Ozi Ọma Jọn Dere 12:1-50

  • Meri tere Jizọs mmanụ n’ụkwụ (1-11)

  • Jizọs banyere Jeruselem ka eze (12-19)

  • Jizọs kwuru banyere ọnwụ ya (20-37)

  • Enweghị okwukwe ndị Juu mezuru amụma (38-43)

  • Jizọs bịara ịzọpụta ụwa (44-50)

12  Mgbe ọ fọrọ ụbọchị isii ka e mee Ememme Ngabiga, Jizọs rutere Betani, bụ́ ebe Lazarọs+ ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ bi.  E wee meere ya oriri anyasị n’ebe ahụ. Mata nọ na-eje ozi.+ Ma Lazarọs so ná ndị ya na ha nọ na-eri ihe.  Meri wee were mmanụ na-esi ísì ọma dị otu paụnd* n’arọ tee Jizọs n’ụkwụ ma jiri ntutu isi ya hichaa ya ụkwụ. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Ísì mmanụ ahụ wee ju n’ụlọ ahụ.+  Ma Judas Iskarịọt,+ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye na-aga ịrara ya nye, sịrị:  “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ọma narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye?”  Ma, ihe mere o ji kwuo ihe a abụghị na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya n’obi, kama ọ bụ maka na ọ bụ onye ohi. Ọ bụ ya na-eji igbe ego, ọ na-ewerekwa ego e tinyere na ya.  Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya, ka o mee ihe a iji kwadebe ahụ́ m maka ụbọchị a ga-eli m.+  N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”+  Ma, ọtụtụ ndị Juu matara na Jizọs nọ n’ebe ahụ. Ha wee bịa ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs, onye ọ kpọlitere n’ọnwụ.+ 10  Ndị isi nchụàjà wee gbaa izu igbukwa Lazarọs, 11  n’ihi na ọ bụ maka ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-aga n’ebe ahụ ma na-enwe okwukwe na Jizọs.+ 12  N’echi ya, ìgwè mmadụ ndị bịara ememme ahụ nụrụ na Jizọs na-abịa Jeruselem. 13  Ha wee chịrị igu nkwụ gawa izute ya. Ha malitekwara iti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya! Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova*+ bụ onye a gọziri agọzi. Ọ bụ Eze Izrel!”+ 14  Mgbe Jizọs hụrụ otu nwa jakị, ọ nọkwasịrị na ya,+ otú ahụ e dere, sị: 15  “Atụla egwu, Zayọn.* Lee, Eze gị na-abịa. Ọ nọkwasịrị na nwa jakị.”+ 16  Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a na mbụ. Ma mgbe e mere ka Jizọs dị ebube,+ ha chetara na e dere ihe ndị a banyere ya, chetakwa na ha meere ya ihe ndị a.+ 17  Ìgwè mmadụ ndị hụrụ mgbe Jizọs si n’ili*+ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ nọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe merenụ.+ 18  Ọ bụkwa ya mere ìgwè mmadụ ji gakwuru ya n’ihi ọrụ ebube a ha nụrụ na ọ rụrụ.* 19  Ndị Farisii wee gwa ibe ha, sị: “Unu ahụla na e nweghị ebe unu ji azụ aga. Lee, ụwa niile esorola ya.”+ 20  E nwere ụfọdụ ndị Grik so ná ndị bịara ife Chineke n’ememme ahụ. 21  Ha bịakwutere Filip+ onye Betsaịda, nke dị na Galili, malite ịrịọ ya, sị: “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jizọs.” 22  Filip bịara kọọrọ Andru, Andru na Filip abịa kọọrọ Jizọs. 23  Ma Jizọs sịrị ha: “Oge eruola ka e mee ka Nwa nke mmadụ dị ebube.+ 24  N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na otu mkpụrụ ọka wit adaghị n’ala ree,* ọ ka bụ otu mkpụrụ ọka. Ma ọ bụrụ na o ree,*+ ọ na-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25  Onye ọ bụla hụrụ ndụ* ya n’anya na-ebibi ya. Ma onye ọ bụla kpọrọ ndụ* ya asị+ n’ụwa a ga-echebe ya ka o wee nweta ndụ ebighị ebi.+ 26  Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, ya sowe m. Ebe m nọ ka onye ozi m ga-anọkwa.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù. 27  E nwere ihe na-echegbu m* ugbu a.+ Gịnịkwa ka m ga-ekwu? Nna, zọpụta m n’awa a.