Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onyinye Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi nke Onye Okike Anyị Nyere Anyị

Onyinye Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi nke Onye Okike Anyị Nyere Anyị

Onyinye Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi nke Onye Okike Anyị Nyere Anyị

Ó JUGHỊ gị anya na isiakwụkwọ mbụ nke Bible kwuru banyere ihe ndị ọkà mmụta sayensị kwuru ga-adị mkpa ma ọ bụrụ na a ga-enwe ihe dị ndụ na mbara ala ọ bụla? Gịnị ka ihe ndị a bụ?

Ka e wee nwee ihe dị ndụ na mbara ala, mbara ala ahụ aghaghị inwe mmiri ebe o buru ibu, dị ka Jenesis 1:2 si kwuo. Ọ ghaghị inwe okpomọkụ kwesịrị ekwesị iji mee ka mmiri dị na ya ghara ịkpụkọta akpụkọta. Nke a ga-achọ ka mbara ala ahụ dịrị n’ebe kwesịrị ekwesị site n’anyanwụ ya. Jenesis kọọrọ anyị ọtụtụ ugboro banyere anyanwụ na ihe ndị ọ na-arụ n’ụwa.

Ka ụmụ mmadụ wee nwee ike ibi na mbara ala, ọ dị otú gas dị iche iche dị na mbara ala ahụ na-aghaghị ịha. E kwuru banyere ihe a dị mkpa na Jenesis 1:6-8. Uto ahịhịa, bụ́ nke a kọwara na Jenesis 1:11, 12, bụ ihe bụ́ isi na-eme ka e nweta ikuku oxygen. Mbara ala nke anụmanụ dị iche iche nwere ike ịdị ndụ na ya na-achọ ala akọrọ nke na-emepụta ihe, dị ka e si kọwaa ya na Jenesis 1:9-12. Nke ikpeazụ bụ na ka mbara ala nwee ike inwe okpomọkụ na oyi na-agabigaghị ókè, mbara ala ahụ aghaghị ihulata ehulata ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị ma nọgide otú ahụ—a bịa n’ụwa, otu n’ime ihe ndị na-eme ka ọ nọgide n’ebe o hulatara bụ ikike sitere n’ọnwa. A kọwara ọnwa na uru ụfọdụ ọ bara na Jenesis 1:14, 16.

Olee otú Mozis, bụ́ onye edemede oge ochie si nwee ike ịkọrọ anyị ihe ndị ahụ e kwuru n’elu, n’enweghị enyemaka nke sayensị ọgbara ọhụrụ? Mozis ò nwere ọgụgụ isi pụrụ iche n’ịghọta mkpa ihe ndị ahụ dị karịa ndị ya na ha dịkọrọ ndụ? Ihe kpatara ya bụ na Onye Okike nke eluigwe na ala ji ike mmụọ nsọ ya kọwaara ya ha. Anyị aghaghị ikwere nke ahụ n’ihi otú ihe ndị e kwuru na Jenesis si kwekọọ na nkà mmụta sayensị.

Bible kwuru na ọ dị nzube mere e ji kee ihe ndị ahụ dị ịtụnanya dị n’eluigwe na ala anyị na-ahụ anya. Abụ Ọma 115:16 na-ekwu, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” Abụ ọma ọzọ kwuru, sị: “Ọ tọwo ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Ya bụrụ na Onye Okike anyị kere eluigwe na ụwa anyị magburu onwe ya, ọ gatụghị abụ ihe ijuanya ma anyị kwere na ọ ga-enwekwa ike ime ka ha nọgide na-arụ ọrụ nke ọma. Nke a pụtara na ị pụrụ iji obi ike na-atụ anya mmezu nke nkwa a magburu onwe ya, nke bụ́: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) N’ikwu eziokwu, Chineke ‘ekeghị ụwa ka ọ tọgbọrọ n’efu’ kama ‘ọ kpụrụ ya ka ụmụ mmadụ ndị nwere ekele ma kweta na ọ bụ ya kere ihe nile wee biri n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi.’—Aịsaịa 45:18.

Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, Jizọs bịara n’ụwa iji kụziere anyị banyere Chineke na nzube Ya nke bụ́ inye ụmụ mmadụ na-erube isi ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Anyị ji n’aka na n’isi nso Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa,’ ebe ụmụ mmadụ hụrụ udo n’anya si ná mba nile bụ́ ndị nabatara ndokwa o mere maka nzọpụta ga-adịgide ndụ. (Mkpughe 7:9, 14; 11:18) Lee ka ndụ ga-esi tọgbuo nnọọ onwe ya ka ụmụ mmadụ nọ na-achọpụta ihe ndị dị ịtụnanya Chineke kere ma jiri ha na-ekpori ndụ ruo mgbe ebighị ebi!—Eklisiastis 3:11; Ndị Rom 8:21.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Foto NASA