Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Anyị Were Ihe Dị n’Akwụkwọ Nsọ Kọwaa Akwụkwọ Nsọ”

“Ka Anyị Were Ihe Dị n’Akwụkwọ Nsọ Kọwaa Akwụkwọ Nsọ”

“Ka Anyị Were Ihe Dị n’Akwụkwọ Nsọ Kọwaa Akwụkwọ Nsọ”

OTU nwoke tụtụtara otu traktị n’ala ụgbọ okporo ígwè na-aga New York City. Traktị ahụ kwuru na ‘mkpụrụ obi mmadụ na-anwụ anwụ.’ Ọ kpaliri mmasị nwoke ahụ bụ́ onye ụkọchukwu, ya amalitekwa ịgụ ya. O juru ya anya n’ihi na ọ dịtụbeghị mgbe o nwerela obi abụọ banyere ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. N’oge ahụ, ọ mabeghị onye dere traktị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ hụrụ na ezi uche dị n’ihe traktị ahụ kwuru, nakwa na o kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ ma hụ na e kwesịrị iji nlezianya mụọ traktị ahụ.

Onye ụkọchukwu ahụ bụ George Storrs. Ihe ahụ mere n’afọ 1837, n’otu afọ ahụ Charles Darwin dekọrọ ihe n’akwụkwọ o ji ede ihe na nke mbụ ya bụ́ ihe ndị o chere na ya ga-emecha jiri mee ihe n’ozizi evolushọn ya. Ọtụtụ mmadụ n’ụwa ka ji okpukpe kpọrọ ihe, ihe ka ọtụtụ kwekwara na Chineke. Ọtụtụ na-agụ Bible ma jiri okwu ya kpọrọ ihe.

Storrs mesịrị mata na ọ bụ Henry Grew onye Philadelphia, Pennsylvania, dere traktị ahụ. Grew kwenyesiri ike na “ebe kasị mma mmadụ ga-esi nweta nkọwa nke Akwụkwọ Nsọ . . . bụ n’Akwụkwọ Nsọ.” Grew na ndị ya na ha kweere otu ihe na-amụ Bible iji mee ka ndụ ha na ihe ndị ha na-eme kwekọọ na ndụmọdụ dị n’ime ya. Ihe ndị ha na-amụ kpugheere ha eziokwu ndị magburu onwe ha dị n’Akwụkwọ Nsọ.

N’ihi otú ihe odide Grew si kpalie Storrs, o jiri nlezianya nyochaa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere mkpụrụ obi ma soro ụfọdụ ndị ụkọchukwu ibe ya tụlee ya. Ka Storrs jisiri afọ ise mụsie ihe ike, o kpebiziri ime ka ndị mmadụ mata eziokwu a dị oké ọnụ ahịa ọ chọtara ọhụrụ n’Akwụkwọ Nsọ. Ihe mbụ o mere bụ ịkwado okwuchukwu ọ ga-ekwu n’otu ụbọchị Sunday n’afọ 1842. Otú ọ dị, o chere na ọ dị ya mkpa ikwu okwuchukwu ole na ole ọzọ iji mee ka eziokwu ahụ doo anya. N’ikpeazụ, okwuchukwu o kwuru banyere mkpụrụ obi ịnwụ anwụ bịara dị isii, o bipụtakwara ha n’akwụkwọ ọ kpọrọ Six Sermons. Storrs ji ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ kọwaa Akwụkwọ Nsọ iji kpughee eziokwu mara mma ndị e ji ozizi Krisendọm na-adịghị akwanyere Chineke ùgwù kpuchie.

Bible Ọ̀ Na-akụzi na Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ Anwụ?

