Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị

Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nkiru * sịrị: “Mgbe m nọ ụlọ akwụkwọ praịmarị, ụmụ akwụkwọ anyị anaghị eghe m ọnụ, ọ na-ewutekwa m. Mgbe m bara sekọndrị, m gbanwere ejiji m na àgwà m. Ma ihe na-ebenụ ka na-ebe. M malitere ime ihe ha chọrọ ka anyị wee bụrụ enyi.”

Ndị ọgbọ gị hà chọrọ ka i mewe ka ha? Isiokwu a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga na-eme.

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ọgbọ gị gwara gị mee, ị ga-adị ka oche a na-akwagharị akwagharị. Ekwela ka ọ bụrụ ndị ọzọ ga na-agwa gị ihe ị na-eme?—Ndị Rom 6:16.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ndị ọgbọ gị nwere ike ime ka ị kpawa àgwà ọjọọ.

“Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ebere kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịma na ihe ọ chọrọ ime dị njọ. Ma, ebe ọ bụ na ọ chọrọ ime ndị ọzọ obi ụtọ, ya emee ihe ahụ.”

Ọ bụghị naanị ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwere ike ime ka anyị mee ihe na-adịghị mma.

“Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.”—Ndị Rom 7:21.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Njideka kwuru, sị: “Oge ụfọdụ, nsogbu m na-esi m n’aka. Ihe ahụ ndị ọgbọ m kwuru na-abụ ihe m chọrọ ime, ha kwuzie ya, ya adị m ka ọ̀ bụ ihe dị mma.”

Obi kwesịrị ịdị gị ụtọ na ọ bụghị ndị ọzọ na-ekpebiri gị ihe ị na-eme.

“Nweenụ ezi akọ na uche.”—1 Pita 3:16.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nkechi kwuru, sị: “E nwere mgbe o siiri m ike ịma ihe m ga-eme ma ndị ọgbọ m nyewe m nsogbu. Ma ugbu a, ọnụ na-esizi m ike. O nweghị ihe na-eme obi ụtọ ka mmadụ ịma na o mere ihe ndị mma.”

 IHE I NWERE IKE IME

Ụmụ akwụkwọ ibe gị nyewe gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ, gbalịa mee ihe ndị a na-esonụ:

Chee banyere nsogbu ọ ga-akpata. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ga-eme ma m mee ihe a e jide m? Olee otú obi ga-adị mama m na papa m? Oleekwa otú obi ga-adị mụnwa?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Galeshia 6:7.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chinyere sịrị: “Mama m na papa m na-ajụ m, sị, ‘Gịnị nwere ike ime gị ma i mee ihe ahụ?’ Ha nyeere m aka ịhụ na ime ihe ndị ọzọ chọrọ nwere ike ịkpatara m nsogbu echi.”

Obi sie gị ike. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe mere m ji kweta na ihe a ga-akpatara m nsogbu, kpatakwara ndị ọzọ?’ —Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Hibru 5:14.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ugomma sịrị: “Mgbe m dị obere, anaghị m ekwuli ihe mere m ji jụ ime ihe ndị ọgbọ m chọrọ. Ma ugbu a, m na-akọwara ha ihe m ji mee ihe m mere ma ọ bụ jụ ime ihe ha chọrọ. Ama m ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Ọ bụghị ndị ọzọ na-agwa m ihe m na-eme.”

Cheta onye ị bụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ụdị onye m chọrọ ịbụ?’ Chee banyere ihe ahụ a chọrọ ka i mee. Jụzie onwe gị, sị, ‘Gịnị ka onye ahụ ga-eme ma a sị ya mee ihe a?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 2 Ndị Kọrịnt 13:5.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Amara sịrị: “M ma na otú m si akpa àgwà dị mma. Achọghị m ịma ihe ndị ọzọ na-ekwu gbasara ya. Obi na-adị ọtụtụ ndị ụtọ ma mụ na ha nọrọ.”

Cheta echi. Ọ bụrụ na ị na-aga akwụkwọ ugbu a, n’ọnwa ole na ole ma ọ bụ afọ ole na ole, e nwere ike ị gaghịzi na-ahụ ndị ahụ chọrọ ka ị na-eme ihe dị ha mma.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chiọma sịrị: “M lere foto anyị sere n’ụlọ akwụkwọ, enweghịzi m ike icheta aha ụfọdụ ụmụ klas anyị. Ma, mgbe anyị na-aga akwụkwọ, m na-agba mbọ ime ihe ha chọrọ. N’eziokwu, ọ baghị uru mmadụ ime ihe na-adịghị mma ka o wee mee ndị ọzọ obi ụtọ.”

Jikere ejikere. Baịbụl sịrị: ‘Mara otú i kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.’Ndị Kọlọsi 4:6.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ijeọma sịrị: “Mama m na papa m nyeere mụ na nwanne m aka iche ụdị ihe ụmụ akwụkwọ anyị nwere ike ikwu. Ha emezie ka hà bụ ụmụ akwụkwọ anyị, kwuo ihe ahụ, anyị azaa ha otú anyị ga-esi aza ya ụmụ akwụkwọ anyị. Ime otú a na-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ma ndị ọgbọ anyị nyewe anyị nsogbu.”

^ para. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.