Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Nne Nwere Obi Ụtọ

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Nne Nwere Obi Ụtọ

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Nne Nwere Obi Ụtọ

N’EBE niile n’ụwa taa, ọtụtụ ndị inyom na-arụ ọrụ ego. Ná mba ndị mepere emepe, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị inyom na ndị ikom na-arụ ọrụ ego hà. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọtụtụ mgbe ndị inyom na-adọlị, na-arụ ọrụ ugbo ruo ọtụtụ awa iji nweta ihe ezinụlọ ha ga-eri.

Ọtụtụ ndị inyom amaghị ma ọ bụ hà rụwa ọrụ ego ma ọ bụ hà nọrọ n’ụlọ lekọtawa ezinụlọ ha. Ọ bụghị naanị na ndị inyom a na-akpata ego e ji azụ nri, uwe, na nke e ji akwụ ụgwọ ụlọ, ha na-esikwa nri, na-asa ákwà ma na-edebe ụlọ ọcha.

Ndị nne bụ́ Ndị Kraịst na-agbalịsikwa ike ịkụziri ụmụ ha otú ha na Chineke ga-esi dị ná mma. Cristina, bụ́ otu nne nke mụrụ ụmụntakịrị nwaanyị abụọ, sịrị: “N’eziokwu, ọ dịtụdịghị mfe ịrụ ọrụ ego ma na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ, karịchaa, mgbe mmadụ nwere obere ụmụaka. Ilebara ụmụaka anya otú o kwesịrị adịghị mfe.”

Gịnị mere ndị nne ji na-arụ ọrụ ego? Olee nsogbu ndị na-abịara ha? Ọ̀ bụ iwu na nne ga-arụ ọrụ ego tupu ya enwee obi ụtọ?

Ihe Mere Ndị Nne Ji Arụ Ọrụ Ego

Ọ dị oké mkpa ka ọtụtụ ndị nne na-arụ ọrụ ego. Ụfọdụ enweghị di ga na-enyere ha aka ịkpata ego ha ga-eji na-egbo mkpa ezinụlọ ha. Ndị di na nwunye ndị ọzọ achọpụtala na ụgwọ a na-akwụ otu onye anaghị ezu iji lekọta ezinụlọ ha.

N’eziokwu, ọ bụghị ndị nne niile ndị na-arụ ọrụ ego na-arụ ya maka na ego kọrọ ha. Ọtụtụ n’ime ha na-arụ ọrụ ego ka ha dị ka ibe ha. Ụfọdụ na-arụ ọrụ iji na-enweta ego nke ha ma ọ bụ iji na-ebi ndụ okomoko. Ọtụtụ na-arụta ọrụ ha nke ọma, ọ na-atọkwa ha ụtọ ịrụ ya.

Ihe ọzọ mere ụfọdụ ndị nne ji arụ ọrụ ego bụ n’ihi ndị ọgbọ ha. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị kwetara na ndị nne ndị na-arụ ọrụ ego na-echegbukarị onwe ha, nakwa na ike na-agwụkarị ha, ndị mmadụ na-aghọtahiekarị ndị na-achọghị ịrụ ọrụ ego, ọbụna na-akparị ha. Otu nwaanyị sịrị: “Ọ naghị adị mfe ịgwa ndị ọzọ na ị naghị arụ ọrụ ego. Ihe ụfọdụ ndị na-ekwu, na otú ha si edebe ihu ekwu ya, na-egosi na ị chọghị ịbara onwe gị uru.” Rebeca, onye nwa ya nwaanyị dị afọ abụọ, sịrị: “Ọ bụ ezie na ndị mmadụ kwetara na ndị inyom kwesịrị ilekọta ụmụ ha, m chere na ha na-eleda ndị nne ndị na-anaghị arụ ọrụ ego anya.”

