Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ihe Nwere Ike “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”?

Ò Nwere Ihe Nwere Ike “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”?

Bịaruo Chineke Nso

Ò Nwere Ihe Nwere Ike “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”?

Ndị Rom 8:38, 39

Ò NWERE onye n’ime anyị na-achọghị ka a hụ ya n’anya? N’eziokwu, obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị hụrụ anyị n’anya. Ma, ọ dị mwute na mmekọrịta ụmụ mmadụ na ibe ha anaghị esi ike, e jighịkwa ya n’aka. Ndị anyị hụrụ n’anya nwere ike ịkpasu anyị iwe, hapụ anyị, ma ọ bụkwanụ jụ anyị. Ma, e nwere onye ịhụnanya ya na-anaghị ada ada. Ná Ndị Rom 8:38, 39, a kọwara nke ọma otú Jehova bụ́ Chineke si hụ ndị na-efe ya ofufe n’anya.

Pọl onyeozi sịrị: “Ekwetara m.” Gịnị ka o kwetara? Na o nweghị ihe nwere ike “ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.” Pọl anaghị ekwu banyere naanị onwe ya, kama, ọ na-ekwu banyere “anyị,” ya bụ, ndị niile ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi. Iji mesie okwu ya ike, Pọl kwuru ọtụtụ ihe na-enweghị ike ime ka Jehova ghara ịhụ ndị ohu ya ji obi ha dum na-ejere ya ozi n’anya.

“Ọnwụ ma ọ bụ ndụ.” Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ya nọ anaghị akwụsị mgbe ha nwụrụ. Otú Chineke si egosi na ọ ka hụrụ ha n’anya bụ na ọ na-echeta ha, ọ ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume, bụ́ nke gaje ịbịa. (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:3, 4) N’ime oge anyị a, Chineke ga-anọgide na-ahụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe n’anya n’agbanyeghị nsogbu niile na-abịara ha n’oge a.

“Ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị.” Ndị a ma ama ma ọ bụ ndị ọchịchị na-emekarị ka ụmụ mmadụ mee ihe ha na-achọghị ime. Ma, ha enweghị ike ime ka Jehova mee ihe ọ na-achọghị ime. Ndị mmụọ ozi dị ike, dị ka mmụọ ozi ahụ mechara ghọọ Setan, agaghị enwe ike ime ka Chineke kwụsị ịhụ ndị na-efe ya ofufe n’anya. (Mkpughe 12:10) Ndị ọchịchị ndị na-emegide ezi Ndị Kraịst, enweghịkwa ike ịgbanwe otú Chineke si were ndị ohu ya.—1 Ndị Kọrịnt 4:13.

“Ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa.” Ịhụnanya Chineke anaghị ada ada ka oge na-aga. Ọ dịghị ihe ga-eme ndị ohu ya ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu nke ga-eme ka Chineke kwụsị ịhụ ha n’anya.

“Ma ọ bụ ike.” Pọl bu ụzọ kwuo banyere “ndị mmụọ ozi” na “ọchịchị,” ma ugbu a, o kwuru banyere “ike.” Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a pụtara ọtụtụ ihe. N’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ pụtara, otu ihe doro anya: Ọ dịghị ike dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’ụwa nwere ike ime ka Jehova ghara ịhụ ndị ya n’anya.

“Ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi.” Jehova hụrụ ndị ya n’anya n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ, ma ọnọdụ ha ọ̀ dị elu ma ọ̀ dị ala.

“Ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke.” Pọl ji okwu a nke gụnyere ihe niile e kere eke na-egosi hoo haa na o nweghị ihe nwere ike ikewapụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova n’ịhụnanya ya.

Ịhụnanya Chineke adịghị ka nke mmadụ nke nwere ike ịgbanwe agbanwe ma ọ bụ daa. Kama ọ na-anọgide na-ahụ ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ n’anya; ịhụnanya ya na-adịru ebighị ebi. Anyị ịmara nke a na-eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso, na-emekwa ka anyị mee ike anyị niile iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya.