Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru 6:1-20

  • Ka anyị na-eme nke ọma ruo mgbe anyị tozuru etozu (1-3)

  • Ndị na-adapụ n’okwukwe na-akpọgide Jizọs n’osisi ọzọ (4-8)

  • Ka obi sie unu ike na unu ga-enweta ihe unu na-atụ anya ya (9-12)

  • Anyị ji n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya (13-20)

    • Nkwa Chineke na iyi ọ ṅụrụ anaghị agbanwe agbanwe (17, 18)

6  N’ihi ya, ebe anyị mụtarala ihe ndị mbụ a kụziiri anyị+ banyere Kraịst, ka anyị jisie ike na-eme nke ọma ruo mgbe anyị tozuru etozu.+ Ka anyị ghara ịlaghachi azụ mụwa ihe ndị mbụ a kụziiri anyị,* ya bụ, ịmụ banyere isi n’ọrụ na-abaghị uru* chegharịa, inwe okwukwe na Chineke,  ụdị baptizim dị iche iche, ibikwasị mmadụ aka n’isi,+ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ,+ nakwa ihe Chineke kpebiri nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.  Anyị ga-etozu etozu ma ọ bụrụ uche Chineke.  N’ihi na ndị e merela ka ha ghọta eziokwu,+ ndị detụrụ onyinye si n’eluigwe e nyere n’efu ire, ndị nwetarala mmụọ nsọ,  ndị detụrụ okwu Chineke nke dị ezigbo mma ire, detụkwa ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu ire,*  ma ha adapụ n’okwukwe,+ e nweghị ike ime ka ha chegharịa ọzọ n’ihi na ha na-akpọgide Ọkpara Chineke n’osisi ọzọ ma na-eme ka ihere mee ya n’ihu ọha.+  Chineke na-eji mmiri na-ezo ugboro ugboro agọzi ala n’ihi na ala na-amịrị mmiri ozuzo ma puoro ndị kọrọ ihe na ya ihe ha kọrọ.  Ma, o puo ogwu na uke, e nweghịzi ihe a na-eji ya eme. Obere oge a ga-abụ ya ọnụ. E mechaakwa, a ga-esu ya ọkụ.  Ma unu ndị anyị hụrụ n’anya, obi siri anyị ike na unu ka ndị dapụrụ n’okwukwe mma, unu na-emekwa ihe ga-eme ka a zọpụta unu, n’agbanyeghị na anyị na-ekwu ihe a. 10  N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe*+ n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi. 11  Ma anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-arụsi ọrụ ike otú ahụ, ka obi wee sie unu ike ruo ọgwụgwụ+ na unu ga-enweta ihe unu na-atụ anya ya.+ 12  Anyị achọghị ka unu dịrị umengwụ,+ kama na-emenụ ka ndị ahụ, bụ́ ndị okwukwe ha na ndidi ha mere ka e kwe ha nkwa. 13  N’ihi na mgbe Chineke kwere Ebreham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi+ ebe ọ bụ na e nweghị onye ka yanwa. 14  Ọ sịrị: “N’eziokwu, m ga-agọzi gị. N’eziokwu, m ga-eme ka ị dị ọtụtụ.”+ 15  Ọ bụ mgbe Ebreham nwechara ndidi ka e kwere ya nkwa a. 16  Ndị mmadụ na-eji onye ka ha aṅụ iyi, iyi ha na-aṅụ na-emekwa ka esemokwu bie n’ihi na ọ na-egosi na ihe ha kwuru bụ eziokwu.+ 17  Chineke mekwara ihe yiri ya. Mgbe o kpebiri ime ka o dokwuo ndị ga-eso nweta ihe ahụ e kwere ná nkwa+ anya na nzube ya* anaghị agbanwe agbanwe, ọ ṅụrụ iyi wee gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu. 18  Ihe abụọ a Chineke mere* anaghị agbanwe agbanwe, Chineke emekataghịkwa ghaa ụgha.+ Ihe ndị a na-eme ka obi sie anyịnwa ndị gbabara n’ime ya ike, ka anyị wee ghara ịkwụsị inwe olileanya anyị nwere. 19  Olileanya a anyị nwere+ ji ndụ* anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri* si ejide ụgbọ mmiri. O siri ike, e jikwa ya n’aka. Ọ na-edu anyị agafe ákwà mgbochi ahụ,+ 20  nke onye bu anyị ụzọ gaferela n’ihi anyị, ya bụ, Jizọs,+ onye ghọrọ nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ọ ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ghara ibidokwa n’isi tọwa ntọala.”
Na Grik, “n’ọrụ nwụrụ anwụ.”
Na Grik, “detụkwa ike nke usoro ihe na-abịa abịa ire.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Ma ọ bụ “otú unu si gosi na unu hụrụ aha ya n’anya.”
Ma ọ bụ “ihe o kpebiri ime.”
Ya bụ, nkwa o kwere na iyi ọ ṅụrụ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “otú arịlịka.”