Echiche Ziri Ezi na nke Na-ezighị Ezi

N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọ bụ nwaanyị nke na-eme nke ọma n’ọrụ ya, ya bụ, onye a na-akwụ ezigbo ụgwọ, nke na-eji ejiji mara oké mma, nakwa nke obi kara, ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akpọ “nwaanyị e ji eje mba.” Ya lọta ọrụ, ike na-adị ya igboro ụmụ ya mkpa ha, imezi ihe di ya mehiere, na idozi nsogbu ọ bụla e nwere n’ụlọ. O doro anya na ọ bụ ndị inyom ole na ole nwere ike ime nke a.

Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ọrụ ego ndị inyom na-arụ na-agbụ ha, a naghịkwa akwụ ha ezigbo ụgwọ. Ọ na-ewute ndị nne ndị na-arụ ọrụ ego na ọrụ ha anaghị ekwe ka ha jiri ikike Chineke nyere ha na-arụpụta ihe otú ha kwesịrị. Akwụkwọ bụ́ Social Psychology kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ụmụ nwaanyị na-agbalịsi ike ka ha na ụmụ nwoke hara, ọ bụ ụmụ nwoke ka a na-enyekarị ọrụ a na-akwụ ezigbo ụgwọ na ọrụ ndị dị mkpa. Ya mere, ndị inyom ndị na-arụ ọrụ ka ha dịrị ka ibe ha na-enwe ihe isi ike dị ukwuu.” Akwụkwọ akụkọ ndị Spain bụ́ El País kwuru, sị: “A na-eche na ndị inyom ga-enwe nchekasị okpukpu atọ karịa ndị ikom, ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha na-arụ ụzọ ọrụ abụọ, otu n’ụlọ ọrụ, nke ọzọ n’ụlọ.”

Otú Ndị Di Nwere Ike Isi Nye Aka

Ọ bụ Onye Kraịst bụ́ nne ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-arụ ọrụ ego ma ọ bụ na ọ gaghị arụ. Ma, ọ bụrụ na o nwere di, ọ bụ ya na di ya kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eme mgbe ha kwurịtachara ya, tụlechaakwa ihe niile metụtara ya nke ọma.—Ilu 14:15.

Olee ihe di na nwunye ga-eme ma ọ bụrụ na ha ekpebie na ha abụọ ga na-arụ ọrụ ego n’ihi mkpa ego na-akpa ha? Ọ bụrụ otú ahụ, di nke nwere amamihe ga-ege ntị na ndụmọdụ dị na Baịbụl nke sịrị: “Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, na-enyenụ nwaanyị nsọpụrụ dị ka arịa na-esighị ike, ebe unu na ha bụ ndị nketa nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke bụ́ ndụ.” (1 Pita 3:7) Di na-asọpụrụ nwunye ya site n’igosi na ya ghọtara otú ikike nwunye ya hà, ghọtakwa otú o si eche echiche. Mgbe ọ bụla o kwere omume, ọ ga-enyere nwunye ya aka rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Dị ka Jizọs mere, di ga-adị njikere iji obi umeala na-arụ ọrụ ndị dị ala, o kwesịghị ịjụ ịrụ ụdị ọrụ ahụ dị ka à gasị na ya akarịala ịrụ ha. (Jọn 13:12-15) Kama nke ahụ, o kwesịrị iwere ọrụ ndị ahụ dị ka ụzọ o si egosi na ya hụrụ nwunye ya, bụ́ onye na-arụsi ọrụ ike, n’anya. Nke a ga-amasị nwunye ya nke ukwuu.—Ndị Efesọs 5:25, 28, 29.

O doro anya na ọ bụrụ na di na nwunye ga na-arụ ọrụ ego, ọ dị mkpa ka ha na-enyere ibe ha aka n’ụlọ. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Spain bụ́ ABC gosiri na nke a bụ eziokwu. Mgbe akwụkwọ akụkọ a na-ekwu okwu banyere ihe ọmụmụ nke Òtù Na-eleba Anya n’Ihe Metụtara Ezinụlọ haziri, ọ sịrị na ihe mere ịgba alụkwaghịm ji na-arị elu na Spain abụghị naanị maka na ndị mmadụ “anakwaghị agbaso omume ọma na ihe okpukpe ha kwuru,” kamakwa, n’ihi ụzọ ihe abụọ ọzọ, ya bụ, “mmalite ndị inyom malitere ịrụ ọrụ ego na ọjụjụ ndị ikom jụrụ ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ.”

