ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jun 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Julaị 31 ruo Ọgọst 27, 2017.

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a si na Baịbụl.

Jehova Na-akasi Anyị Obi ná Mkpagbu Anyị Niile

Olee ụfọdụ nsogbu Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye na ndị nwere ezinụlọ na-enwe? Ụdị nsogbu ahụ bịara gị, olee otú Chineke ga-esi kasie gị obi?

Ka Obi Gị Dịrị n’Akụ̀ Bara Ezigbo Uru

Olee akụ̀ anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe, oleekwa otú anyị ga-esi jiri ya kpọrọ ihe?

Ì Nwere Ike Hapụ Ile Naanị Otú Mmadụ Dị?

Otu nwoke na-akparị ndị mmadụ, na-anọrọkwa onwe ya. O nweghịkwa ebe o bi. Ma, gịnị mere mgbe Onyeàmà Jehova ziri ya ozi ọma?

Ị̀ Ga-edozi Esemokwu, Meekwa Ka Udo Dị?

Ndị mmadụ na-achọsi udo ike. Ma ọtụtụ nwere ike kpawa àgwà ga-eme ka udo ghara ịdị ma ha chee na a kparịrị ha. Olee otú ị ga-esi gbaara àgwà ahụ ọsọ?

“Ka Ezi Uche Gị Bụrụ Ihe A Gọziri Agọzi”

Ọ bụ Devid, bụ́ onye Izrel oge ochie, kwuru ihe a iji jaa otu nwaanyị ọ hụrụ mma. Gịnị mere Devid ji jaa ya mma? Olee otú ihe nwaanyị ahụ mere ga-esi baara anyị uru?

Lekwasị Anya n’Ihe Dị Ezigbo Mkpa

Olee ihe dị ezigbo mkpa mmadụ niile kwesịrị iburu n’obi? Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mata ya?

Na-akwado Ọchịchị Jehova

Olee uru ọ ga-abara gị ma ị na-ebi ndụ otú ga-egosi na ị ghọtara na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere Jizọs ji kwuo na ndị na-ere anụmanụ n’ụlọ nsọ bụ “ndị na-apụnara mmadụ ihe”?