Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Dị Iche na Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Ahụ́ na Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Afọ?

Olee Ihe Dị Iche na Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Ahụ́ na Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Afọ?

Emily kwuru ihe mere ya otu ụbọchị ọ na-eri nri. Ọ sịrị: “Ike gwụwara m, ọnụ akọwa m ọkọ, ire m ekowe. Ajụ buwere m, iku ume ana-esiri m ike. Ka a na-ekwu, ọkọ aghawa m ma n’aka ma n’olu. Agbalịrị m ka m ghara ịtụ ụjọ. Ma, o doziri m anya na m kwesịrị ịgawa ụlọ ọgwụ ozugbo.”

ỌTỤTỤ ndị nwere ike iri ihe ọ bụla a na-eri eri. Ma, e nwere ndị ahụ́ ha na-anaghị anabata nri ụfọdụ. Ụdị ndị a dị ka Emily anyị kọrọ akụkọ ya ná mmalite. Nsogbu ahụ́ Emily na-enye ya ma o rie ihe ụfọdụ adịghị obere. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ahụ́ na-akpaghasịru ọtụtụ ndị ọzọ ahụ́ ha na-ahọ nri.

Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, a na-anụkwu gbasara ọtụtụ ndị ahụ́ ha na-ekweghị anabata ihe ụfọdụ. Ma, nchọpụta ụfọdụ e mere na-egosi na ọ ka bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ka a chọpụtara na ahụ́ ha na-ahọ nri n’eziokwu.

Gịnị Ka Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Ahụ́ Pụtara?

Mgbe ndị ọkachamara ụfọdụ mechara nchọnchọ dị iche iche, ha kwuru n’otu akwụkwọ a na-ebipụta n’Amerịka gbasara ahụ́ ike na e nwere ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi akọwa ihe nri adịghị mmadụ mma n’ahụ́ pụtara. Ma, ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụ ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ na-eme ka ahụ́ mmadụ ghara ịnabata nri ụfọdụ.

Ihe mere na nri ụfọdụ anaghị adị ụfọdụ ndị mma n’ahụ́ bụ na ahụ́ ha anabataghị protin dị ná nri ahụ. Ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ dị́ n’ahụ́ mmadụ na-ewere ya na protin ahụ ga-emerụ onye ahụ ahụ́. Ọ na-abụ onye ahụ rie ihe protin ahụ dị, ahụ́ ya emepụta ihe ga-alụso protin ahụ ọgụ. O rie ihe ahụ ọzọ, ihe ndị ahụ na-alụso protin ahụ ọgụ na-emepụta kemikal dị iche iche.

Otu n’ime kemikal ndị ahụ na-enye aka alụso ọrịa ọgụ. Ma, a ghọtabeghị ihe mere o ji bụrụ na ọ bụ otu kemikal ahụ na-akpaghasị ụfọdụ ndị ahụ́ n’ihi protin dị́ na nri ha riri.

Ọ bụ ihe a mere ọ na-eji abụ nri ahụ́ mmadụ nabatara taa, ya rie ya echi, ahụ́ ya nwere ike ghara ịnabata ya.

Gịnị Ka Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Afọ Pụtara?

E kwuo na nri adịghị mmadụ mma n’afọ, ọ pụtara na nri onye ahụ riri nyere ya nsogbu n’afọ. O yitụrụ ụdị nsogbu nke ahụ anyị ka kwupụrụ gbasara ya. Ma, ihe dị iche bụ na nri inye mmadụ nsogbu n’afọ agbasaghị ihe ndị ahụ na-alụso ọrịa ọgụ dị mmadụ n’ahụ́. Kama, ihe na-akpata ya bụ mgbe ihe mmadụ riri na-ekweghị agbari ngwa ngwa. Ihe na-emekwanụ ka nri mmadụ riri ghara ịgbari ngwa ngwa bụ ma ọ bụrụ na ihe ndị na-agbari nri mmadụ riri adịchaghị onye ahụ n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na kemikal dị́ n’ihe ahụ o riri ekweghị agbari. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe na-agbari ụdị shuga na-adị ná mmiri ara ehi adịchaghị mmadụ n’ahụ́, afọ ga-enye onye ahụ nsogbu ma ọ ṅụọ mmiri ara ehi.

Ebe ọ bụ na ọ bụghị ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ na-eme ka nri ghara ịdị mmadụ mma n’afọ, ọ pụtara na nri nwere ike inyewe mmadụ nsogbu n’afọ ozugbo o riri ya. Otú ihe mmadụ riri hà nwere ike ime ka ihe ahụ nye ya nsogbu n’afọ ma ọ bụ ghara inye ya nsogbu. Onye ahụ nwere ike rie ihe buru ibu, ya enye ya nsogbu, ma, o rie ihe ahụ nke na-ebughị ibu, afọ ya anabata ya. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ naanị obere ihe na-agaghị adị mmadụ mma n’ahụ́ ka o riri, ọ ga-enye ya ezigbo nsogbu.

