Ọrụ Ndịozi 19:1-41

  • Mgbe Pọl nọ n’Efesọs; e megharịrị ụfọdụ ndị baptizim (1-7)

  • Pọl na-aga akụziri ndị mmadụ okwu Chineke (8-10)

  • Ndị mmụọ ọjọọ akwụsịghị Pọl izi ozi ọma (11-20)

  • E nwere ọgba aghara n’Efesọs (21-41)

19  Mgbe Apọlọs+ nọ na Kọrịnt, Pọl si n’ime ime obodo ndị dị n’Eshia gbadata Efesọs.+ Ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ebe ahụ.  O wee sị ha: “Mmụọ nsọ ọ̀ dakwasịrị unu mgbe unu ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?”+ Ha asị ya: “Anyị anụtụbeghị gbasara mmụọ nsọ.”  Ya asịzie ha: “Oleezi ụdị baptizim unu mere?” Ha asị: “Ọ bụ baptizim Jọn nọ na-agwa ndị mmadụ ka ha mee.”+  Pọl asị: “Jọn mere ndị Juu baptizim iji gosi na ha echegharịala.+ Ọ nọkwa na-agwa ha ka ha kwere na Jizọs, onye na-abịa n’azụ ya.”+  Mgbe ha nụrụ ihe a, ha mere baptizim n’aha Onyenwe anyị Jizọs.  Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka n’isi, mmụọ nsọ dakwasịrị ha,+ ha amalite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, na-ebukwa amụma.+  Ha niile dị ihe dị ka ụmụ nwoke iri na abụọ.  Pọl na-aga n’ụlọ nzukọ+ na-ekwu okwu n’atụghị egwu, na-agwa ndị mmadụ okwu banyere Alaeze Chineke otú ọ na-eru ha n’obi. O mere ihe a ọnwa atọ.+  Ma ụfọdụ kpọchiri obi ha jụ ikwere ihe ọ na-akụzi. Ha nọkwa n’ihu ìgwè mmadụ gbakọrọnụ na-ekwu okwu ọjọọ banyere Ụzọ Onyenwe anyị.+ Pọl si ebe ha nọ pụọ,+ kpọọkwa ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs, ha esoro ya pụọ. Ọ na-ekwukwa okwu kwa ụbọchị n’ụlọ ezumezu dị n’ụlọ akwụkwọ Tiranọs. 10  Ọ nọ na-ekwu okwu ebe ahụ ruo afọ abụọ, nke mere na ndị niile bi ná mpaghara Eshia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik. 11  Chineke sikwa n’aka Pọl na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,+ 12  nke na ọ bụrụ na e were ákwà ya ma ọ bụ eprọn ya metụ ndị ọrịa n’ahụ́,+ ha agbakee. E metụkwa ha onye ọ bụla ndị mmụọ ọjọọ ji, ha ahapụ ya.+ 13  Ma ụfọdụ ndị Juu ndị na-agagharị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ gbalịkwara iji aha Onyenwe anyị Jizọs chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-adị asị: “Eji m aha Jizọs onye Pọl na-ekwusa na-agwa gị ka ị pụta.”+ 14  E nwere otu onyeisi nchụàjà ndị Juu aha ya bụ Siva. Ụmụ ya nwoke asaa na-eme ihe a. 15  Ma, e nwere ụbọchị ha gbalịrị ịchụpụ mmụọ ọjọọ, ya asị ha: “Ama m Jizọs,+ marakwa Pọl.+ Ununwa, ùnu bụ ole ndị?” 16  Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji wee baa ha ọgụ, jide ha n’otu n’otu, merụchaa ha ahụ́, ha agbara ọtọ si n’ụlọ ahụ gbapụsịa. 17  Mmadụ niile wee nụ ihe a merenụ, ma ndị Juu ma ndị Grik bi n’Efesọs, egwu wee jide ha niile, aha Onyenwe anyị Jizọs ana-edekwa ude. 18  Ọtụtụ n’ime ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-abịa na-ekwupụta mmehie ha n’ihu ọha. 19  N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile.+ Ha wee gbakọọ ego ole akwụkwọ ndị ahụ bụ, ya apụta puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise (50,000). 20  Okwu Jehova* wee si otú a na-agbasa ma na-akpa ike.+ 21  Mgbe ihe ndị a mechara, Pọl kpebiri na ya gachaa Masedonia+ na Akeya, na ya ga-aga Jeruselem.+ Ọ sịrị: “M gachaa ebe ahụ, m ga-agakwa Rom.”