Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu n’Ime Akị Kasị Baa Uru n’Ụwa

Otu n’Ime Akị Kasị Baa Uru n’Ụwa

Otu n’Ime Akị Kasị Baa Uru n’Ụwa

E NWERE otu akị pụrụ iche bụ́ nke gazuworo ụwa nile. E si na ya enweta ma nri ma ihe ọṅụṅụ. Ọdịdị pụrụ iche nke osisi na-amị ya bụ ihe e ji amata àgwàetiti ndị dị n’ebe okpomọkụ. Olee akị anyị na-ekwu banyere ya? Akị bekee—otu n’ime akị kasị baa uru n’ụwa.

Nye ndị si n’ebe ndị na-abụghị Ebe Okpomọkụ, osisi akị bekee pụrụ ịbụ nanị ihe na-echetara ha ezumike ha gara n’ebe okpomọkụ ụwa. Ma nye ndị bi n’Ebe Okpomọkụ, osisi ahụ bara uru karị. Ndị Indonesia na-ekwu na “a na-eji [mkpụrụ ya] eme ọtụtụ ihe dị nnọọ ka e nwere ọtụtụ ụbọchị n’afọ.” Na Philipines, a na-ekwu, sị: “Onye kụrụ akị bekee kụrụ arịa na uwe, nri na ihe ọṅụṅụ, ebe obibi maka onwe ya, na ihe nketa maka ụmụ ya.”

Nke a abụghị ikwubiga okwu ókè. Dị ka akwụkwọ bụ́ Coconut—Tree of Life (Akị Bekee—Osisi nke Ndụ) si kwuo, a na-esi n’osisi akị bekee “enweta ọ bụghị nanị nri, mmiri na mmanụ nri, kamakwa, e si na ya enweta igu maka elu ụlọ akịrịka, eriri maka ụdọ na ute, mkpo ndị a pụrụ iji mee ihe dị ka arịa na ihe ịchọ mma, na mmiri dị ụtọ na-adị n’ifuru ya bụ́ nke e ji emepụta shuga na mmanya na-aba n’anya.” Akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ọbụna, a pụrụ iji osisi ya mee ihe ma ọ bụrụ na a waa ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.” N’eziokwu, ndị bi n’Àgwàetiti Maldive nke dị n’Oké Osimiri India ji ihe ndị si n’osisi akị bekee rụọ ụgbọ mmiri, a sịkwara na ha ji ha gaa Arebia na Philippines. Ma akị bekee abụwo ihe kasị eme njem n’oké osimiri kama ịbụ ndị na-akụ ya.

Mkpụrụ Na-eme Njem n’Oké Osimiri

Akị bekee na-eto nke ọma n’ikperé mmiri nke ebe ndị kasị ekpo ọkụ ma ọ bụrụhaala na mmiri na-ezo nke ọma. Ọ bụ ezie na ndị bi n’ógbè ahụ pụrụ ịkụ akị bekee, akị bekee emewo njem n’onwe ya gaa n’ebe ndị kasị dịpụ adịpụ na mbara ala a. Mkpụrụ dị iche iche na-esi ọtụtụ ụzọ agbasa, ma akị bekee na-eji oké osimiri eme ihe. Ọ bụ nke ahụ mere o ji enwe ihe ịga nke ọma n’ịgazu ụwa nile.

Mgbe akị bekee kara, ọ na-ada n’ala. N’ọnọdụ ụfọdụ, akị bekee ahụ kara aka na-akpọrere gaa na mmiri. Oké ebili mmiri pụziri ibuba akị bekee ahụ n’oké osimiri. Ebe ọ bụ na mkpo ya na-ejide nnukwu ikuku, akị bekee na-ese n’elu mmiri n’ụzọ dị mfe. Ọ bụrụ na akị bekee ahụ dị n’àgwàetiti mmiri dị n’etiti ya n’oké osimiri Pacific, ọ pụrụ nanị isere gaa n’akụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ma ọ bụrụ na o ruo n’oké osimiri, akị bekee ahụ pụrụ ime njem gaa n’ebe dị ezigbo anya.

Ọ na-ewe ogologo oge tupu mmiri nnu, bụ́ nke na-ebibi ihe ka ọtụtụ ná mkpụrụ akụ́kụ́, agafee mkpo siri ike nke akị bekee. Akị bekee pụrụ ịnọ n’oké osimiri ruo ọnwa atọ n’enweghị ihe mere ya—mgbe ụfọdụ, ọ na-ese n’elu mmiri ruo ọtụtụ puku kilomita—n’agbanyeghịkwa nke ahụ, ọ na-epu ome n’ụzọ gara nke ọma mgbe o ruru n’ụsọ mmiri. Ikekwe, ọ bụ n’ụzọ a ka akị bekee siworo jupụta n’ọtụtụ n’ime ikperé mmiri ndị dị n’ebe okpomọkụ nke ụwa.

