Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 15

Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?

Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?

Finland

Ha na-akụzi ihe

Ha na-eleta anyị

Ha na-ezi ozi ọma

Anyị enweghị ndị ụkọchukwu. Kama, anyị nwere ndị a na-akpọ ndị okenye. N’oge ndịozi Jizọs, a na-ahọpụta ụmụ nwoke ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ka ha na-elekọta ma “na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.” Ọ bụkwa otú ahụ ka anyịnwa na-eme. (Ọrụ Ndịozi 20:28) Ndị okenye a na Chineke dị n’ezigbo mma. Ha ji obi ha dum na-azụ anyị, a naghị amanye ha amanye. Ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi elekọta atụrụ Chineke, ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ uru aghụghọ n’anya. (1 Pita 5:​1-3) Olee ọrụ ha na-arụrụ anyị?

Ha na-elekọta anyị. Ndị okenye na-eji Baịbụl agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ha na-enyekwara anyị aka ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Ha ma na ọrụ a Chineke nyere ha dị mkpa. N’ihi ya, ha anaghị eji aka ike emeso anyị ihe. Kama, ha na-agbalị ịhụ na obi dị anyị mma. (2 Ndị Kọrịnt 1:24) Onye na-azụ atụrụ na-eleru atụrụ nke ọ bụla o nwere anya nke ọma. Otú ahụkwa ka ndị okenye na-eme. Ha na-agbalị ịma onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ anyị.​—⁠Ilu 27:⁠23.

Ha na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke. N’izu ọ bụla, ndị okenye na-akụziri anyị Okwu Chineke ma anyị gaa ọmụmụ ihe. Ihe ndị ahụ ha na-akụziri anyị na-eme ka okwukwe anyị nwere na Chineke sikwuo ike. (Ọrụ Ndịozi 15:32) Ha anaghị eji ozi ọma egwu egwu. Ha soro anyị na-aga ozi ọma, ha na-akụziri anyị otú dị iche iche e si ezi ozi ọma.

Ha na-agba anyị ume. Ndị okenye na-enyere onye nke ọ bụla n’ime anyị aka ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ka ha nwee ike ime ya, ha nwere ike leta mmadụ n’ụlọ ya. Ha nwekwara ike nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze jiri Baịbụl gbaa onye ahụ ume ma kasie ya obi.​—⁠Jems 5:​14, 15.

Ọ bụghị naanị ọrụ ọgbakọ ka ndị okenye na-arụ. Ọtụtụ n’ime ha nwere ezinụlọ ha na-elekọta. Ha na-arụkwa ọrụ ha ji akpa afọ ezinụlọ ha. Ihe a niile na-eme ka ha ghara ịna-enwecha efe. N’eziokwu, ha na-arụsị ọrụ ike, anyị kwesịkwara ịna-akwanyere ha ezigbo ùgwù.​—⁠1 Ndị Tesalonaịka 5:​12, 13.

  • Olee ọrụ ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ?

  • Olee ihe ndị okenye na-eme iji gosi na ha hụrụ anyị n’anya?