Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 3 n'Afọ 2018 | Ihe Banyere Gị Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?

IHE BANYERE GỊ Ọ̀ NA-EMETỤ CHINEKE N’OBI?

E nwee ọdachi ma ọ bụ anyị hụ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma na-anwụ, anyị nwere ike ịna-eche ma Chineke ọ̀ na-ahụkwa ihe na-eme, ma ọ bụkwanụ ma ihe na-eme ọ̀ na-emetụ ya n’obi. Baịbụl kwuru, sị::

“N’ihi na anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike; ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 3:12.

Ụlọ Nche a na-egosi otú Chineke si enyere anyị aka na ihe ọ na-eme iji kwụsị ahụhụ niile anyị na-ata.

 

“Olee Ebe Chineke Nọ Mgbe Ihe A Na-eme?”

Ò nweela ọdachi dakwasịrị gị, gị ajụọ ma ihe banyere gị ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

Chineke Ọ̀ Ma na Ị Nọ?

Olee ihe ndị na-egosi na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi?

Chineke Ọ̀ Na-aghọta Gị?

Ebe ọ bụ na Chineke maara anyị nke ọma, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-aghọta ihe niile gbasara anyị.

Chineke Ọ̀ Na-emetere Anyị Ebere?

Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Chineke ma na anyị nọ, ọ na-aghọta anyị, ọ na-emetekwara anyị ebere.

Chineke Ọ̀ Na-eji Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Ata Anyị Ahụhụ?

Chineke ọ̀ na-eji ọrịa ma ọ bụ ọdachi ata ndị mmadụ ahụhụ maka mmehie ha?

Ònye Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?

Baịbụl kwuru ihe atọ na-eme ndị mmadụ ji ata ahụhụ.

Chineke Ga-eme Ka Ahụhụ Niile Kwụsị n’Oge Na-adịghị Anya

Olee otú anyị ga-esi mara na Chineke ga-eme ka ahụhụ na mmegbu niile kwụsị n’oge na-adịghị anya?

Uru Ịmata na Chineke Hụrụ Gị n’Anya Ga-abara Gị

Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere anyị maka ọdịnihu.

Olee Otú Obi Na-adị Chineke ma Ọ Hụ Ka Ị Na-ata Ahụhụ?

Amaokwu Baịbụl ndị a ga-enyere gị aka ịghọta otú obi na-adị Chineke ma ọ hụ ka ị na-ata ahụhụ.