị Kpoo Ọkụ

Okwu mmechi gị kpoo ọkụ, ọ ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu kweta ihe ndị i kwuru ma mee ihe ndị ha mụtara.

Otú I Si Na-eme

Ka ị na-agba mbọ ime ka otú i si agụ ihe na otú i si akụzi ihe kakwuo mma, dee ma ị̀ na-emeta ya ma ọ bụ na ị naghị emeta ya.

Isiokwu A Nwekwara Ike Ịmasị Gị

VIDIO

Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe​—Vidio

Lee vidio ndị a ka ịmụta ihe ndị ga-eme ka ị bụrụ aka ochie n’ịgụ ihe na n’izi ihe n’ihu ọha.