Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Na-egosi na Amụma Baịbụl Bụ Eziokwu

Ihe Na-egosi na Amụma Baịbụl Bụ Eziokwu

NA ROM DỊ N’ỊTALI, E NWERE OTU OGIDI NDỊ SI EBE DỊ ICHE ICHE N’ỤWA NA-ABỊA ELE. A RỤRỤ OGIDI AHỤ IJI KWANYERE OTU N’IME NDỊ EZE ROM AHA YA BỤ TAỊTỌS ÙGWÙ.

Ogidi Taịtọs nwere ihe abụọ buru ibu a kpụrụ na ya na-egosi otu ihe wuru ewu mere n’oge ochie. Ma, ọtụtụ ndị amaghị na o nwere ihe jikọrọ ogidi a na amụma e buru na Baịbụl. Ogidi Taịtọs na-egosi na amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu otú ahụ e si buo ha.

OBODO A MARA IKPE

N’oge Jizọs, malite na Briten na ebe a na-akpọ Frans ugbu a ruo n’Ijipt socha n’ebe ndị Rom na-achị. Ihe nọkwa na-aga nke ọma n’obodo ndị ahụ otú ọ na-agatụbeghị na mbụ. Ma, e nwere otu obodo na-emere ndị Rom isi ike. Obodo ahụ bụ Judia.

Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Ancient Rome kwuru, sị: “N’ime obodo niile ndị Rom na-achị, o nweghị nke ha kpọrọ ụdị asị ha kpọrọ Judia, o nweghịkwa nke kpọrọ ha ụdị asị Judia kpọrọ ha. Ndị Juu kpọrọ ndị Rom asị n’ihi na e nweghị ihe ha ji omenala ndị Juu kpọrọ, ndị Rom ana-emekpọ ndị Juu ọnụ n’ihi na ndị Juu na-akpọ ekwe nkụ.” Ọtụtụ ndị Juu nọ na-atụ anya ka e nwee onye ọchịchị ga-abịa napụta ha n’aka ndị Rom ma mee ka Izrel dịghachi otú ọ dị na mbụ. Ma n’afọ 33, Jizọs Kraịst kwuru na ọdachi ga-adakwasị Jeruselem.

Jizọs kwuru, sị: “Ụbọchị ga-abịakwasị gị mgbe ndị iro gị ga-eji osisi pịrị ọnụ wuo ogige gburugburu gị, ha ga-agbakwa gị gburugburu ma si n’akụkụ niile na-enye gị nsogbu. Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala, ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ime gị.”Luk 19:43, 44.

Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs kwuru juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Mgbe abalị abụọ gachara, ha hụrụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem otu onye n’ime ha ekwuo, sị: “Onye Ozizi, ị̀ hụkwara ụdị nkume ndị a na ụdị ụlọ ndị a?” E kwuru na ụfọdụ nkume e ji rụọ ụlọ nsọ ahụ karịrị mita iri na otu (amaụkwụ iri atọ na isii) nʼogologo, mita ise (amaụkwụ iri na isii) ná mbara, nakwa mita atọ (amaụkwụ iri) n’ịdị elu. Ma, Jizọs zara ha, sị: “Ihe ndị a unu na-ahụ, ụbọchị ga-abịa mgbe a na-agaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ebe a n’akwatughị ya.”Mak 13:1; Luk 21:6.

Jizọs gwakwara ha, sị: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) Ihe a Jizọs kwuru ò mezuru?

MBIBI JERUSELEM

Afọ iri atọ na atọ agaala, ma obi adịghị ndị Judia mma na ha ka nọ n’okpuru ọchịchị ndị Rom. Ma n’afọ 66, onye Rom na-achị Judia aha ya bụ Geshịọs Flọrus wekọọrọ ego dị n’igbe dị n’ụlọ nsọ. Ihe a mere ka ezigbo iwe wee ndị Judia nke na ha enweghịzi ike idi ya. O gbughị oge, ndị Juu nuuru bata na Jeruselem, gbuo ndị agha Rom na-eche nche ebe ahụ ma kwuo na ha enwerela onwe ha.

