Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịdị Ọcha

Ịdị Ọcha

Chineke ọ̀ chọrọ ka anyị na-adị ọcha?

“Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.”—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị nwee ogologo ndụ na ahụ́ isi ike. O kwuru, sị: “Ka obi gị debekwa ihe m nyere n’iwu, n’ihi na ogologo ndụ na ọtụtụ afọ ndụ na udo ka a ga-atụkwasịrị gị.” (Ilu 3:1, 2) Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ kwuru otú ha ga-esi na-edebe onwe ha na ebe ha bi ọcha. (Diuterọnọmi 23:12-14) Mgbe ha debere iwu ndị ahụ, ahụ́ siri ha ike, ha arịaghịkwa ọrịa ọjọọ mba ndị dị ka Ijipt bụ́ ndị na-anaghị edebe iwu ndị ahụ na-arịa.—Diuterọnọmi 7:12, 15.

Taakwa, ndị sachapụrụ onwe ha mmerụ niile nke anụ ahụ́ dị ka ise sịga, ịṅụ oké mmanya, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ anaghị arịa ọtụtụ ọrịa. Ha anaghịkwa anwụchu ọnwụ. Ebe ọ bụkwa na anyị na mmadụ ibe anyị na-ebikọ, na-emekọkwa ihe, ọ bụrụ na anyị na-adị ọcha otú Chineke kwuru, ọ ga-egosi na anyị hụrụ mmadụ ibe anyị n’anya.—Mak 12:30, 31.

Otú anyị si akpa àgwà na otú anyị si efe ofufe ọ̀ gbasara Chineke?

“Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị. Ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ ka ọnụma Chineke ji abịa.”—Ndị Kọlọsi 3:5, 6.

IHE BAỊBỤL KWURU

Dị ka anyị kwuburu, Baịbụl gwara anyị ka anyị “sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.” N’oge Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọtụtụ ndị gbara mbọ ka ha na-adị ọcha n’elu ahụ́, ma ha leghaara àgwà ha na otú ha si efe ofufe anya. (Mak 7:1-5) Ma, Jizọs gwara ha, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla si n’ebe ọzọ banye n’ime mmadụ nke pụrụ imerụ ya, ebe ọ bụ na ọ na-abanye . . . n’eriri afọ ya, o wee pụọ banye n’ime olulu nsị. . . . Ọ bụ ihe na-esi n’ime mmadụ apụta na-emerụ mmadụ; n’ihi na ọ bụ n’ime mmadụ, n’obi ụmụ mmadụ, ka echiche ọjọọ dị iche iche si apụta: ịkwa iko, izu ohi, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, inwe anyaukwu, ajọ omume, aghụghọ, omume rụrụ arụ, anyaụfụ, . . . enweghị ezi uche. Ihe ọjọọ ndị a niile na-esi n’ime apụta, ha na-emerụkwa mmadụ.”—Mak 7:18-23.

Ihe a Jizọs kwuru pụtara na ọ bụrụ na mmadụ na-edewe elu ahụ́ ya ọcha ma na-eleghara otú o si efe ofufe na iwu Chineke nyere gbasara àgwà anyị anya, onye ahụ dị ka iko azụ ya dị ọcha ma ihe jupụtara n’ime ya bụ unyi unyi.—Matiu 23:25, 26.

Iwu ndị dị na Baịbụl hà siri oké ike?

“Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 Jọn 5:3.

IHE BAỊBỤL KWURU

Maịka isi isii amaokwu asatọ kwuru, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” Ihe a Chineke sị anyị na-eme esighị oké ike. Ọ chọkwara ka ihe mere anyị ga-eji na-erubere ya isi bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị mee otú ahụ, obi ga na-atọ anyị ụtọ. (Abụ Ọma 40:8) Ọ bụrụkwanụ na anyị emehie, obi siri anyị ike na ọ ga-emere anyị ebere n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá” ma ọ bụ na anyị ezughị okè.—Abụ Ọma 103:13, 14.

Ná nchịkọta, iwu Chineke nyere anyị banyere ịdị ọcha, ịkpa àgwà dị mma, na ife ya ofufe otú ọ chọrọ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere ya isi, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na anyị ma ihe.