Ụtọ E Ji Mara Nri nke Ebe Okpomọkụ Ụwa

N’ebe ndị na-abụghị Ebe Okpomọkụ, ndị mmadụ pụrụ ile akị bekee anya dị ka ihe e ji eme ka ihe nracha ma ọ bụ biskit tọwanye ụtọ. Otú ọ dị, ị gaa na Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia, ị ga-achọpụta na akị bekee bara uru n’ezie. Dị ka akwụkwọ bụ́ Pacific and Southeast Asian Cooking si kwuo, “akị bekee bụ ihe dị oké mkpa mba nile nakwa ógbè nile nakwa àgwàetiti nile site na Hawaii ruo Bangkok na-eji esi nri.” Akwụkwọ ahụ na-ekwukwa na nye ndị bi n’ebe ndị ahụ, “akị bekee bụ ihe dị mkpa ná ndụ, bụ́ nke ha na-esi na ya enweta ihe na-edozi ahụ́ . . . n’ụdị dị iche iche nakwa site n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị nri na ụtọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.”

O sighị ike ịmata ihe mere akị bekee ji bụrụ ihe e ji kpọrọ oké ihe n’Ebe Okpomọkụ Ụwa: E si na ya enweta mmiri, mmiri a pịpụtara n’akị bekee, na mmanụ nri. Mmiri dị ọcha nke na-atọ ụtọ, nke na-ejupụta n’ime akị bekee na-akpọbeghị akpọ bụ nke a maara dị ka mmiri akị bekee. Ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-atọ ụtọ, nke na-enye ume ọhụrụ, bụ́ nke a na-erekarị n’ụlọ ahịa ndị dị n’okporo ụzọ n’ebe okpomọkụ ụwa. A na-etinye mmiri n’akị bekee a kwọrọ akwọ ma pịpụtazie mmiri ya. Mmiri a pịpụtara n’akị bekee na-eme ka ofe na ụtụ ọka a gwọrọ agwọ tọkwuo ụtọ.

Iji nweta mmanụ nri site n’akị bekee, onye na-akụ ya aghaghị igbuwa akị kara aka ma gbaa ya n’anwụ. Ozugbo ọ kpọrọ, a pụrụ ịghụpụta uru akị ahụ ná mkpo ya, a pụziri isi na ya nweta mmanụ. N’Ebe Okpomọkụ Ụwa, mmanụ akị bekee bụ mmanụ bụ́ isi e ji esi nri, ma ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, a na-ejikarị ya eme ihe n’imepụta bọta, ice cream, na biskit.

Ịghọta akị bekee abụghị obere ọrụ. Mgbe mgbe, onye na-aghọ ya ga-arị elu osisi akị bekee ma gbupụta akị ya. Ndị ọzọ na-eji osisi dị ogologo nke e kedoro mma n’isi ya aghọ ya. N’Indonesia, a zụwo enwe ịrụ ọrụ ahụ. Ụzọ kasị mfe—nke ndị chọrọ ijide n’aka na ha ghọtara akị bekee kara aka na-ahọrọ—bụ ichere ruo mgbe akị bekee ahụ ji aka ya daa.

Otú e sila ghọta ya, ọtụtụ ihe a na-eji akị bekee eme emewo ka ọ bụrụ mkpụrụ akụ́kụ́ na-enye ego nakwa ihe dị oké mkpa ọtụtụ ndị si na ya enweta ihe oriri. Ya mere, mgbe ọzọ ị ga-ahụ osisi akị bekee—ma ọ bụ na foto ma ọ bụ n’ìhè—cheta na ịdị mkpa ya abụghị nanị maka ime ka ụsọ mmiri ndị dị n’ebe okpomọkụ ụwa maa mma. Ihe ị na-ele anya bụ osisi na-amị otu n’ime akị ndị kasị baa uru n’ụwa.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

IHE NDỊ PỤRỤ ICHE NA-AKPALI MMASỊ N’AKỊ BEKEE

NSHỊKỌ AKỊ BEKEE Ọ bụghị nanị ụmụ mmadụ ka akị bekee na-amasị. Nshịkọ akị bekee na-ebi n’ọnụ a tụrụ n’ala n’ehihie, ma ọ na-eji akị bekee akpara afọ ya n’abalị. Ọ bụ ezie na mma na-adị ndị mmadụ mkpa iji gbuwaa akị bekee, nshịkọ a maara ka e si egbo mkpa na-arụ ọrụ dị ukwuu iji kụwaa akị bekee, ọ na-akụ ya n’okwute ruo mgbe ọ gbawara. O yiri ka nri nke gụnyere akị bekee ọ̀ na-egbo agụụ nke ihe a e kere eke—ọ pụrụ ịdị ndụ ruo ihe karịrị afọ 30!

AKỊ BEKEE E TINYERE N’IHE NTECHA Ebe ọ bụ na mmanụ akị bekee na-adị mma n’ahụ́, ndị na-emepụta ihe ntecha na-eji ya eme ihe n’imepụta uhie ọnụ na mmanụ ndị na-egbochi anwụ ịchanwụ akpụkpọ ahụ́. Ọ bụrụkwa na i ji ncha ịsa ahụ́ ma ọ bụ ncha ịsa isi bụ́ nke na-agbọ oké ụfụfụ eme ihe, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na mmanụ akị bekee so n’ihe ndị bụ́ isi e ji mee ya.

[Foto]

Akị bekee pụrụ ise n’elu oké osimiri n’emebighị emebi

Nshịkọ akị bekee

Akị bekee na-epulite epulite

[Ebe E Si Nweta Foto]

Godo-Foto

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 27]

Foto dị n’ime n’elu aka nri: Godo-Foto