Ọnwa atọ ihe a mechara, ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Sestiọs Galọs duuru ndị agha karịrị puku iri atọ bịa ibibi Jeruselem. Ha batara Jeruselem ozugbo kwatuo mgbidi ụlọ nsọ. Ma, ha lawara n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Obi tọrọ ndị Juu ahụ ezigbo ụtọ, ha amalite chụwa ha ozugbo. Ka ndị Juu ahụ chụụrụ ndị agha Rom gawa, Ndị Kraịst si na Jeruselem pụọ ma gbaga n’ugwu dị ma a gafee Osimiri Jọdan, otú Jizọs gwara ha mee.—Matiu 24:15, 16.

N’afọ ọzọ ya, ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Vespeshian na nwa ya aha ya bụ Taịtọs duuru ndị agha Rom, ha amalitekwa ibuso Judia agha. Ma, obere oge Eze Ukwu Niro nwụrụ n’afọ 68, Vespeshian hapụrụ nwa ya bụ́ Taịtọs na ndị agha dị puku iri isii na Judia lọghachi Rom ka ọ bụrụ eze.

N’ọnwa Jun afọ 70, Taịtọs gwara ndị agha ya ka ha gbutuo osisi ndị dị na Judia. Ha pịrị osisi ndị ahụ ọnụ, jiri ha rụọ mgbidi dị kilomita asaa n’ogologo gburugburu Jeruselem. Ka ọ na-erula n’ọnwa Septemba, ndị Rom ebukọrọla ihe niile dị n’obodo ahụ ma gbaa ma obodo ahụ ma ụlọ nsọ ya ọkụ. Okwute e ji rụọ ha dakasịkwara otú ahụ Jizọs kwuru. (Luk 19:43, 44) E kwuru na ọ fọrọ obere ka “ndị nwụrụ na Jeruselem na n’ebe ndị ọzọ na Judia ruo narị puku ise.”

EMEMME MAKA OKÉ MMERI

N’afọ 71, Taịtọs lọghachiri Ịtali, ụmụ amaala Rom ejiri ezigbo obi ụtọ nabata ya. Obodo ahụ niile mere ememme maka mmeri a. Ememme ahụ bụ otu n’ime ememme kachanụ e metụrụla n’isi obodo Rom bụ́ Ịtali maka mmeri ndị ha nwetara.

O nyeghị ndị mmadụ ọnụ okwu mgbe ha hụrụ ihe ndị e bu na-agagharị n’obodo Rom. Obi dị ha ụtọ ka ha nọ na-ele ụgbọ mmiri ndị a kwatara n’agha, ihe ndị a kpụrụ akpụ na ihe ndị e sere ese na-egosi otú e si lụọ agha ahụ, na ihe ndị ha kwatara n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem.

N’afọ 79, Taịtọs nọchiri nna ya bụ́ Vespeshian. Ma, mgbe afọ abụọ gachara, Taịtọs nwụrụ na mberede. Mgbe ọ nwụrụ, nwanne ya nwoke aha ya bụ Dọmịshian nọchiri ya ma wuo ogidi ozugbo iji kwanyere Taịtọs ùgwù maka mmeri ya.

OGIDI AHỤ TAA

Otú Ogidi Taịtọs dị na Rom taa

Taa, ọtụtụ ndị na-aga ilegharị anya na Rom na-enwe mmasị ịhụ Ogidi Taịtọs. Ụfọdụ na-ele ya anya ka naanị ihe a kpụrụ akpụ mara ezigbo mma, ndị ọzọ ana-ele ya anya ka ihe e ji echeta ọchịchị ndị Rom. E nwekwara ndị weere ya ka ihe e ji echeta mbibi e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya.

Ma, ndị na-amụ Baịbụl nke ọma ma na e nwere ihe dị ezigbo mkpa Ogidi Taịtọs ahụ na-egosi. Ọ na-egosi na amụma ndị dị na Baịbụl bụ eziokwu, nakwa na e kwesịrị ịtụkwasị ha obi. O na-egosikwa na amụma ndị ahụ dị na Baịbụl si n’aka Chineke.—2 Pita 1:19-21.