Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 131

“Ihe Chineke Kekọtara”

“Ihe Chineke Kekọtara”

(Matiu 19:5, 6)

  1. 1. Nwoke na nwaanyị lụọ,

    Obi n’adị h’ụtọ

    Na ha bụ di na nwunye.

    Ọ bụn-kwa ha kwere.

    (UKWE NKE 1)

    Di kwere nwunye yan-kwa

    N’ọ g’ahụ ya n’anya.

    Chineke kekọrọ ha.

    Atọsakwala ha.

  2. 2. Ha ji Baịbụl mụta

    Eziokwu Chineke.

    Ha n’arịọ k’ọ gọzie ha,

    Ka ha mezuon-kwa ha.

    (UKWE NKE 2)

    Nwunye kwere di yan-kwa

    N’ọ g’ahụ ya n’anya.

    Chineke kekọrọ ha.

    Atọsakwala ha.