Bible kwuru banyere ụmụazụ Jizọs e tere mmanụ iyikwasị anwụghị anwụ dị ka ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi ha. (1 Ndị Kọrint 15:50-56) Storrs kwuru na ọ bụrụ na anwụghị anwụ bụ ihe a ga-eji kwụọ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ, mkpụrụ obi nke ndị ajọ omume ga-anwụ anwụ. Kama ịkọwa nkọ, o nyochara Akwụkwọ Nsọ. Ọ tụlere Matiu 10:28, Bible Nsọ nke Union Version, nke na-ekwu, sị: “Na-atụnụ egwu Onye ahụ nke pụrụ ịla mkpụrụ obi na ahụ n’iyi n’ọkụ ala mmụọ.” Nke bụ́ na a pụrụ ibibi mkpụrụ obi ebibi. O kwukwara banyere Ezikiel 18:4, nke kwuru, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” Mgbe ọ tụlechara akụkụ nile nke Bible, eziokwu dị na ya bịara gbaa ka ọnwa. Storrs dere, sị: “Ya bụrụ na otú m si ghọta okwu a bụ otú ọ dị, ọ pụtara na ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mere ka ha ghara ido anya edoola anya, na-enye obi ụtọ, kwe nghọta ma na-akpali akpali.”

Ma olee banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị ka Jud 7? Ọ na-ekwu, sị: “Dị ka Sọdọm na Gọmọra, na obodo dị ha gburugburu, ebe ha raara onwe ha nye n’ịkwa iko n’ụzọ dị otú ndị a mere, wee pụọ soo anụ ahụ́ dị iche, e debewo ha n’ihu ọha mmadụ dị ka ihe ngosi, na-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, nke bụ́ ọkụ ebighị ebi.” (Bible Nsọ nke Union Version) Mgbe ụfọdụ ndị gụrụ amaokwu a, ha pụrụ ikwubi na a na-ata mkpụrụ obi nke ndị ahụ e bibiri na Sọdọm na Gọmọra ahụhụ n’ime ọkụ ruo mgbe ebighị ebi. Storrs dere, sị: “Ka anyị were ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ kọwaa Akwụkwọ Nsọ.” O hotaziri 2 Pita 2:5, 6, nke na-ekwu, sị: “O mereghị ụwa ochie ebere, kama ọ bụ Noa . . . ka O chere, mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke; O wee mee ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, werekwa ikpu ihu maa ha ikpe, ebe O mere ha rịị ka ha bụrụ ihe ilereanya nye ndị gaje ịbụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Ee, Sọdọm na Gọmọra ghọrọ ntụ, e bibiri ha na ndị bi n’ime ha ruo mgbe ebighị ebi.

Storrs kọwara, sị: “Pita mere ka anyị ghọtakwuo ihe Jud kwuru. Ha abụọ gosiri nnọọ otú Chineke si wesa ndị mmehie iwe. . . . Ikpe ahụ a mara ụwa oge ochie, bụ́ Sọdọm na Gọmọra, bụ ndụmọdụ, ịdọ aka ná ntị, ma ọ bụ ‘ihe atụ’ na-adịgide adịgide, ma ọ bụ ‘ihe atụ ebighị ebi’ nye mmadụ nile banyere ọgwụgwụ ụwa.” N’ihi ya, Jud kwuru na mbibi ahụ e ji ọkụ ahụ bibie Sọdọm na Gọmọra bụ mbibi ebighị ebi. Nke ahụ adịtụghị otú o si pụta na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ.

Storrs ejighị nanị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwadoro ihe ọ na-ekwu mee ihe ma leghara ndị ọzọ anya. Ọ tụlere amaokwu nke ọ bụla nakwa ihe akụkụ nile nke Bible na-ekwu. Ọ bụrụ na o yie ka otu amaokwu ọ̀ na-emegide akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ, Storrs ga-atụle Bible dum iji kọwaa ya n’ụzọ ziri ezi.

