Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 È KERE YA EKE?

Otú Igurube Si Amata Na Ihe Nọ Ya Nso

Otú Igurube Si Amata Na Ihe Nọ Ya Nso

Ị MANỤ na igurube na-aga n’ìgwè, ha na-ehi ezigbo nne ma ha na-aga. Ebe ọ bụla ha gafetara, ha ekpuchie urukpuru ma ọ bụ ihu ígwé. N’agbanyeghị na ha na-aga n’ìgwè, ha anaghị akụkọta. Gịnị na-enyere ha aka ka ha ghara ịna-akụ ibe ha?

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: O nwere ihe dị n’azụ anya igurube ọ bụla. Ihe ahụ na-enyere ya aka ịma mgbe ihe ọ bụla bịara ya nso. Mgbe ọ bụla o yiri ka è nwere ihe dị ya nso ga-akụ ya, ihe ahụ dị n’azụ anya ya ga-agwa ụbụrụ ya ozugbo, ya efepụ n’otu ntabi anya.

Ndị ọkà mmụta sayensị ejirila ihe ha mụtara n’anya igurube nakwa n’ihe ahụ dị n’azụ anya ya mepụta rọbọt ga-eji aka ya mara mgbe ihe ọ bụla bịawara ya nso, zerekwa ya. Ndị na-arụ ụgbọala jikwa ihe ha mụtara n’igurube na-emepụta ihe ha ga-etinye n’ụgbọala nke ga-eme ka ụgbọala kwụsị ozugbo ma e nwee ụgbọala ọzọ chọrọ ịkụ ya. Otu ọkachamara aha ya bụ Shigang Yue kwuru na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’igurube efu.

Gịnị ka i chere? Ì chere na ihe a dị n’azụ anya igurube nọkatara dịrị, ka è nwere onye kere ya?