Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ỤWA A NSOGBU JURU

1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike

1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Nsogbu ma ọ bụ ọdachi na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche. O nwedịrị ike ime ka ụfọdụ ndị rịawa ọrịa.

  • Nsogbu na-eme ka obi jọọ ndị mmadụ njọ. Ọ bụrụkwa na nsogbu ekweghị ala ala, o nwere ike ịkpatara ndị mmadụ ọrịa.

  • Ọdachi nwere ike ime ka o siere ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ike inyere ndị mmadụ aka, meekwa ka ọgwụ kọọ ụkọ.

  • Ọdachi na-eme ka ego kọ ndị mmadụ, mee ka ha ghara ịkwụli ụgwọ ihe ndị dị ha mkpa, dị ka ezigbo nri ma ọ bụ ọgwụ.

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Ọ bụrụ na ọrịa arịasiwe gị ike, gị ana-echegbukwa onwe gị, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-echezi echiche echezi. Ihe a nwekwara ike ime ka ị ghara ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ sie gị ike, ọrịa gị akazie njọ.

  • Ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ihe i mere ma ọrịa rịawa gị, nke ka njọ nwedịrị ike ime.

  • Ọ bụrụ na ahụ́ siri gị ike, isi ga-akpakọ gị ọnụ ịma ihe i kwesịrị ime ma nsogbu bịa.

  • Ma ì nwere ego ma ị̀ dara ogbenye, e nwere ihe ndị i kwesịrị ịna-eme ka ahụ́ sie gị ike.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Onye ma ihe na-echebara ihe ndị nwere ike ịkpata nsogbu echiche, meekwa ihe ka o zere ha mgbe ọ bụla o kwere omume. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ime ma a bịa n’ihe ndị ga-eme ka ahụ́ sie anyị ike. Ọ bụrụ na ị na-edowe onwe gị na ụlọ gị ọcha, o nwere ike ị gaghị ebute ọrịa. I butegodị ya, o nwere ike ọ gaghị akpa gị aka ọjọọ. Mgbochi ọrịa dị mma karịa ọgwụgwọ ya.

“Ọ bụrụ na anyị ana-adị ọcha, na-emekwa ka ụlọ anyị na-adị ọcha, anyị agaghị na-echu ụlọ ọgwụ ka mmiri, anyị agaghịkwa na-emefusị ego n’ịzụ ọgwụ.”​—Andreas. *

^ Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị na magazin a abụghị ezigbo aha ha.