Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe Ndị Kraịst Oge Gboo Kwusaruru Ozi Ọma n’Eshia?

Olee Ebe Ndị Kraịst Oge Gboo Kwusaruru Ozi Ọma n’Eshia?

Olee Ebe Ndị Kraịst Oge Gboo Kwusaruru Ozi Ọma n’Eshia?

N’IHE na-erughị iri afọ atọ Jizọs nwụrụ, Pọl onyeozi dere na a na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke” dị n’okpuru eluigwe. (Ndị Kọlọsi 1:23) E kwesịghị iwere na ihe o kwuru pụtara na e ziri mmadụ niile nọ ndụ n’oge ahụ ozi ọma. Ma, isi ihe Pọl kwuru doro anya: Ndị Kraịst ndị kwusara ozi ọma n’ala ọzọ n’oge ahụ kwusara ya n’ọtụtụ ebe n’ụwa.

Olee ebe ọ ga-abụ na ha kwusaruru ya? Akwụkwọ Nsọ kwuru na Pọl so ụgbọ mmiri na-ebu ndị njem gaa kwusaa ozi ọma n’ala ndị Bekee, garuodị Ịtali. Nwoke a nwere obi ike, bụ́ onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, chọkwara ịga kwusaa ozi ọma na Spen.—Ọrụ 27:1; 28:30, 31; Ndị Rom 15:28.

Oleekwanụ maka mba ndị dị n’Eshia? Olee ebe Ndị Kraịst oge gboo kwusaruru ozi ọma n’Eshia? Azịza ya edochaghị anyị anya n’ihi na Baịbụl ekwughị ya. Ma, o nwere ike ịtụ gị n’anya ịmata na e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ahịa si ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian si aga mba ndị dị n’Eshia n’oge ndịozi Jizọs ka nọ ndụ. N’agbanyeghị na anyị amaghị ebe Ndị Kraịst ahụ kwusaruru ozi ọma, ụzọ ndị ahụ e nwere gosiri na onye chọrọ ịga mba ndị dị n’Eshia nwere ụzọ ọ ga-esi aga ha.

Ihe Alexander Mere Ka Ndị Mmadụ Mata

Alexander Onye Ukwu gara agha ná mba ndị dị n’Eshia, si Babịlonia na Peshia ruo Punjab, nke dị n’ebe ugwu India. Agha ndị ahụ ọ gara mere ka ndị Gris mata obodo ndị dị n’ụsọ Oké Osimiri Yufretis, n’Ọwara Oké Osimiri Peshia, ruo n’ebe osimiri Indus na Oké Osimiri Arebia sọkọtara isi.

O teghị aka, ụgbọ mmiri amalite isi n’Oké Osimiri Uhie na-aga n’Oké Osimiri India, na-ebutere ndị Gris ahịhịa na-esi ísì ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Na mbụ, ọ bụ ndị India na ndị Arab na-azụ ahịa ahụ. Ma, mgbe ndị ọchịchị Ijipt chọpụtara otú oké ifufe si efe ná mpaghara ndịda Eshia, ha malitere ịgba ahịa n’Oké Osimiri India.

N’Oké Osimiri Uhie ahụ, malite na May ruo September, ifufe na-esi ná ndịda ebe ọdịda anyanwụ efega ebe ugwu. Nke a na-enyere ụgbọ mmiri aka isi n’ụsọ Oké Osimiri Uhie gaa ná ndịda ụsọ Oké Osimiri Arebia ma ọ bụkwanụ gaa ná ndịda Oké Osimiri India. N’agbata November na March, ifufe na-esizi n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ efedata ná ndịda. Nke a na-eme ka ọ dịrị ndị mere njem mfe ịlọta. Ebe ọ bụ na ndị Arab na ndị India, bụ́ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri, maara otú ifufe ahụ si efe kemgbe ọtụtụ narị afọ, ha ejirila ụgbọ mmiri si n’India gaa n’Oké Osimiri Uhie ugboro ugboro, na-ebute osisi kashịa, sinamọn, mmanụ nad na ose.

Ụzọ Ụgbọ Mmiri Si Aga Alegzandria na Rom

Mgbe ndị Rom meriri ndị nọchiri Alexander ma weghara mba ndị ha chịrị, Rom ghọziri ebe bụ́ isi a na-ere ihe ndị dị oké ọnụ ahịa si ná mba ndị dị n’Eshia, ma ọdụ́ e si Africa ebute, ma ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na mea e si Arebia ebute, ma ahịhịa na-esi ísì ụtọ na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa e si India ebute, ma ákwà silk e si China ebute. Ụgbọ mmiri ndị na-ebu ngwá ahịa ndị ahụ na-akwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri abụọ dị n’Ụsọ Oké Osimiri Uhie dị n’Ijipt. Ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ bụ Berenice na Myos Hormos. Ndị ahịa ahụ na-esi n’obodo abụọ ndị ahụ abanye n’ụzọ ndị gawara Coptos, n’osimiri Naịl.

