Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Umeala n’Obi Na-amasị Jehova

Ịdị Umeala n’Obi Na-amasị Jehova

Bịaruo Chineke Nso

Ịdị Umeala n’Obi Na-amasị Jehova

Ọnụ Ọgụgụ 12:1-15

NGANGA, ekworo, na oké ọchịchọ so n’àgwà ndị e ji mara ndị a ma ama n’ụwa taa. Ma, àgwà ndị dị otú ahụ hà na-eme ka anyị na Jehova Chineke dịrị ná mma? Mba, kama nke ahụ, ọ na-amasị Jehova ka ndị na-efe ya ofufe dịrị umeala n’obi. Akụkọ a kọrọ n’Ọnụ Ọgụgụ isi 12 mere ka nke a doo anya. O mere n’ala ịkpa Saịnaị, mgbe a napụtachara ụmụ Izrel n’Ijipt.

Ụmụnne Mozis ndị tọrọ ya, bụ́ Miriam na Erọn, ‘malitere ikwu okwu megide’ Mozis, bụ́ nwanne ha nke nta. (Amaokwu 1) Kama naanị ịgwa Mozis ihe ha bu n’obi, ha kwuru okwu megide ya, ikekwe, na-akọsa ihe na-adịghị ha mma n’ụlọikwuu ụmụ Izrel. Ebe ọ bụ Miriam ka e bu ụzọ kpọọ aha, ọ ga-abụ ya butere ụzọ n’ime mkpesa ahụ. Ihe mbụ mere ha ji na-atamu ntamu bụ na Mozis lụrụ onye Kush. Ọ̀ ga-abụ na Miriam na-enwere nwaanyị a anyaụfụ maka na o chere na ndị mmadụ ga-ahapụ ya lekwasịzie nwaanyị a na-abụdịghị onye Izrel anya?

E nwere ihe ndị ọzọ kpatara ntamu ahụ. Miriam na Erọn nọ na-ekwu, sị: “Ọ̀ bụ naanị site n’ọnụ Mozis ka Jehova kwuworo okwu? Ó sibeghị n’ọnụ anyị onwe anyị kwuokwa okwu?” (Amaokwu nke 2) Ọ̀ ga-abụ na isi ihe kpatara ntamu ahụ bụ na ha chọrọ inwetakwu ikike na ịghọkwu ndị a ma ama?

N’akụkọ ahụ, ọ dịghị ihe Mozis zara ná mkpesa ahụ ha nọ na-eme. Ọ ga-abụ na ọ gbachiri nkịtị ma die mkparị ahụ. Otú ahụ o si jiri ndidi gbachi nkịtị dabara n’ihe Baịbụl kwuru banyere ya nke bụ́ na ọ “dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile” nọ n’ụwa. * (Amaokwu nke 3) Ọ dịghị mkpa ka Mozis zarawa ọnụ ya. Jehova nọ na-ege ntị, ọ gbachitekwaara Mozis.

Jehova weere ya na ọ bụ ya ka a na-atamu ntamu megide. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ya họpụtara Mozis. Chineke baara ndị ntamu ahụ mba, wee chetara ha na mmekọrịta ya na Mozis pụrụ iche, sị ha: “M na-agwa ya okwu ihu na ihu.” Jehova jụziri Miriam na Erọn, sị: “Gịnị mere egwu atụghị unu ikwu okwu megide . . . Mozis?” (Amaokwu nke 8) Mgbe ha kwuru okwu megide Mozis, ọ bụ Chineke ka ha na-ekwugide n’ezie. N’ihi ajọ mkparị ahụ, Chineke ga-ewesa ha iwe.

E tiri Miriam ekpenta n’ihi na ọ ga-abụ ya malitere ntamu ahụ. Ozugbo ahụ, Erọn rịọrọ Mozis arịrịọ ka ọ rịọchitere Miriam arịrịọ. Chegodị nke a n’echiche! Ihe ga-eme ka ahụ́ dịghachi Miriam mma bụ arịrịọ nke onye ahụ o mejọrọ ga-arịọchitere ya! Mozis mere ihe ahụ a rịọrọ ya n’ihi ịdị umeala n’obi ya. Okwu mbụ Mozis kwuru n’ihe a merenụ bụ arịrịọ ọ rịọsiri Jehova ike ka ọ gbaghara nwanne ya nwaanyị. A gwọrọ Miriam, ma, o diri ihere dị n’ịnọpụ iche ruo abalị asaa.

Akụkọ a na-eme ka anyị ghọta àgwà ndị na-amasị Jehova na ndị na-anaghị amasị ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbịaru Chineke nso, anyị aghaghị ịgba mbọ wepụsịa okomoko, ekworo, na oké ọchịchọ ndị dị n’obi anyị. Ọ bụ ndị dị umeala n’obi ka Jehova na-ahụ n’anya. O kwere nkwa, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11; Jems 4:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ịdị umeala n’obi bụ àgwà na-eme ka mmadụ nwee ike iji ntachi obi die ikpe na-ezighị ezi, n’achọghị imegwara ihe e mere ya.