Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uche nke Na-enwe Mmekpa Ahụ́

Uche nke Na-enwe Mmekpa Ahụ́

Uche nke Na-enwe Mmekpa Ahụ́

NICOLE enwewo oge ndị ọ dara mbà n’obi kemgbe ọ dị afọ 14. Otú ọ dị, mgbe ọ dị afọ 16, ọ malitere inwe mmetụta ọhụrụ—oké obi ụtọ na ike dị ukwuu nke ọ na-enwebughị. Ọ malitere inwe nsogbu mgbasasị uche, nkwugheri ọnụ, na ehighị ụra, tinyekwara inyo ndị enyi ya enyo n’ụzọ na-enweghị isi na ha na-erigbu ya. Ọzọkwa, Nicole kwuru na ya pụrụ ịgbanwe ụcha ihe gaa n’ụcha ọ bụla ọ chọrọ. Ọ bụ mgbe o ruru na nke a ka nne ya maara na ọ dị mkpa ịchọ enyemaka ndị ọrụ ahụ́ ike, n’ihi ya, ọ kpọọrọ Nicole gaa ụlọ ọgwụ. Mgbe ndị dọkịta lebasịrị anya n’ọnọdụ uche Nicole, bụ́ nke na-agbanwe agbanwe, ha mesịrị chọpụta ihe na-arịa ya: E nwere ihe na-emetụ Nicole n’isi. *

Dị ka ọ dị n’ebe Nicole nọ, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile na-enwe nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche—ma ọ́ bụghị na ihe na-emetụ ha n’isi, ọ̀ bụrụ na ha nwere ụdị ụfọdụ nke ịda mbà n’obi. Mmetụta nke ọrịa ndị a pụrụ ịdị njọ. “Ruo ọtụtụ afọ, anọrọ m n’ihe mgbu,” ka otu onye ihe na-emetụ n’isi nke aha ya bụ Steven, na-ekwu. “Ọ na-abụ m nwee oké ịda mbà n’obi n’oge a, n’oge nke ọzọ m nwee obi ụtọ gabigara ókè. Usoro ọgwụgwọ na ọgwụ nyere aka, ma ọ ka bụkwaara m ọgụ na mgba.”

Gịnị na-akpata nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche? Olee ihe ọ dị ka ya bụ́ mmadụ ịda mbà n’obi ma ọ bụ ịbụ onye ihe na-emetụ n’isi? Olee otú a pụrụ isi nye ndị na-enwe nsogbu ndị ahụ—na ndị na-elekọta ha—nkwado dị ha mkpa?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Biko rịba ama na ụfọdụ n’ime ihe mgbaàmà ndị a pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke isi mgbaka, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ ọbụna mgbanwe ndị a na-enwe n’oge uto bụ́ nke na-adịghị njọ. E kwesịrị ikwu na mmadụ nwere nsogbu ahụ nanị mgbe onye ọkachamara lesịrị ya ahụ́ nke ọma.