Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Mere Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ji Eme Ka Ọtụtụ Ndị Ghara Ịdị n’Otu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru

Gịnị Mere Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ji Eme Ka Ọtụtụ Ndị Ghara Ịdị n’Otu?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru

 N’ụwa niile, ọtụtụ ndị adịghị n’otu n’ihi na ha nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche n’obodo ha. N’otu nchọnchọ e mere n’afọ 2022, ihe karịrị ọkara ndị toro eto a jụrụ ajụjụ ná mba iri na itoolu kwuru na ndị nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche ná mba ha anaghịdị achọ iji anya ahụ ibe ha nakwa na ha na-esekarị okwu.

 Ị̀ chọpụtala n’ebe i bi na ndị mmadụ na-akpọkwu ibe ha asị maka na ha nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche? Gịnị mere o ji dị otú ahụ? È nwere ihe a ga-eme ka nsogbu a kwụsị? Legodị ihe Baịbụl kwuru.

Àgwà ndị na-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu

 Baịbụl kwuru na n’oge anyị a, nke ọ kpọrọ “oge ikpeazụ,” ọtụtụ ndị ga na-akpa àgwà ndị ga-eme ka o siere ndị mmadụ ike ịdị n’otu.

  •   “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla.”​—2 Timoti 3:​1-3.

 N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike ka ihe na-aga nke ọma n’ọchịchị, mbọ niile ha na-agba na-akụ afọ n’ala. Otú ndị mmadụ si ele ihe anya dị iche iche. N’ihi ya, ọ na-esiri ha ezigbo ike ịrụkọ ọrụ ọnụ iji dozie nsogbu. Ihe a na-emenụ na-egosi na ihe Baịbụl kwuru ọtụtụ afọ gara aga bụ eziokwu.

  •   “Mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.”​—Ekliziastis 8:9.

 Ma, Baịbụl kwuru ihe ga-eme ka nsogbu a kwụsị. O kwuru na ọ bụ ọchịchị otu onye ga-eme ya. Onye ahụ ga-emeli ka nsogbu niile na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ kwụsị.

Onye ọchịchị ruru eru, nke na-echebara ndị ọ na-achị echiche

 Baịbụl kwuru na e nwere onye ọchịchị ga-akwụsịli nsogbu niile. Ọ bụ Jizọs Kraịst. Jizọs nwere ike ọ ga-eji mee ka mmadụ niile dịrị n’otu, dịrịkwa n’udo. Chineke nyere ya ikike ime ya, ọ na-agụkwa ya agụụ ime ya.

  •   “N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile.”​—Abụ Ọma 72:7.

  •   “Mba niile ga-ejekwara ya ozi.”​—Abụ Ọma 72:11.

 Jizọs bụ onye ọchịchị kacha mma n’ihi na ihe gbasara ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi, ọ chọkwara inyere ha aka, karịchaa ndị a na-emegbu emegbu.

  •   “N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka, napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere, ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—Abụ Ọma 72:​12-14.

 Matakwuo banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị. Ọ bụ Jizọs bụ eze ya. Chọpụta otú alaeze a ga-esi baara gị uru nakwa otú ị ga-esi na-akwado ya.