Aịzaya 11:1-16

  • Ome Jesi ga-achị otú dị mma (1-10)

    • Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo (6)

    • Amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa (9)

  • Ndị fọdụrụ ga-alọghachi (11-16)

11  Úkwù osisi Jesi+ ga-epu ome.+ Ome+ nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amịkwa mkpụrụ.   Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya.*+ Ọ bụ ya mere ọ ga-eji mara ihe,+ na-aghọtakwa ihe nke ọma,Na-enye ezigbo ndụmọdụ, dịkwa ike,+Mara ọtụtụ ihe gbasara Jehova, na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.   Ịkwanyere Jehova ezigbo ùgwù ga na-atọ ya ụtọ.+ Ọ gaghị eji naanị ihe anya ya hụrụ ekpe ikpe. Ọ gaghịkwa eji naanị ihe ọ nụrụ adọ mmadụ aka ná ntị.+   Ọ ga na-ekpere ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Ọ ga-eji maka ndị dị umeala n’obi n’ụwa dọọ ndị mmadụ aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-apịa ụwa ụtarị si n’ọnụ ya,+Jirikwa ume si n’egbugbere ọnụ ya gbuo ndị ajọ omume.+   Ezi omume ga-adị ka ájị̀ ọ na-eke n’úkwù. Irubere Chineke isi ga-adịkwa ka ájị̀ ọ na-eke n’ume.+   Anụ ọhịa wolf* na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo.+ Agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ọdụm na anụ gbara agba ga-anọkọkwa.*+ Nwatakịrị ga na-edukwa ha.   Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ ahịhịa. Ụmụ ha ga-amakpukọkwa. Ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi.+   Nwa na-aṅụ ara ga-egwuri egwu n’ọnụ agwọ ubí nọ,Nwatakịrị a kwụsịrị ara ga-atụkwasịkwa aka ya n’ọnụ agwọ ọjọọ nọ.   Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+Ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu m niile dị nsọ,+N’ihi na amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwaOtú mmiri si ejupụta oké osimiri.+ 10  N’oge ahụ, mgbọrọgwụ Jesi+ ga-eguzo ọtọ bụrụ ihe na-agbara ndị dị iche iche àmà.+ Mba dị iche iche ga-agakwuru ya ka o duzie ha.*+ Ebe ọ na-anọ ezu ike ga-adịkwa ebube. 11  N’oge ahụ, Jehova ga-eji aka ya kpọkọta ndị ya nke ugboro abụọ, ya bụ, ndị ya fọrọ n’Asiria,+ n’Ijipt,+ na Patrọs,+ na Kush,*+ n’Ịlam,+ na Shaịna,* na Hemat, nakwa n’agwaetiti oké osimiri.+ 12  Ọ ga-edowe ihe ga-agbara mba niile àmà, kpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa,+ sikwa n’ebe niile n’ụwa kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa.+ 13  Ifrem ga-akwụsị anyaụfụ ọ na-eme.+ A ga-ebibikwa ndị na-ewesa Juda iwe. Ifrem agaghị na-emere Juda anyaụfụ. Juda agaghịkwa na-ewesa Ifrem iwe.+ 14  Ha ga-eji ọsọ gaa ná mkpọda obodo* ndị Filistia n’ebe ọdịda anyanwụ. Ha ga-agbakọ aka bukọrọ ihe ndị Ọwụwa Anyanwụ. Ha ga-emeri ndị Ịdọm+ na ndị Moab.+ Ha ga na-achịkwa ndị Amọn.+ 15  Jehova ga-ekewa oké osimiri Ijipt.*+ Ọ ga-atụkwa Osimiri Yufretis aka.+ Ọ ga-ejikwa ume* ya na-ekpo ọkụ mee ka iyi asaa ndị na-asọnye n’osimiri ahụ taa. Ọ ga-emekwa ka ndị mmadụ yiri akpụkpọ ụkwụ ha gafee ya. 16  Ọ ga-emekwa ka e nwee ụzọ+ ndị ya fọrọ ga-esi si n’Asiria pụta,+Otú o mere ka ndị Izrel nwee ụzọ n’ụbọchị ha si n’Ijipt pụta.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ome a kpọrọ aha n’amaokwu nke mbụ.
O nwere ike ịbụ, “Nwa ehi na ọdụm ga-erikọ nri ọnụ.”
Wolf bụ anụ ọhịa na-eri anụ ndị ọzọ. O yiri nkịta ọhịa, ma ọ na-aka ya ibu.
Ma ọ bụ “Mba niile ga na-achọ ya.”
Ma ọ bụ “n’Etiopia.”
Ya bụ, Babịlonia.
Na Hibru, “Ha ga-efedata n’ubu.”
O nwere ike ịbụ, “ga-eme ka oké osimiri Ijipt taa.”
Ma ọ bụ “mmụọ.”