+ 22  N’ihi ya, o zigara Timoti+ na Erastọs,+ bụ́ ndị na-enyere ya aka, Masedonia. Ma yanwa nọtụkwuru ná mpaghara Eshia. 23  N’oge ahụ, e nwere ezigbo ọgba aghara+ n’ihi Ụzọ Onyenwe anyị.+ 24  E nwere otu nwoke aha ya bụ Dimitriọs, onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe. Ọ na-eji ọlaọcha akpụ ụlọ arụsị Atemis. Ihe a ọ na-akpụ na-eme ka ya na ndị omenkà ibe ya na-enweta ezigbo ego.+ 25  Nwoke a kpọkọtara ndị ibe ya nakwa ndị omenkà ndị ọzọ wee sị ha: “Ụmụnne m, unu ma nke ọma na ọ bụ ọrụ a na-enye anyị ego. 26  Ma unu ahụla, nụkwa otú Pọl si gwa ìgwè mmadụ okwu, meekwa ka ha kweta ihe o kwuru na chi ndị e ji aka mee abụghị chi.+ Ọ bụghị naanị n’Efesọs+ ka o mere ihe a, kama, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ná mpaghara Eshia niile. 27  Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ ledawa ọrụ anyị anya, meekwa ka ha were ụlọ nsọ nnukwu chi* anyị bụ́ Atemis ka ihe efu. Ndị mmadụ na-efe Atemis ná mpaghara Eshia niile na n’ụwa niile. Ma n’ihi ihe a Pọl kwuru, a gaghịzi na-asọpụrụ ya.” 28  Mgbe ha nụrụ ihe a, iwe juru ha obi, ha amalite iti mkpu, sị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!” 29  Ihe a mere ka obodo ahụ niile na-agba aghara. Ha jikwa otu obi kworo gaa dọkpụrụ Gayọs na Arịstakọs+ banye n’ebe a na-eme ihe nkiri. Ha abụọ bụ ndị Masedonia na-eso Pọl ejegharị. 30  Ma Pọl chọrọ ịbanye ebe ndị ahụ nọ, ma, ụmụnna ekweghị ya. 31  Ụfọdụ n’ime ndị isi na-ahụ maka ememme na egwuregwu, ndị ha na ya dị ná mma, zigakwaara ya ozi, na-arịọ ya ka ọ ghara ịbanye ebe ahụ a na-eme ihe nkiri n’ihi na o nwere ike ịta isi ya. 32  N’eziokwu, ndị ahụ niile gbakọrọ nọ na-akpa aghara. Ụfọdụ nọ na-eti otu ihe ná mkpu, ndị ọzọ ana-eti ihe ọzọ, ọtụtụ n’ime ha amaghịkwa ihe mere ha ji gbakọta. 33  Ụfọdụ wee sị Alegzanda kwuo okwu, ebe ọ bụ na ndị Juu na-enu ya aka ka ọ pụta n’ihu ha. Alegzanda fekwara aka ma na-achọ ịzara ọnụ ya n’ihu ha. 34  Ma mgbe ndị ahụ gbakọtara ebe ahụ matara na ọ bụ onye Juu, ha niile tiwere mkpu ruo ihe dị ka awa abụọ, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!” 35  Mgbe onyeisi obodo mechara mee ka ìgwè mmadụ ahụ nọrọ jụụ, ọ sịrị ha: “Ndị Efesọs, ò nwere onye na-amaghị na ọ bụ anyị, bụ́ ndị Efesọs, na-elekọta ụlọ nsọ Atemis dị ike, na-elekọtakwa arụsị a si n’eluigwe daa? 36  Ebe ọ bụ na o nweghị onye ga-asị na ya amaghị ihe a, jirinụ ya nwayọọ, unu emekwala ihe ọkụ ọkụ. 37  Ndị a unu kpọtara ebe a ezughị ohi n’ụlọ nsọ, ha ekwulughịkwa chi anyị. 38  N’ihi ya, ọ bụrụ na Dimitriọs+ na ndị omenkà ibe ya nwere onye ha na ya nwere okwu, e nwere ụbọchị e ji ekpe ikpe, nweekwa ndị gọvanọ na-achị obodo. Ha wegara ha okwu ha ka ha leba ya anya. 39  Ma, ọ bụrụ na unu na-achọ ihe ka nke ahụ, unu ga-agazi ka e leba ya anya otú iwu kwuru. 40  Ihe a mere taa nwere ike ịkpatara anyị ezigbo nsogbu. E nwere ike iji maka ihe a sị na anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru, n’ihi na o nweghị ihe anyị ga-ekwu mere ìgwè mmadụ a ji na-akpa aghara.” 41  Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ sịrị ndị ahụ zukọtara lawa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ya bụ, chi nwaanyị.