Ọrụ Dị Mkpa Dịịrị Onye Kraịst Bụ́ Nne

Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị bụ́ nna ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ụmụ ha, ndị nne bụ́ Ndị Kraịst maara na e nyekwara ha ọrụ dị mkpa—karịchaa mgbe nwatakịrị ka dị obere. (Ilu 1:8; Ndị Efesọs 6:4) Mgbe Jehova gwara ndị Izrel ka ha kụziere ụmụ ha Iwu ya, ọ bụ ma ndị nne ma ndị nna ka ọ gwara ya. Ọ maara na nke a chọrọ oge na ndidi, karịchaa, n’oge nwatakịrị ka na-etolite etolite. Ọ bụ ya mere Chineke ji gwa ndị nne na nna na ha kwesịrị ịzụ ụmụ ha mgbe ha nọ n’ụlọ, mgbe ha na-aga n’okporo ụzọ, mgbe ha biliri ọtọ, na mgbe ha dina ala.—Diuterọnọmi 6:4-7.

Okwu Chineke gosiri nke ọma na ndị nne nwere ọrụ dị mkpa, nke dịkwa mma, ha nwere ịrụ mgbe o nyere ụmụaka iwu, sị: “Ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 6:20) Ọ dị mma ka nwaanyị nwere di gwa di ya tupu ya enye ụmụ ya iwu. Ma, amaokwu ahụ na-egosi na ndị nne nwere ikike inye ụmụ ha iwu. Ụmụaka ndị ji obi ha nabata iwu niile dabeere n’Okwu Chineke ndị nne ha, bụ́ onye na-atụ egwu Chineke, na-enye ha ga-erite uru nke ukwuu. (Ilu 6:21, 22) Teresa, onye mụrụ ụmụntakịrị nwoke abụọ, kwuru ihe mere na ọ chọghị ịrụ ọrụ ego. Ọ sịrị: “Ọrụ kacha mkpa m nwere bụ ịzụlite ụmụ m ka ha jeere Chineke ozi. Achọrọ m ịrụta ọrụ a nke ọma.”

Ndị Nne Ndị Rụrụ Ọrụ Ha nke Ọma

Eze Lemuel bụ́ onye Izrel ritere uru ná mbọ nne ya gbasiri ike. “Okwu gbara ọkpụrụkpụ nke nne ya gwara ya iji gbazie ya” so n’ihe e dere n’Okwu Chineke nke si n’ike mmụọ nsọ. (Ilu 31:1; 2 Timoti 3:16) Otú ahụ nne ya si kọwaa onye bụ́ ezigbo nwunye ka na-enyere ụmụ okorobịa aka iji amamihe chọta onye ha ga-alụ. Ịdọ aka ná ntị ọ dọrọ ya banyere omume rụrụ arụ na ịṅụbiga mmanya ókè ka bara uru taa otú ahụ ọ bara n’oge e dere ya.—Ilu 31:3-5, 10-31.

Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi jara ọrụ ọma otu nne aha ya bụ Yunis rụrụ mma bụ́ onye kụziiri nwa ya nwoke bụ́ Timoti ihe. Ebe ọ bụ na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe, ọ ga-abụ na o fere chi ndị Grik. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka Yunis mee ka Timoti kwere “ihe odide ndị ahụ dị nsọ” ma nwee okwukwe na ha. Olee mgbe Yunis malitere ịkụziri Timoti Akwụkwọ Nsọ? Akwụkwọ ahụ si n’ike mmụọ nsọ sịrị na ọ bụ ‘malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ,’ ya bụ, malite n’oge o ku Timoti n’aka. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) O doro anya na okwukwe ya na ihe nlereanya ya, nakwa ihe ndị ọ kụziiri Timoti, kwadebere Timoti maka ozi o mechara jee n’ala ọzọ.—Ndị Filipaị 2:19-22.