A na-esi na Coptos eburu ngwá ahịa gaa n’osimiri Naịl, bụ́ isi mmiri ndị Ijipt, si n’ebe ahụ buga ya Alegzandria, bụ́ ebe a na-ebuba ha n’ụgbọ mmiri na-aga Ịtali ma ọ bụkwanụ ebe ọzọ. Ebe ọzọ e si aga Alegzandria bụ otu ọwà mmiri dị nso n’ebe a na-akpọ Suez n’oge a, bụ́ nke jikọtara Oké Osimiri Uhie na osimiri Naịl. Ọ dị mma ịmara na Ijipt na ọdụ ụgbọ mmiri ndị e nwere na ya dịtụ nso n’ala ndị Jizọs ziri ozi ọma, ọ dịkwa mfe isi n’Ijipt gaa ha.

Otu onye Gris dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, onye bụ́ ọkà mmụta ihe ndị dị n’ụwa, nke aha ya bụ́ Strabo, kwuru na n’oge ahụ, otu narị ụgbọ mmiri na ụgbọ mmiri iri abụọ ndị Alegzandria na-esi Myos Hormos aga ahịa n’India kwa afọ. E nwere akwụkwọ e dere n’oge ahụ ka dị ugbu a, bụ́ nke kwuru otú e si akwọ ụgbọ mmiri n’ebe ahụ. Ọ ga-abụ onye ahịa Ijipt nke na-asụ asụsụ Grik dere akwụkwọ a maka ndị ahịa ibe ya. Olee ihe e nwere ike ịmụta n’akwụkwọ ochie ahụ?

Akwụkwọ ahụ, nke a na-akpọkarị aha Latịn ya bụ́ Periplus Maris Erythraei, (ya bụ, Njem Ụgbọ Mmiri n’Oké Osimiri Erythrae) kwuru banyere ụzọ dị iche iche ụgbọ mmiri si aga, bụ́ ndị ruru ọtụtụ kilomita, malite n’ebe ndịda Ijipt ruo Zanzibar. Onye dere akwụkwọ ahụ dekwara banyere mba ndị dị n’Eshia, dee otú ụzọ ndị e si aga ya dịruru anya, ebe dị iche iche ụgbọ mmiri nwere ike ịkwụsị, ebe ndị e nwere ahịa, ngwá ahịa ndị a na-azụ, nakwa otú ndị bi ná ndịda ụsọ Oké Osimiri Arebia si akpa àgwà. O dekwara otu ihe ahụ banyere ebe ọdịda anyanwụ ụsọ Oké Osimiri India ruo Sri Lanka nakwa banyere ebe ọwụwa anyanwụ ụsọ Oké Osimiri India ruo osimiri Ganges. Otú akwụkwọ ahụ si kwutechaa ihe niile, ha edoo anya, gosiri na onye dere ya gara ebe ndị ahụ ọ kọrọ akụkọ ha.

Ndị Ala Bekee Agaa India

N’India, a na-akpọ ndị ahịa si ala Bekee Yavanas. Akwụkwọ ahụ bụ́ Periplus kwuru na otu n’ime ebe ha na-anọkarị n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga bụ Muziris, nke dị nso ná ngwụcha ngwụcha ndịda India. * Uri ndị e dere n’asụsụ Tamil, bụ́ ndị e dere n’oge gboo, kwuru ugboro ugboro banyere ndị ahịa ahụ. Otu uri kwuru, sị: “Ọmarịcha ụgbọ mmiri ndị Yavanas bu ọlaedo bịa, buru ose laa, mkpọtụ eju ebe niile na Muziris.” Uri ọzọ kwuru na a gwara eze ebe ndịda India ka ọ ṅụọ mmanya nwere ísì ọma nke ndị Yavanas butere. Ụfọdụ n’ime ngwá ahịa wuru ewu n’India, bụ́ ndị e si ala Bekee ebubata, bụ ihe ndị e ji glas mee, ọla, nkume kọral, na ákwà.

Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie achọpụtala ihe ndị na-egosi na e si ala Bekee bubata ngwá ahịa n’India. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ihe ndị a hụrụ n’Arikamedu, nke dị n’ụsọ oké osimiri ndịda ebe ọwụwa anyanwụ India, bụ iberibe ite mmanya ndị Rom na efere ndị a mapawara akara ndị kpụrụ ha n’Arezzo, bụ́ obodo dị n’ebe etiti Ịtali. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye na-eme nchọpụta n’oge a agaa na pọtọpọtọ dị n’ụsọ Oké Osimiri Bengal ma hụ ihe ndị e ji ụrọ kpụọ ndị bu aha ndị kpụrụ ha, bụ́ ndị ekwú ha ji rụọ ọrụ ka dị ná mpụga obodo Arezzo, ọ ga-eme ka o chee echiche.” Ihe ọzọ na-egosi na ndị mba ha dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian na ndị India zụkọrọ ahịa bụ ọtụtụ ego kịrịkịrị ọlaedo ndị Rom na ego kịrịkịrị ọlaọcha ha a hụrụ n’ebe ndịda India. A sịrị na a kpụrụ ọtụtụ n’ime ego kịrịkịrị ndị ahụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ha bukwa onyinyo ndị eze ukwu Rom bụ́ Ọgọstọs, Taịbiriọs, na Nero.

Map e nwere n’oge ochie, bụ́ nke ka dị ugbu a, na-egosi na ọ ga-abụ na ụmụ amaala Rom nwere ebe ha na-aga mgbe niile azụ ahịa n’ebe ndịda India. Map a a na-akpọ Peutinger Table, nke a sịrị na ihe e sere na ya bụ ebe Rom na-achị n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, nwekwara ebe e sere ụlọ arụsị Ọgọstọs nke dị na Muziris. Akwụkwọ bụ́ Rome’s Eastern Trade: International Commerce and Imperial Policy, 31 BC–AD 305, kwuru sị: “Ọ ga-abụ naanị ndị Alaeze Ukwu Rom na-achị ga-arụ ụdị ụlọ ahụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ndị bi ebi ma ọ bụ ndị bitere aka na Muziris rụrụ ya.”

Akwụkwọ ndị kọrọ banyere mba Rom gosiri na ndị na-anọchi anya obodo India gara Rom, ọ dịkarịa ala, ugboro atọ n’oge Ọgọstọs na-achị, malite n’afọ 27 tupu a mụọ Kraịst ruo n’afọ 14 mgbe a mụchara Kraịst. Otu nnyocha e mere banyere njem ahụ kwuru na “ndị ahụ nọchiri anya mba India nwere ihe dị mkpa mere ha ji gaa,” ya bụ, ka e kwekọrịta ebe mba dị iche iche nwere ike ịbịa na-azụ ahịa, ebe ha ga na-atụ ụtụ ahịa, ebe ndị si ná mba ọzọ nwere ike ibi, na ihe ndị ọzọ.

N’ihi ya, n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ndị mmadụ na-esikarị ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian aga India. Ọ gaghị esiri Onye Kraịst na-ekwusa ozi ọma ike, bụ́ onye nọ n’ebe ugwu Oké Osimiri Uhie, ịbanye ụgbọ mmiri na-aga India.

Hà Gafere India?

O siri ike ịma ebe niile ndị ahịa ndị si ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian, na ndị njem ndị ọzọ, garuru n’Eshia na mgbe ha malitere gawa. Ma, ndị mmadụ kweere na n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ụfọdụ ndị ala Bekee garuru Thailand, Cambodia, Sumatra, na Java.

Akwụkwọ bụ́ Hou Han-Shou, bụ́ ebe e dere banyere ndị eze China si n’ezinụlọ Han, ndị chịrị malite n’afọ 23 ruo n’afọ 220 mgbe a mụchara Kraịst, kwuru mgbe ndị ala Bekee ahụ gara obodo ndị ahụ. N’afọ 166 mgbe a mụchara Kraịst, onye nnọchianya An-tun, eze Daqin, gara n’obí eze ndị China bunye Eze Ukwu Huan-ti ụtụ. Daqin bụ aha ndị China na-akpọ Alaeze Ukwu Rom. Ma, ọ ga-abụ na An-tun bụ otú ndị China si akpọ Antoninus, bụ́ aha nna Marcus Aurelius, onye bụ́ eze ukwu ndị Rom n’oge ahụ. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme chere na ọ bụghị eze ukwu ndị Rom dunyere onye nnọchianya ahụ, kama ọ bụ onye ahịa si ala Bekee nke bịara ile ma ọ̀ ga na-azụta ákwà silk n’aka ndị China kama isi n’aka ndị ọsọ ahịa na-azụta ya.