Otú Russell Si Mụọ Akwụkwọ Nsọ

Otu n’ime ndị ha na George Storrs so mụkọọ ihe bụ nwa okorobịa nke haziri òtù na-amụ Bible na Pittsburgh, Pennsylvania. Aha ya bụ Charles Taze Russell. N’afọ 1876, e bipụtara otu n’ime isiokwu mbụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ o dere na magazin bụ́ Bible Examiner, nke Storrs haziri. Russell kwetara na ya mụtara ihe n’aka ndị mmụta Bible bu ya ụzọ. Mgbe o mesịrị dewe Zion’s Watch Tower, obi tọrọ ya ụtọ na Storrs nyeere ya nnọọ aka site ma n’okwu ọnụ ma n’akwụkwọ ozi.

Mgbe C. T. Russell dị afọ 18, ọ haziri òtù ọmụmụ Bible ma wepụta otú a ga-esi na-amụ Bible. A. H. Macmillan, bụ́ onye mmụta Bible nke ya na Russell na-amụkọ ihe, kọwara otú ha si amụ ihe, sị: “Otu onye jụọ ajụjụ. Ha atụlee ya. Ha agụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile kwuru banyere ya, mgbe ha hụziri na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ ekwekọọla, ha ekwupụtazie ihe ha kwekọrịtara ma dee ya edee.”

Russell kwenyesiri ike na ọ bụrụ na a tụlee ihe akụkụ nile nke Bible kwuru, ihe ha na-ekwu aghaghị ikwekọ, kwekọọkwa n’àgwà nke Chineke, bụ́ Onye chepụtara ya. Mgbe ọ bụla e nwere akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke yiri ihe siri ike nghọta, Russell na-enwe obi ike na akụkụ Bible ndị ọzọ ga-eme ka o doo anya ma kọwaa ya.

Ọ Bụ Ihe Akwụkwọ Nsọ n’Onwe Ya Na-eme

Otú ọ dị, ọ bụghị Russell, Storrs ma ọ bụ Grew bụ ndị mbụ hapụrụ Akwụkwọ Nsọ ka ọ kọwaa onwe ya. Ọ malitere n’Onye Hiwere Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ Jizọs Kraịst. O jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche mee ka eziokwu nke dị n’otu akụkụ Bible doo anya. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Farisii katọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi ịghọ ọka n’Ụbọchị Izu Ike, Jizọs ji ihe dị na 1 Samuel 21:6 gosi otú e kwesịrị isi debe iwu Ụbọchị Izu Ike. Ndị ndú okpukpe ahụ maara akụkọ ahụ nke ọma, bụ́ mgbe Devid na ụmụ okorobịa ya riri achịcha a na-edebe n’ihu Jehova. Jizọs rụtụziri aka ebe Iwu ahụ kwuru na ọ bụ nanị ụmụ Erọn bụ́ ndị nchụàjà ga-eri achịcha e chere n’ihu Chineke. (Ọpụpụ 29:32, 33; Levitikọs 24:9) N’agbanyeghị nke ahụ, a gwara Devid ka o rie achịcha ahụ. Jizọs ji ihe dị n’akwụkwọ Hosea mechie arụmụka ya rijuru afọ, site n’ikwu, sị: “A sị na unu ghọtara ihe nke a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghịkwa àjà,’ unu agaraghị amawo ndị ikpe na-amaghị ikpe.” (Matiu 12:1-8) Lee nnọọ ihe nlereanya magburu onwe ya Jizọs setịpụrụ n’iji otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ tunyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ iji ghọta ya nke ọma!

Ụmụazụ Jizọs nọgidere na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche akọwa ọzọ. Mgbe Pọl onyeozi ziri ndị mmadụ ihe na Tesalonaịka, “o so ha tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ, na-akọwa ma na-anwapụta site n’izo aka n’ebe dị iche iche na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ na ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” (Ọrụ 17:2, 3) N’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere site n’ike mmụọ nsọ, ọ hapụkwara Bible ka ọ kọwaa onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe o degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi, o hotara ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ iji gosi na Iwu ahụ bụ onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.—Ndị Hibru 10:1-18.

