Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-ele Onwe Gị Anya Otú Jehova Si Ele Gị

Na-ele Onwe Gị Anya Otú Jehova Si Ele Gị

“Jehova hụrụ ndị ya n’anya.” (Ọma 149:4) Ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè, ma Jehova na-ahụ ebe ndị anyị na-eme nke ọma na ihe ndị anyị ka nwere ike ime n’ọdịnihu. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịna-esiri anyị ike ịhụ ebe ndị anyị na-eme nke ọma. Anyị nwere ike ịna-eche na o nweghị uru anyị bara n’ihi otú ndị ọzọ si emeso anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-echekarị banyere ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga, anyị nwere ike ịna-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụkwara anyị n’anya. Gịnị ga-enyere anyị aka mgbe ọ bụla ọ dị anyị otú a?

Cheta na Jehova na-ahụ ihe mmadụ na-enweghị ike ịhụ. (1 Sam. 16:7) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova na-ahụdị ihe anyị na-anaghị ahụ gbasara onwe anyị. Ma obi dị anyị ụtọ na Baịbụl na-eme ka anyị mata otú Jehova si ele anyị anya. Anyị ga-amata otú Jehova si ele anyị anya ma ọ bụrụ na anyị ana-agụ amaokwu Baịbụl na akụkọ Baịbụl ndị gosiri otú Jehova hụruru ndị na-efe ya n’anya.

LEENỤ VIDIO BỤ́ KWE KA OBI GỊ NA UCHE JEHOVA KWEKỌỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị ka ihe atụ onye na-agba ọsọ na nna ya na-akụziri anyị banyere otú Jehova si ele anyị anya?

  • Ọ bụrụ na onye mere mmehie dị oké njọ emee ihe ndị o kwesịrị ime ka ya na Jehova dịghachi ná mma, gịnị ka ọ ga-eme ka obi sie ya ike na Chineke hụrụ ya n’anya?​—1 Jọn 3:19, 20

  • Olee otú ịgụ akụkọ Devid na akụkọ Jehoshafat na ichebara ha echiche si baara nwanna ahụ uru?