TETA! Nke 6 n'Afọ 2016 | Ihe Anyị Ga-eme Ka Anyị Ghara Ịna-ebutekarị Ọrịa

Ọrịa ndị na-apụta ọhụrụ na ndị nke laranụ mechaa bịaghachi nwere ike ịkpatara gị ezigbo nsogbu. Olee ihe i nwere ike ime iji ghara ibute ha?

ISIOKWU TETA! A

Ihe Anyị Ga-eme Ka Anyị Ghara Ịna-ebutekarị Ọrịa

Kwa ụbọchị, ahụ́ anyị na-alụso ọtụtụ ndị iro ọgụ. Ndị iro a anaghị eme mkpọtụ, a naghịkwanụ ahụ ha anya, ma ha nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ.

ISIOKWU TETA! A

Otú Ị Ga-esi Zere Ihe Ndị Na-akpata Ọrịa

Gụọ ihe a ka ị mata ihe ise nwere ike ime ka i bute ọrịa nakwa ihe ị ga-eme iji chebe onwe gị.

È KERE YA EKE?

Eriri Ndị Na-esi n’Ahụ́ Akịrịkọ Apụta

Akịrịkọ na-eji eriri ndị na-esi ya n’ahụ́ apụta anyapagide onwe ya n’ihe. Ịmata otú eriri ahụ si anyapagide n’ihe ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata otú a ga-esi nyapagide ihe n’ụlọ, ma ọ bụ rụpụta ihe e ji anyapagide akwara n’ọkpụkpụ.

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

N’alumdi na nwunye, nkwanye ùgwù abụghị ihe a na-eme mgbe ọ dabara, kama ọ bụ ihe e kwesịrị ịna-eme mgbe niile. Olee otú ị ga-esi na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù?

IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE

Desiderius Erasmus

A kpọrọ ya “Ọkà mmụta nke oge gboo e nwere ike iji tụnyere ndị a ma ama n’ụwa n’oge a.” Gịnị mere o ji bụrụ ọkà mmụta a ma ama n’ụwa?

Azụ̀ Clown Dị́ Ịtụnanya

Otú obere azụ̀ a nwere àgwà mara mma n’ahụ́ ya na anemone si emekọrịta dị ezigbo ịtụnanya. Olee otú ha si na-emekọrịta, gịnị mere mmekọrịta ha ji pụọ iche?

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịbịa Ihe n’Oge

Ịbịa ihe n’oge ma ọ bụ abịaghị ihe n’oge nwere ike imetụta otú e si ele mmadụ anya. Gịnị ka Baịbụl kwuru maka ịbịa ihe n’oge? Olee otú ị ga-esi mụta ịna-abịa ihe n’oge?

Isiokwu Ndị E Bipụtara na Teta! n’Afọ 2016

Ebe e depụtara isiokwu ndị gbara na Teta! Ndị e bipụtara n’afọ 2016.

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Na-adị Ọcha

Jehova dị ọcha. Mụtakwa otú gịnwa ga-esi na-adị ọcha.

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?

Otú ihe isii a na-eme n’oge Krismas si bido nwere ike iju gị anya.