Ee, ndị mmụta Bible nwere obi eziokwu e nwere na narị afọ nke 19 na ná mmalite nke narị afọ nke 20 maliteghachiri nnọọ ihe a Ndị Kraịst na-eme. A ka na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche akọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na magazin Ụlọ Nche. (2 Ndị Tesalonaịka 2:15) Ndịàmà Jehova na-esi otú a enyocha Akwụkwọ Nsọ.

Tụlee Ihe A Na-ekwu n’Ebe Ahụ

Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ezi ihe nlereanya nke Jizọs na ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi mgbe anyị na-agụ Bible? Nke mbụ, anyị pụrụ ịtụle ihe e kwuru tupu akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị na-atụle na ihe sochiri ya. Olee otú ihe e kwuru tupu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na ihe sochiri ya pụrụ isi nyere anyị aka ịghọta ihe ọ pụtara? Ka anyị were ihe Jizọs kwuru na Matiu 16:28 dị ka ihe atụ, bụ́ ebe o kwuru, sị: “N’ezie asị m unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” Ụfọdụ ndị pụrụ iche na okwu ndị a emezughị n’ihi na ndị nile na-eso ụzọ Jizọs nọ mgbe o kwuru okwu ahụ anwụchaala tupu e hiwe Alaeze Chineke n’eluigwe. Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible kwudịrị banyere amaokwu a, sị: “Amụma ahụ emezughị, ka oge na-agakwa, Ndị Kraịst bịara kwuo na ọ bụ ihe atụ.”

Otú ọ dị, ihe e kwuru tupu amaokwu a na ihe sochiri ya, nakwa ebe a kọrọ otu akụkọ ahụ na Mak na Luk, na-enyere anyị aka ịghọta ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ pụtara n’ezie. Gịnị ka Matiu kọrọ ozugbo o kwusịrị okwu ndị ahụ e hotara n’elu? O dere, sị: “Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jizọs kpọọrọ Pita na Jems na Jọn nwanne ya ma kpọgote ha n’ugwu dị oké elu nanị ha. E wee nwoghaa ya n’ihu anya ha.” (Matiu 17:1, 2) Ma Mak ma Luk jikọtachara okwu Jizọs banyere Alaeze ahụ na akụkọ banyere nnwogha ahụ. (Mak 9:1-8; Luk 9:27-36) E gosipụtara ọbịbịa Jizọs n’ike Alaeze ná nnwogha ya, mpụta ọ pụtara n’ebube n’ihu ndịozi ya atọ. Pita gosiri na nghọta a ziri ezi site n’ikwu banyere “ike na ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst” mgbe ọ na-ekwu banyere ọhụhụ ọ hụrụ nnwogha Jizọs.—2 Pita 1:16-18.

Ị̀ Na-ekwe Ka Bible Kọwaa Onwe Ya?

Gịnị ma ọ bụrụ na ị ghọtaghị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọbụna mgbe ị gụsịrị amaokwu ndị bu ya ụzọ na ndị sochiri ya? Ọ pụrụ ịbara gị uru iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ tụnyere ya, na-ebu n’uche isi ihe Bible dum na-ekwu. Otu ngwá ọrụ magburu onwe ya ị pụrụ iji mee nke a dị na New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke e nwere n’ozuzu ya na akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ 57. Ngwá ọrụ a bụ ntụaka nke na-adị n’etiti peeji nke ọ bụla n’ọtụtụ asụsụ. Ị pụrụ ịhụ ihe karịrị otu narị puku ntụaka, na puku iri abụọ na ise na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke e nwere n’ọtụtụ asụsụ ndị bụ́ isi. “Okwu Mmalite” Bible ahụ kọwara, sị: “Iji nlezianya jiri nkọwa ala ala peeji ndị dị na Bible a tụnyere ntụaka etiti peeji ya ga-egosi na akwụkwọ 66 dị na Bible kwekọrọ, nke ahụ na-egosikwa na ha nile dị n’otu akwụkwọ nke e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee.”