Baịbụl kwukwara okwu banyere ndị nne ndị lere ndị ohu Chineke ọbịa, nke mere ka ụmụ ha hụ ihe nlereanya magburu onwe ha ndị ha kwesịrị iṅomi. Dị ka ihe atụ, nwaanyị Shunem nabatara Ịlaịsha onye amụma ugboro ugboro n’ụlọ ya. Ịlaịsha mechara kpọlite nwa ya nwoke n’ọnwụ. (2 Ndị Eze 4:8-10, 32-37) Tụleekwa ihe nlereanya Meri, bụ́ onye mụrụ onye so dee Baịbụl bụ́ Mak. O yiri ka o wepụtara ụlọ ya nke dị na Jeruselem ka ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge mbụ na-ezukọ na ya. (Ọrụ 12:12) O doro anya na mkpakọrịta Mak na ndịozi na Ndị Kraịst ndị ọzọ, bụ́ ndị na-abịa n’ụlọ ha mgbe niile, kpakọrịtara nyeere ya aka.

N’ezie, mbọ ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi na-agba iji kụnye iwu Chineke n’obi ụmụ ha dị Jehova mma nke ukwuu. Ọ hụrụ ndị inyom ndị ahụ n’anya n’ihi otú ha si na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nakwa n’ihi otú ha si na-agbalị ka e jiri okwu Chineke kpọrọ ihe n’ụlọ ha.—2 Samuel 22:26; Ilu 14:1.

Ihe Kacha Enye Obi Ụtọ Ị Ga-ahọrọ Ime

Dị ka ihe nlereanya ndị ahụ si n’Akwụkwọ Nsọ gosiri, igbo mkpa ndị ezinụlọ anyị, ma mkpa anụ ahụ́ ha ma mkpa ime mmụọ ha, tinyere ileba anya n’ihe na-echegbu ha, na-eweta ụgwọ ọrụ pụrụ iche. Ma, ime nke a adịghị mfe. Ọtụtụ mgbe, ọrụ nne nwere ịrụ n’ụlọ na-akarị ọrụ ego ọ bụla nke a na-akwụ ezigbo ụgwọ.

N’eziokwu, ọ bụrụ na onye bụ́ nne ahọrọ iselata aka n’ọrụ ego mgbe ọ jụtachara echiche di ya, o nwere ike ezinụlọ ya agaghị enwechakwa ego otú ha nweburu, ndị na-aghọtaghị echiche ya nwekwara ike ịkparị ya. Ma, uru ọ ga-erite ga-aka ihe niile o furu ya. Paqui nwere ụmụ atọ, ọ dịkwa ya mkpa ka ọ na-arụ ọrụ nwa oge. Ọ sịrị: “M na-achọ ịnọ n’ụlọ mgbe ụmụaka m lọtara akwụkwọ ka ha wee hụ onye ha na ha ga na-akparịta ụka.” Olee otú nke a si abara ụmụ ya uru? Ọ sịrị: “M na-enyere ha aka ka ha mee ihe omume e nyere ha ka ha mee n’ụlọ, ọ bụrụkwa na nsogbu adapụta, m na-edozi ya ozugbo. Oge ahụ mụ na ha na-anọkọ kwa ụbọchị na-eme ka mụ na ha na-ekwurịta okwu nke ọma. Oge ahụ mụ na ụmụ m na-anọkọ dị m mkpa nke ukwuu nke na m jụrụ ịrụ ọrụ ego nke oge niile.”

