Abụ Ọma 34:1-22

  • Jehova na-anapụta ndị ohu ya

    • “Ka anyị niile too aha ya” (3)

    • Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị ya (7)

    • “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma” (8)

    • ‘E nweghị ọkpụkpụ ya a gbajiri agbaji’ (20)

Abụ Devid dere gbasara oge o mere ka onye isi na-adịghị mma+ n’ihu Abimelek, ya achụpụ Devid, Devid alawa. א [Alef] 34  M ga na-eto Jehova mgbe niile. Agaghị m akwụsị iji ọnụ m na-eto ya. ב [Bet]   M* ga-eji Jehova nyaa isi.+ Ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya ma ṅụrịa ọṅụ. ג [Gimel]   Soronụ m jaa Jehova mma.+ Ka anyị niile too aha ya. ד [Dalet]   Ajụrụ m Jehova ase, ya aza m.+ Ọ napụtara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.+ ה [Hee]   Ndị nwere olileanya n’ebe ọ nọ na-enwe obi ụtọ. A gaghị emechu ha ihu. ז [Zayin]   Onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya kpọkuru Jehova, ya anụ ya. Ọ zọpụtara ya n’ahụhụ niile ọ na-ata.+ ח [Het]   Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị na-atụ egwu ya,+Ọ na-anapụtakwa ha.+ ט [Tet]   Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.+ Onye gbabara n’ime ya na-enwe obi ụtọ. י [Yod]   Unu niile bụ́ ndị nsọ Jehova, tụọnụ egwu ya,N’ihi na e nweghị ihe na-akọ ndị na-atụ egwu ya.+ כ [Kaf] 10  Agụụ nwedịrị ike ịgụ ọdụm ndị siri ike,Ma ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.+ ל [Lamed] 11  Bịanụ, ụmụ m, geenụ m ntị. M ga-akụziri unu ihe bụ́ ịtụ egwu Jehova.+ מ [Mem] 12  Ònye n’ime unu ka ndụ na-atọ ụtọ,Nke chọkwara ịdị ogologo ndụ ma na-enwe obi ụtọ?+ נ [Nun] 13  Ya ejila ọnụ* ya kwuo ihe ọjọọ+Ma ọ bụ jiri ya* na-aghọ aghụghọ.+ ס [Samek] 14  Ya hapụ ihe ọjọọ, mewe ezi ihe.+ Ya na-achọ udo ma gbalịa na-eme udo.+ ע [Ayin] 15  Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+Ntị ya na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka e nyere ha aka.+ פ [Pee] 16  Ma Jehova na-ajụ ndị na-eme ihe ọjọọ,Ka e wee bibie ha, a gharazie icheta ha n’ụwa.+ צ [Sadee] 17  Ha bere ákwá, Jehova wee nụ ya.+ Ọ napụtara ha n’ahụhụ niile ha na-ata.+ ק [Kof] 18  Jehova nọ ndị obi gbawara nso.+ Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.*+ ר [Resh] 19  Ọtụtụ nsogbu* na-abịara onye ezi omume,+Ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.+ ש [Shin] 20  Ọ na-echebe ọkpụkpụ ya niile. E nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.+ ת [Tọọ] 21  Ọdachi ga-egbu onye ajọ omume. A ga-ama ndị kpọrọ onye ezi omume asị ikpe. 22  Jehova na-agbapụta ndụ* ndị ohu ya. E nweghị ndị gbabara n’ime ya a ga-ama ikpe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “egbugbere ọnụ ya.”
Na Hibru, “ire.”
Ma ọ bụ “ndị obi dara mbà.”
Ma ọ bụ “ọdachi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”