Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom 5:1-21

  • Kraịst mere ka anyị na Chineke dịrị ná mma (1-11)

  • Ọnwụ si n’aka Adam, ndụ si n’aka Kraịst (12-21)

    • Mmehie na ọnwụ gbasara ruo mmadụ niile (12)

    • Otu ezi omume (18)

5  N’ihi ya, ugbu a a kpọrọla anyị ndị ezi omume maka na anyị nwere okwukwe,+ ka anyị na Chineke na-adị n’udo. Ọ bụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst mere ka udo a nwee isi.+  Okwukwe anyị nwere na ya emeela ka amara a ruo anyị aka, bụ́ nke anyị na-enweta ugbu a.+ Ka anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ* n’ihi na anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta ebube Chineke.  Ọ bụghị naanị ya, kama ka anyị na-aṅụrị ọṅụ* mgbe a na-akpagbu anyị,+ ebe ọ bụ na anyị ma na mkpagbu na-eme ka anyị tachie obi;+  ịtachi obi na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma;+ anyị na Chineke ịdị ná mma na-eme ka anyị nwee olileanya.+  Olileanya a anaghị emenye anyị ihere;+ n’ihi na Chineke ji mmụọ nsọ o nyere anyị mee ka ịhụnanya ya ju n’obi anyị.+  N’eziokwu, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie,*+ Kraịst nwụrụ n’oge a kara aka maka ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke.  O siri ike mmadụ ọ bụla ịnwụ maka onye ezi omume; ma mmadụ nwere ike ikweta ịnwụ maka ezigbo mmadụ.  Ma Chineke gosiri anyị na ọ hụrụ anyị n’anya n’ihi na Kraịst nwụrụ maka anyị mgbe anyị ka bụ ndị mmehie.+  Ebe ọ bụ na a kpọọla anyị ndị ezi omume ugbu a n’ihi ọbara ya,+ o doro anya na a ga-esi n’aka ya zọpụta anyị ka Chineke ghara iwesa anyị iwe.+ 10  N’ihi na ọ bụrụ na ọnwụ Ọkpara ya mere ka anyị na Chineke dị ná mma mgbe anyị bụ ndị iro ya,+ o doro anya na ndụ ya ga-eme ka a zọpụta anyị ugbu a e merela ka anyị na Chineke dị ná mma. 11  Ọ bụghị naanị ya, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ maka na anyị na Chineke dị ná mma n’ihi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye mere ka anyị na Chineke dịrị ná mma ugbu a.+ 12  N’ihi ya, otú ahụ mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata,+ ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere+—. 13  N’ihi na mmehie dị n’ụwa tupu Iwu ahụ,* ma a naghị ekwu na mmadụ bụ onye mmehie mgbe iwu na-adịghị.+ 14  Ma, ọnwụ chịrị mmadụ niile malite n’Adam ruo na Mosis. Ọ chịdịrị ndị na-emeghị ụdị mmehie Adam mere, bụ́ onye yiri onye ahụ e kwuru na ọ ga-abịa.+ 15  Ma onyinye ahụ adịghị ka mmehie ahụ. N’ihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ nwụrụ n’ihi mmehie otu onye, o doro anya na amara Chineke na onyinye o nyere n’efu nke si n’amara otu onye,+ bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eru ọtụtụ ndị aka n’ụba.+ 16  Uru onyinye ahụ e nyere n’efu bara adịghịkwa ka nsogbu mmehie otu onye kpatara.+ N’ihi na otu mmehie mere ka a maa mmadụ niile ikpe,+ ma onyinye e nyere mgbe ọtụtụ ndị merela mmehie mere ka a kpọọ ọtụtụ ndị ndị ezi omume.+ 17  Ebe ọ bụ na ọnwụ si n’aka otu onye bụrụ eze n’ihi mmehie onye ahụ,+ o doro anya na ndị na-enweta amara Chineke n’ụba na onyinye ezi omume ahụ e nyere n’efu+ ga-adị ndụ ma si n’aka otu onye ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst,+ bụrụ ndị eze.+ 18  N’ihi ya, otú ahụ otu mmehie mere ka a maa ụdị mmadụ niile ikpe,+ otú ahụkwa ka otu ezi omume si eme ka a na-akpọ ụdị mmadụ niile+ ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.+ 19  N’ihi na ebe ọ bụ na nnupụisi otu onye mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị mmehie,+ otú ahụkwa ka nrubeisi otu onye ga-esi eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ezi omume.+ 20  E mechara nwee Iwu ahụ* ka ndị mmadụ wee mata na ha na-eme ọtụtụ mmehie.+ Ma n’ebe mmehie dị ọtụtụ, amara na-abakwu ụba. 21  Ọ̀ bụ ka gịnị wee mee? Ọ bụ ka amara wee si n’ezi omume bụrụ eze otú ahụ mmehie na ọnwụ bụ eze,+ mezie ka ndị mmadụ si n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị nweta ndụ ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Anyị na-aṅụrị ọṅụ.”
O nwere ike ịbụ, “kama anyị na-aṅụrị ọṅụ.”
Na Grik, “ndị na-adịghị ike.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.