Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

2 Mata Chineke nke Ọma

2 Mata Chineke nke Ọma

2 Mata Chineke nke Ọma

“Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ụfọdụ ndị na-asị na Chineke adịghị. Ndị ọzọ kweere na Chineke bụ ikike nkịtị zuru ebe niile. Ndị kweere na ọ dị adị na-ezi ozizi ndị na-emegide ibe ha banyere onye ọ bụ na àgwà ndị o nwere.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI MERIE YA? Otu ụzọ anyị ga-esi amata onye Chineke bụ bụ ikiri ihe ndị o kere. Pọl onyeozi sịrị: “Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya.” (Ndị Rom 1:20) Ọ bụrụ na i leruo ihe e kere eke anya, ị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere amamihe Onye kere anyị na ike ya.—Abụ Ọma 104:24; Aịzaya 40:26.

Ma, iji mata ụdị onye Chineke bụ nke ọma, ọ dị mkpa ka onye nke ọ bụla n’ime anyị meghee Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ma nyochaa ya n’onwe ya. Ekwela ka ndị ọzọ na-echere gị echiche. Kama nke ahụ, soro ndụmọdụ Baịbụl bụ́: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Dị ka ihe atụ, lebagodị anya n’ihe ndị na-esonụ Baịbụl kwuru banyere Chineke.

Chineke nwere aha. Mgbe e dere Baịbụl, aha Chineke pụtara ọtụtụ puku ugboro n’ebe dị iche iche n’ime ya. N’ọtụtụ nsụgharị Baịbụl, ọ dị n’Abụ Ọma 83:18, bụ́ ebe na-asị: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, naanị Gị, bụ Onye kachasị ihe niile elu n’elu ụwa niile.”—Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe ụmụ mmadụ na-eme na-emetụ Jehova Chineke n’ahụ́. Mgbe Jehova napụtasịrị ụmụ Izrel n’Ijipt bụ́ ebe ha nọ na-agba ohu, ha leghaara ezi ndụmọdụ ya anya mgbe ụfọdụ. Nnupụisi ha ‘kpasuru ya iwe.’ Omume ha “wutere Onye Nsọ Izrel.”—Abụ Ọma 78:40, 41.

Jehova na-eche banyere onye nke ọ bụla n’ime anyị. Mgbe Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ. Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29-31.

Chineke anaghị emelara otu agbụrụ. Pọl onyeozi gwara ndị Gris bi n’Atens na Chineke ‘sitere n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.’ O kwukwara na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ 17:26, 27) Pita onyeozi sịrị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

GỊNỊ GA-ABỤ ỤGWỌ ỌRỤ GỊ? Ụfọdụ ndị bụ ndị “na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Ndị Rom 10:2) Ọ bụrụ na ị mata ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie banyere Chineke, a gaghị eduhie gị, ị ga-enwekwa ike ‘ịbịaru Chineke nso.’—Jems 4:8.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu isiokwu a, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?,” n’isi nke 1 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 6]

Otu ụzọ anyị ga-esi amata onye Chineke bụ bụ ikiri ihe ndị o kere