Ọtụtụ ndị nne bụ́ Ndị Kraịst achọpụtala na ọ bụrụ na ha egbubilata oge ha ji arụ ọrụ ego, ọ ga-abara mmadụ niile nọ n’ezinụlọ ha uru. Cristina, bụ́ onye a kpọrọ aha na mbụ, kwuru, sị: “Mgbe m kwụsịrị ịrụ ọrụ ego, o yiri ka ihe niile ọ̀ malitere gawa nke ọma n’ezinụlọ anyị. M nwetara oge mụ na ụmụ m ji akparịta ụka, nwetakwa oge m ji na-enyere di m ezigbo aka. M malitere ịkụziri ụmụ m ihe, jirikwa anya m hụ ka ha na-amụta ihe ma na-eme nke ọma.” O nwere otu ihe Cristina na-anaghị echefu echefu. Ọ sịrị: “Nwa m nke mbụ mụtara ije ije n’ebe a na-elekọta ụmụaka, ma, m nọ n’ụlọ kụziere nwa m nke abụọ ije ije. Mgbe ọ zọrọ ije nke mbụ ya daa, ọ bụ n’aka m ka ọ danyere. Nke a tọgburu m atọgbu!”

Ihe ọzọ dị mkpa e kwesịrị ileba anya bụ na ego ezinụlọ na-agaghị akpata ma ọ bụrụ na nne akwụsịlata ịrụ ọrụ ego adịchaghị ukwuu otú e chere. Cristina sịrị: “Ego m na-akwụ ndị na-elekọta ụmụ m na nke m na-emefu n’ụgbọala na-afọ nke nta ka o rikpọọ ụgwọ a na-akwụ m. Mgbe anyị leruru ọnọdụ anyị anya nke ọma, anyị chọpụtara na ọ dịghị ezigbo ego ọrụ m na-enye anyị.”

Mgbe di na nwunye ụfọdụ leruru ọnọdụ ha anya, ha na-ekpebi na uru ha ga-erite ma ọ bụrụ na nwunye ha anọrọ lekọtawa ezinụlọ ha n’arụghị ọrụ ego ọ bụla karịrị ego ọ bụla ha gaara akpata. Paul, bụ́ di Cristina, sịrị: “Obi dị m ụtọ na nwunye m nwere ike ịnọ n’ụlọ na-elekọta ụmụaka anyị. Nchekasị anyị abụọ na-enwe karịrị akarị mgbe nwunye m na-arụ ọrụ ego.” Olee otú mkpebi a si metụta ụmụ ha abụọ? Paul sịrị: “Ọ bụghị naanị na ahụ́ eruola ha ala karị, anyị na-echebekwa ha nnọọ karị ka ihe ọjọọ ndị na-akpa ụmụaka aka ọjọọ ghara imetụta ha.” Gịnị mere di na nwunye a ji chee na ọ dị mkpa nke ukwuu ka ha na-ewepụtara ụmụ ha oge otú a? Paul zara, sị: “Obi ụmụaka yiri akwụkwọ a na-edeghị ihe. O doro m anya na ọ bụrụ na anyị bụ́ ndị nne na nna edeghị ya ihe, onye ọzọ ga-edeju ya ihe.”

N’ezie, ọ bụ di na nwunye nke ọ bụla ga-eleru ọnọdụ nke ha anya. Onye ọ bụla ekwesịghịkwa ịkatọ mkpebi ndị ọzọ mere. (Ndị Rom 14:4; 1 Tesalọnaịka 4:11) Ma, ọ dị mma ịtụle ọtụtụ uru ezinụlọ na-erite ma ọ bụrụ na nne anaghị arụ ọrụ ego nke oge niile. Teresa, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kọwara ihe dị ya n’obi, sị: “O nweghị ihe na-enye obi ụtọ karịa iwepụta oge ọ bụla o kwere mee iji na-elekọta ụmụ gị ma na-akụziri ha ihe.”—Abụ Ọma 127:3.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị nne bụ́ Ndị Kraịst so arụ ọrụ ịzụ ụmụ ha bụ́ nke dị oké mkpa