+ Ma, ọ bụ n’ihi awa a mere m ji bịa. 28  Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Otu olu+ wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Emeela m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”+ 29  Ìgwè mmadụ ndị guzo n’ebe ahụ nụrụ ya wee malite ikwu na ọ bụ égbè eluigwe gbara. Ndị ọzọ sịrị: “Mmụọ ozi agwala ya okwu.” 30  Jizọs sịrị: “Olu a kwuru okwu abụghị n’ihi m, kama ọ bụ n’ihi unu. 31  A na-ekpe ụwa a ikpe ugbu a. Ugbu a, a ga-achụpụ+ onye na-achị ụwa a.+ 32  Ma ọ bụrụ na e si n’ụwa wegoo m n’elu,*+ m ga-adọta ụdị mmadụ niile n’ebe m nọ.” 33  N’eziokwu, ọ nọ na-ekwu ihe a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.+ 34  Ìgwè mmadụ ahụ wee sị ya: “Iwu* kwuru na Kraịst ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.+ Oleekwanụ otú i si na-asị na a ga-ewego Nwa nke mmadụ n’elu?*+ Ònye ka Nwa nke mmadụ a bụ?” 35  Jizọs wee sị ha: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu n’etiti unu. Na-ejegharịnụ n’ìhè ahụ mgbe unu ka nwere ya, ka ọchịchịrị ghara ikpuchi unu. Onye na-ejegharị n’ọchịchịrị anaghị ama ebe ọ na-aga.+ 36  Nweenụ okwukwe n’ìhè ahụ mgbe unu ka nwere ya, ka unu wee bụrụ ụmụ nke ìhè.”+ Jizọs kwuru ihe ndị a, gazie zoo ka ha ghara ịhụ ya. 37  N’agbanyeghị na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube* n’ihu ha, ha enweghị okwukwe na ya, 38  ka e wee mezuo ihe Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Jehova,* ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+ Ònyekwa ka Jehova* mere ka ọ mara ike* ya?”+ 39  Ihe mere na ha enweghị ike ikwere bụ na Aịzaya kwukwara, sị: 40  “O meela ka anya ha kpuo ìsì, meekwa ka obi ha kpọọ nkụ, ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji obi ha ghọta ihe ma gbanwee,* mụ agwọọ ha.”+ 41  Aịzaya kwuru ihe ndị a n’ihi na ọ hụrụ ebube Kraịst wee kwuo banyere ya.+ 42  Ma, ọtụtụ n’ime ndị isi ndị Juu nwedịrị okwukwe na ya.+ Ma ha anaghị ekwupụta ya n’ihi ndị Farisii, ka a ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ ha,+ 43  n’ihi na ha chọrọ otuto si n’aka mmadụ karịadị otuto si n’aka Chineke.+ 44  Ma, Jizọs kwuru n’olu dara ụda, sị: “Onye ọ bụla nwere okwukwe na m nwere okwukwe, ọ bụghị naanị na m, kamakwa n’onye zitere m.+ 45  Onye ọ bụla na-ahụ m na-ahụkwa Onye zitere m.+ 46  Abịara m n’ụwa dị ka ìhè,+ ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe na m ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.+ 47  Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu m, ma ọ naghị eme ya eme, anaghị m ekpe ya ikpe, n’ihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.+ 48  Onye ọ bụla na-eleda m anya ma ghara ịnabata ihe m na-ekwu nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Ọ bụ okwu m kwuru ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ. 49  N’ihi na e nweghị ihe m kwuru bụ́ uche m, kama Nna m, onye zitere m, gwara m* ihe m ga-ekwu na ihe m ga-akụzi.+ 50  Amakwa m na iwu ya na-enye ndụ ebighị ebi.+ N’ihi ya, ihe ọ bụla m na-ekwu, m na-ekwu ya otú Nna m gwara m ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, paụnd ndị Rom. Ọ bụ ihe dị ka gram 327. Gụọ B14.
Gụọ B14.
Gụọ A5.
Na Grik, “ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Na Grik, “ihe àmà a ha nụrụ na o mere.”
Na Grik, “nwụọ.”
Na Grik, “nwụọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.
Ọ ga-abụ na Iwu a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.
Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.
Na Grik, “o mere ọtụtụ ihe àmà.”
Na Grik, “aka.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’ihe anyị kwuru?”
Gụọ A5.
Na Grik, “tụgharịa.”
Na Grik, “nyere m iwu.”