Ka anyị laghachizie n’ajụjụ mbụ ahụ anyị jụrụ, Olee ebe Ndị Kraịst oge gboo so ụgbọ mmiri oge ochie garuo n’Eshia gaa kwusaa ozi ọma? Hà garuru India, gafeekwa ya? Ọ ga-abụ. O doro anya na ozi ọma Ndị Kraịst zisara ruru ebe dị anya nke na Pọl onyeozi kwuru na “ọ na-amị mkpụrụ ma na-amụba n’ụwa niile,” ya bụ, ruo ebe kacha dị anya n’ụwa n’oge ahụ.—Ndị Kọlọsi 1:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ bụ eziokwu na a maghị kpọmkwem ebe Muziris dị, ndị ọkà mmụta kwuru na ọ dị nso n’ebe Osimiri Periyar si asọba n’oké osimiri, na steeti Kerala.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

Mkpesa Otu Eze Ukwu Mere

N’afọ 22 mgbe a mụchara Kraịst, Taịbiriọs bụ́ eze ukwu Rom kwara arịrị maka otú ndị obodo ya si emefusị ego. Ndụ okomoko ha na-ebi na oké akpịrị ụmụ nwaanyị Rom nwere ịgbajusị ọla n’ahụ́ nọ na-akpa akụnụba alaeze ukwu ahụ aka ọjọọ, bụ́ nke mere ka akụnụba ha na-alara “ndị mba ọzọ ma ọ bụ ndị iro ha.” Otu onye Rom bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke aha ya bụ Pliny nke Okenye (onye dịrị ndụ n’agbata afọ 23 na afọ 79 mgbe a mụchara Kraịst) mekwara ụdị mkpesa ahụ. O dere, sị: “Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ndị India, ndị Seres, nakwa ala ndị Arebia nke dịịrị banye n’oké osimiri, na-anapụ alaeze ukwu anyị otu narị nde mkpụrụ ego sesterce kwa afọ. Ndụ okomoko anyị na-ebi na ego anyị na-emefuru ụmụ nwaanyị anyị abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.” *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na ọ bụrụ na e kee akụnụba niile Alaeze Ukwu Rom nwere otu narị ụzọ, ụzọ abụọ ya bụ nde mkpụrụ ego sesterce.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Museo della Civiltà Romana, Roma; Todd Bolen/Bible Places.com

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Ebe Ndị Ahịa Chọtara Ngwá Ahịa Ha Zụrụ

Jizọs kwuru banyere “onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma.” (Matiu 13:45) Akwụkwọ Mkpughe kwukwara banyere “ndị ahịa” ndị ngwá ahịa ha bụ nkume dị oké ọnụ ahịa, ákwà silk, osisi na-esi ísì ụtọ, ọdụ́, sinamọn, ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ihe na-esi ísì ụtọ nke India, na ihe ndị ọzọ. (Mkpughe 18:11-13) Ebe e si enweta ngwá ahịa ndị ahụ bụ n’ụzọ ndị ahịa si aga ahịa ma ha gawa n’ebe ọwụwa anyanwụ Palestaịn. A na-azụta osisi ndị na-esi ísì ọma, dị ka sandalwood, n’India. A na-achọta nkume pel ndị dị oké ọnụ ahịa n’Ọwara Oké Osimiri Peshia, na n’Oké Osimiri Uhie. Onye dere akwụkwọ bụ́ Periplus Maris Erythraei kwuru na e nwekwara ike ịchọta ya n’ebe dị nso na Muziris nakwa na Sri Lanka. Ọ ga-abụ na nkume pel a na-enweta n’Oké Osimiri India bụ nkume pel kacha mma, nke kachakwa oké ọnụ.

[Map dị na peeji nke 20, 21]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ụfọdụ ụzọ ahịa ndị si Rom gaa Eshia n’oge gboo

Arezzo

Rom

OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN

AFRICA

Alegzandria

IJIPT

Coptos

Osimiri Naịl

Myos Hormos

Berenice

Zanzibar

Oké Osimiri Uhie

Jeruselem

AREBIA

Osimiri Yufretis

BABỊLONIA

Ọwara Oké Osimiri Peshia

PESHIA

Oké ifufe na-efega n’ebe ugwu

Oké ifufe na-efedata ná ndịda

Osimiri Indus

PUNJAB

Osimiri Ganges

Ụsọ Oké Osimiri Bengal

INDIA

Arikamedu

Muziris

SRI LANKA

OKÉ OSIMIRI INDIA (OKÉ OSIMIRI ERYTHRAE)

CHINA

ALAEZE UKWU HAN

THAILAND

CAMBODIA

VIETNAM

Sumatra

Java

[Foto dị na peeji nke 21]

Otú ụgbọ mmiri ndị Rom ji ebu ngwá ahịa na-adị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụgbọ mmiri: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.