Ka anyị hụ otú ntụaka ndị ahụ pụrụ isi nyere anyị aka ịghọta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị were akụkọ banyere Ebram, ma ọ bụ Ebreham, dị ka ihe atụ. Tụlee ajụjụ a: Olee onye butere ụzọ na njem ahụ Ebram na ezinụlọ ya mere isi na Ua pụọ? Jenesis 11:31 na-ekwu, sị: “Tira wee chịrị Ebram, bụ́ nwa ya nwoke, na Lọt, . . . na Seraị, bụ́ nwunye nwa ya, . . . ha na ha wee si na Ua nke ndị Kaldia pụọ, ije ala Kenan; ha bịaruo Heran, biri n’ebe ahụ.” Ọ bụrụ na mmadụ agụọ nanị ebe a, onye ahụ nwere ike ikwubi na ọ bụ nna Ebram, bụ́ Tira, duuru ha pụọ. Otú ọ dị, na New World Translation, anyị ga-ahụ ntụaka 11 n’amaokwu a. Nke ikpeazụ ga-eduga anyị n’Ọrụ 7:2, ebe anyị na-agụ nkatọ Stivin katọrọ ndị Juu narị afọ mbụ, sị: “Chineke nke ebube pụtara ìhè nye nna nna anyị bụ́ Ebreham ka ọ nọ na Mesopotemia, tupu o biri na Heran, ọ gwakwara ya, sị, ‘Si n’ala gị nakwa n’etiti ndị ikwu gị pụọ, banyekwa n’ala nke m ga-egosi gị.’” (Ọrụ 7:2, 3) Stivin, ọ̀ na-agwakọtazi ọpụpụ Ebram si na Heran pụọ na nke a? Ee e, n’ihi na amaokwu a so n’ihe odide sitere n’ike mmụọ nsọ nke Okwu Chineke.—Jenesis 12:1-3.

Gịnịzi mere Jenesis 11:31 ji kwuo na ‘Tira chịịrị Ebram, bụ́ nwa ya nwoke’ na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya si na Ua pụọ? Tira ka bụ onyeisi ezinụlọ ahụ. O kwetara iso Ebram gaa, n’ihi ya kwa, a sịrị na ọ bụ ya duuru ezinụlọ ya gaa Heran. Site n’iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ tụnyere ibe ha na ime ka ha kwekọọ, anyị pụrụ ịghọta nnọọ ihe merenụ. Ebram ji nkwanye ùgwù mee ka nna ya kweta ịhapụ Ua n’ikwekọ n’iwu Chineke nyere ya.

Mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, anyị kwesịrị iburu n’uche ihe anyị gụrụ na isi ihe Bible dum na-ekwu. A dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị wee mara ihe ndị Chineke jiworo obiọma nye anyị. Ihe ndị a ka anyị na-ekwukwa, ọ bụghị n’iji okwu e ji amamihe mmadụ na-akụzi, kama n’iji okwu mmụọ nsọ na-akụzi, ka anyị na-ejikọta ihe ime mmụọ na okwu ime mmụọ.” (1 Ndị Kọrint 2:11-13) N’ezie, anyị aghaghị ịrịọ Jehova maka enyemaka ya iji ghọta Okwu ya ma gbalịa ịdị “na-ejikọta ihe ime mmụọ na okwu ime mmụọ” site n’inyocha ihe e kwuru tupu akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị na-agụ na ihe sochiri ya na site n’ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara ya. Ka anyị nọgide na-achọta eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa site n’ịmụ Okwu Chineke.

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ndị mmụta Bible na narị afọ nke 19, bụ́ ndị kwere ka Akwụkwọ Nsọ kọwaa onwe ya: George Storrs, Henry Grew, Charles Taze Russell, na A. H. Macmillan

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

N’elu: SIX SERMONS, nke George Storrs (1855) dere; nke abụọ malite n’elu: Ihe si n’aka The New-York Historical Society/69288

[Foto dị na peeji nke 15]

Pọl onyeozi zoro aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche iji kọwaa ihe ọ na-ekwu