Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oké ọhịa Biriya nke dị na Galili

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ọ̀ bụ eziokwu na oké ọhịa juru n’Izrel oge ochie otú ahụ Baịbụl kwuru?

BAỊBỤL kwuru na e nwere ebe ndị bụ́ oké ọhịa n’Ala Nkwa ahụ nakwa na osisi ndị dị na ha ‘dị ọtụtụ.’ (1 Eze 10:27; Jọsh. 17:15, 18) Ma, ebe ọ bụ na osisi adịghịzi n’ọtụtụ ebe n’Ala Nkwa ahụ taa, ndị na-arụ ihe Baịbụl kwuru ụka nwere ike ichewe ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụkwa eziokwu.

Ụyọkọ mkpụrụ osisi sịkamọ

Otu akwụkwọ nke kwuru banyere otú ihe dị n’Izrel oge ochie kọwara na e nwere oké ọhịa n’Izrel oge ochie karịa ugbu a. Osisi ndị juru n’ugwu ndị dị n’ala ahụ bụ osisi Alepo paịn, osisi ok, na osisi terebint. Osisi sịkamọ jukwara eju na Shefila, ya bụ, n’ebe e nwere obere ugwu ndị dị n’agbata nnukwu ugwu ndị dị n’Izrel na Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian.

Akwụkwọ ọzọ nke kwuru banyere osisi ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl kwuru na osisi adịghịzi n’ebe ụfọdụ n’Izrel. Gịnị kpatara ya? Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị mmadụ ji nwayọọ nwayọọ gbutuchaa osisi ndị ahụ ka ala ugbo ha bukwuo ibu nakwa ka ha hụ ebe anụ ụlọ ha ga na-ata ahịhịa. E nwekwara osisi ndị ha ji rụọ ụlọ na ndị ha ji mere nkụ.