Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ga-emeli Ka Ihe Dị Mma n’Ụwa A?

Ònye Ga-emeli Ka Ihe Dị Mma n’Ụwa A?

Echiche Baịbụl

Ònye Ga-emeli Ka Ihe Dị Mma n’Ụwa A?

Ban Ki-Moon bụ́ Odeakwụkwọ Ukwu Òtù Mba Ụwa kwuru, sị: “Ndị mmadụ chọrọ ka ndị na-achị ha nyere ha aka. Ihe dị ha mkpa bụ ka e gbooro ha mkpa ha niile ọ bụghị naanị ole na ole. Ha achọghị ka a na-akọrọ ha ogologo akụkọ.”

BAỊBỤL kpọrọ oge a anyị bi na ya “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ihe anyị na-anụkarị n’akụkọ ụwa bụ gbasara agha, otú ndị mmadụ si asụ ibe ha akwụ, otú ihe isi ike si ju ebe niile na otú ndị mmadụ si na-emetọ ụwa anyị a.

Ì chere na ihe ga-emecha dị mma? Ndị ọchịchị hà ga-akwụsịli nsogbu ndị e nwere n’ụwa, ka ò nwere onye ọzọ ga-akwụsị ha?

Ihe Ọtụtụ Mba Na-ekwu

Ọtụtụ mba na-ekwu na Chineke kwụ ha n’azụ. Dị ka ihe atụ, n’ukwe ndị Amerịka ji eto mba ha, ha na-ekwu na ọ bụ Chineke na-achị ha. I leekwa anya n’ego ha, ihe e dere na ya bụ, “Na Chineke ka Anyị Tụkwasịrị Obi.”

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị bi n’Amerịka ekweghịdị na Chineke dị. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’ọtụtụ mba ndị na-ekwu na Chineke kwụ ha n’azụ. Ndị nke kwere na Chineke dị enweghị otu olu. Ụfọdụ na-ekwu na ọ ga-akwụsịli ihe ọjọọ n’ụwa a, ndị ọzọ amaghị ma ọ̀ ga-emeli ya.

● Ụfọdụ na-asị na Chineke enweghị mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, na ọ hapụrụ ha ka ha na-achị onwe ha.

● Ndị ọzọ ana-asị na Chineke ji ndị ọchịchị arụ ọrụ, na ọ ga-esi n’aka ha mee ka ihe dị mma.

Ò nwere nke bụ́ eziokwu n’ihe abụọ a ndị mmadụ na-ekwu? Ọ bụrụ na e nwere, olee nke ọ bụ?

Ị ma na ọ bụrụ na ihe nke mbụ ahụ ndị mmadụ na-ekwu bụ eziokwu, ọ pụtara na anyị nọ n’ezigbo nsogbu. Ma, ọ bụrụ na nke abụọ ahụ bụ eziokwu, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ò nwere mba Chineke hụrụ n’anya karịa ibe ya? Ọ bụrụ na mba abụọ na-alụ agha, nke ọ bụla n’ime ha ekpee ekpere ka Chineke nyere ha aka ka ha merie, olee nke ọ ga-enyere aka?’ Ì chere na o nwere ike gbachie mba abụọ ahụ nkịtị?

Ihe Baịbụl Kwuru

1. Chineke ekeghị mmadụ ka ọ na-achị ibe ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) Ihe ndị merela n’ụwa a gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọchịchị ụmụ mmadụ emebeghị ka ụwa a dị mma, ọ sọkwa ya ya bụrụ na onye na-achị bụ ezigbo mmadụ, nke bu n’obi ime ka ihe dị mma. Kama, ihe anyị na-ahụ bụ na ‘mmadụ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—Ekliziastis 8:9.

2. Ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi. Chineke ma mkpa anyị na ihe anyị na ya na-alụ. Ọ ga-enyekwara anyị aka. Olee ihe ọ ga-eji eme ya? Ọ bụ Alaeze ya, “nke a na-agaghị ebibi ebibi.”—Daniel 2:44.

3. Alaeze Chineke bụ ọchịchị. Ọ bụ Alaeze a ka ndị mmadụ na-ekpe n’ekpere Onyenwe Anyị. N’ekpere ahụ, ha na-arịọ Chineke, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Amaokwu Baịbụl a gosiri na ọ bụghị naanị n’eluigwe ka uche Chineke ga na-eme. Alaeze Chineke ga-emekwa ka uche ya mee n’ụwa.

4. Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka ihe dị mma n’ụwa. Ọ bụrụ na i kwetaghị na Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka ihe dị mma n’ụwa, lee ihe Baịbụl kwuru.

● Mgbe Chineke kere Adam na Iv, ha zuru okè, obi rukwara ha ala n’ebe ha bi.—Jenesis 1:27-31.

● Chineke echefubeghị ihe o bu n’obi imere anyị, n’agbanyeghị na nsogbu juru n’ụwa.—Abụ Ọma 37:11, 29.

● E nweela ihe ụfọdụ Chineke mere ndị gosiri na ọ chọrọ ka ụwa dị otú o bu n’obi ka ọ dị na mbụ. E nweekwala ihe o mere iji mee ka ihe dịrị ndị mmadụ mma otú o buuru ha n’obi na mbụ.—Jọn 3:16.

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu gbasara Alaeze Chineke na otú ọ ga-esi eme ka ụwa a dị mma? Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị bipụtara magazin a, ga-eji obi ụtọ nyere gị aka. Mgbe ọzọ ha ga-abịa n’ụlọ gị, i nwere ike ịjụ ha ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a:

Gịnị bụ Alaeze Chineke?

Olee nsogbu ndị ọ ga-ewepụ?

Olee mgbe Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu ndị e nwere n’ụwa? Oleekwa otú ọ ga-esi eme ya?

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Gịnị mere na ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka ihe dị mma n’ụwa?​—Jeremaya 10:23.

● Olee otú Chineke sirila gosi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi?​—Jọn 3:16.

● Olee ihe Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee n’ụwa a? Oleekwa ihe ọ ga-emere ndị ga-ebi na ya?​—Abụ Ọma 37:11, 29.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Ndị ọchịchị hà ga-akwụsịli nsogbu ndị e nwere n’ụwa a, ka ò nwere onye ọzọ ga-akwụsị ha?