Olee Otú E Si Amata Ha?

Ihe ndị nwere ike ime mmadụ ma o rie ihe na-adịghị ya mma n’ahụ́ bụ: ọkọ; akpịrị ọzịza, anya ọzịza, ire ọzịza; agbọ; afọ ọsịsa; ọ bụrụ na ọ ka njọ, ike ga na-agwụ onye ahụ, ọbara nwere ike ghara ịna-agazu nke ọma n’ahụ́ ya, onye ahụ nwekwara ike ịtụbọ, obi ya akụchie. Nsogbu a nwere ike ịka njọ ma ọ bụrụ na e meghị ihe ngwa ngwa.

Ụdị nri ọ bụla nwere ike ịkpaghasị mmadụ ahụ́. Ma, o nwere ndị nke na-enyekarị ezigbo nsogbu n’ahụ́ ma ọ bụrụ na ha adịghị mmadụ mma n’ahụ́. Ha bụ: mmiri ara ehi, àkwá, azụ̀, oporo, ahụekere, soyabins, akị mkpụrụ osisi, na wit. Ọ bụghị afọ ole mmadụ dị na-ekpebi ma nri ọ̀ ga-adị ya mma n’ahụ́ ma ọ̀ bụ na ọ gaghị adị ya. Ihe ndị a chọpụtarala na-egosi na mmadụ nwere ike inwe nsogbu a ma ọ bụrụ na nne ya ma ọ bụ nna ya nwere ụdị nsogbu a ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ma nne ya ma nna ya nwere nsogbu ahụ. Nri na-anabughị adị nwatakịrị mma n’ahụ́ nwere ike ịmalite dịwa ya mma n’ahụ́ ma o too.

Ihe ndị na-eme mmadụ ma o rie ihe na-adịghị ya mma n’afọ bụ: afọ ọrụrụ, afọ ọzịza, ịnyụ ahụ, isi ọwụwa, ọkọ, ike ọgwụgwụ, ma ọ bụ ahụ́ niile ịkụrisị onye ahụ. Ha anaghị ajọru njọ ka nke na-eme mmadụ ma ahụ́ ya anabataghị ihe o riri. E nwere ọtụtụ nri na-anaghị adị ndị mmadụ mma n’afọ. Ndị nke na-akpatakarị ya bụ ihe ndị e si ná mmiri ara ehi mepụta, wit, mmanya, na yist.

Otú E Si Agwọ Ha

Ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị na i nwere ike inwe ụdị nsogbu abụọ a anyị kwuru okwu ha, i nwere ike ịga hụ dọkịta. Mmadụ ekwesịghị iji aka ya kpebie na ya agaghị eri nke a ma ọ bụ nke ọzọ n’ihi na ime otú ahụ nwere ike ime ka onye ahụ ghara iri ihe ndị ahụ́ ya chọrọ.

Otú kacha mma a chọpụtara mmadụ ga-esi egbochi nsogbu nri na-enye ya n’ahụ́ bụ izere nri ahụ. * Ọ bụrụkwanụ na nri na-enye mmadụ nsogbu n’afọ mgbe ụfọdụ, onye ahụ nwere ike ghara ịna-eri ihe ahụ mgbe mgbe, ya chọọkwanụ iri ya, ya erie ya obere. O nwekwara ike ịkara onye nri ahụ na-enye nnukwu nsogbu n’afọ mma ka ọ ghara ịna-emetụ ya ọnụ.

N’ihi ya, ọ bụrụ na ahụ́ gị anaghị anabata nri ụfọdụ ma ọ bụ na nri ụfọdụ na-enye gị nsogbu n’afọ ma i rie ha, obi alọla gị mmiri. O nwere ndị ụdị ihe ahụ na-eme, ma ha ka na-erikwa nri ndị na-amasị ha, ndị na-edozikwa ha ahụ́.

^ para. 19 O nwere ike ịdị mma ka onye ọ bụla ahụ́ ya na-anaghị anabata nri ụfọdụ jiri ọgwụ ọ ga-aṅụ, a naghị ama ama ya erie nri na-adịghị ya mma n’ahụ́. Ndị dọkịta ụfọdụ na-atụrụ ndị nne na nna aro ka ụmụ ha na-eji ma ọ bụ na-eyi ihe ọ ga-abụ onye nkụzi ha ma ọ bụ onye na-elekọta ha hụ, ya amata na e nwere nri ndị na-anaghị adị nwa ahụ mma n’ahụ́.