Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mkpa Ka Ị Mụọ Hibru na Grik?

Ọ̀ Dị Mkpa Ka Ị Mụọ Hibru na Grik?

Ọ̀ Dị Mkpa Ka Ị Mụọ Hibru na Grik?

ASỤSỤ mbụ e ji dee ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl bụ naanị asụsụ abụọ, bụ́ Hibru na Grik. * Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke duziri ndị ji asụsụ ndị ahụ dee Baịbụl. (2 Samuel 23:2) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ihe ha dere “si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”—2 Timoti 3:16, 17.

Ma, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-agụ Baịbụl taa anaghị aghọta Hibru na Grik. Kama nke ahụ, naanị otú ha ga-esi gụọ Baịbụl bụ ịgụ ndị nke a sụgharịrị n’asụsụ ha. Ma eleghị anya, ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị. Ebe ọ bụ na e sighị n’ike mmụọ nsọ sụgharịa ha, i nwere ike ịjụ, sị, ‘M̀ nwere ike ịghọtacha ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụrụ na ọ bụ Baịbụl a sụgharịrị asụgharị ka m na-agụ, ka m̀ kwesịrị ịmụ Hibru na Grik?’

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche

Tupu anyị azaa ajụjụ ahụ, e nwere ihe dị iche iche ị ga-eburu n’uche. Nke mbụ bụ na naanị ịma Hibru ma ọ bụ Grik oge ochie agaghị eme ka mmadụ nwekwuo mmasị n’ihe e dere na Baịbụl. Mgbe Jizọs na-agwa ndị Juu dịrị ndụ n’oge ya okwu, o kwuru, sị: “Unu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na unu chere na ọ ga-eme ka unu nwee ndụ ebighị ebi; ọ bụkwa ya na-agba àmà banyere m. Ma unu achọghị ịbịakwute m ka unu wee nwee ndụ.” (Jọn 5:39, 40) Olee ihe bụ́ nsogbu ha? Ọ̀ bụ na ha aghọtaghị Hibru? Ee e, ha maara asụsụ ahụ nke ọma. Ma, Jizọs kwukwara, sị: “Amaara m nke ọma na unu enweghị ịhụnanya Chineke n’ime onwe unu.”—Jọn 5:42.

N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst na-asụ Grik bi n’obodo Kọrịnt oge ochie, sị: “Ndị Juu na-asị ka e nye ha ihe ịrịba ama, ndị Grik na-achọkwa amamihe; ma anyị na-ekwusa Kraịst a kpọgidere n’osisi, ọ bụụrụ ndị Juu ihe ịsụ ngọngọ, ma bụụrụ ndị mba ọzọ ihe nzuzu.” (1 Ndị Kọrịnt 1:22, 23) N’ihi ya, o doro anya na naanị ịma otú e si asụ Hibru ma ọ bụ Grik agaghị eme ka mmadụ nabata ihe dị n’Okwu Chineke.

Ihe nke abụọ mmadụ ga-eburu n’uche bụ na ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-asụ Hibru ma ọ bụ Grik nke oge a, asụsụ ndị ahụ dị nnọọ iche na Hibru na Grik e ji dee Baịbụl. Ọ na-esiri ihe ka ọtụtụ ná ndị na-asụ Grik taa ike ịghọta Grik e ji dee Baịbụl nke ọma. Nke a bụ n’ihi na e nweela okwu ndị ọhụrụ n’asụsụ ahụ, bụ́ ndị nọchiri ndị nke ochie, ọtụtụ okwu ochie a ka nwekwara na ya apụtaghịzi ihe ha pụtaburu. Dị ka ihe atụ, okwu a sụgharịrị “mara mma” n’Ọrụ 7:20 nakwa ná Ndị Hibru 11:23 pụtara “ihe na-atọ ọchị” na Grik nke oge a. Ihe ọzọkwa bụ na ụtọ asụsụ na otú e si ahazi ahịrịokwu n’asụsụ ahụ agbanweela nke ukwuu.

Ya bụrụgodị na ị mụọ Hibru na Grik nke oge a, ọ pụtachaghị na ị ga-aghọtakwu Baịbụl nke ọma ma ị gụọ ya n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya. Ọ ka ga-adị gị mkpa ịgụ akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ndị na-akọwa ụtọ asụsụ iji mata otú e si asụ asụsụ ndị ahụ mgbe e dere akwụkwọ ndị dị na Baịbụl.

Ihe nke atọ bụ na ịmụ asụsụ ọhụrụ nwere ike isi ezigbo ike. Ọ bụ ezie na o nwere ike ọ gaghị esichara onye malitere ịmụ asụsụ ọhụrụ ike ịmụta ahịrịokwu ụfọdụ n’asụsụ ahụ, o nwere ike ịbụ mgbe onye ahụ nọrọla na-asụ asụsụ ahụ ruo ọtụtụ afọ ka ọ ga-aghọta ụmụ irighiri ihe dị mkpa n’asụsụ ahụ. Ka ọ dịgodị, ilu ochie a na-atụ nwere ike ịbụ eziokwu na nke a, Onye na-anọghị mgbe e liri ozu na-esi n’ụkwụ abọ ya. N’ihi gịnị?

Olee Ihe Okwu ahụ Pụtara?

Ọ̀ dịtụla mgbe onye na-amụ asụsụ gị jụrụ gị ihe otu okwu pụtara? Ya bụrụ otú ahụ, o doro gị anya na ọ naghị adị mfe mgbe niile ịza ya. N’ihi gịnị? N’ihi na otu okwu nwere ike inwe ihe dị iche iche ọ pụtara. O nwere ike ịbụ na ị jụrụ onye ahụ ka ọ gwa gị otú okwu ahụ si pụta n’ahịrịokwu. Ọ bụrụ na ị maghị otú okwu ahụ si pụta, o nwere ike isiri gị ike ịma ihe ị ga-agwa ya. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ịjụ gị ihe okwu Igbo bụ́ “àkwà” pụtara. Otu okwu a nwere ike ịpụta ihe dị iche iche dabere n’ihe a na-ekwu. O nwere ike ịpụta àkwà mmiri n’otu ebe. Mgbe a na-ekwu ihe ọzọ, o nwere ike ịpụta àkwà ndina. Olee nke ọ pụtara?

Akwụkwọ ọkọwa okwu nwere ike ịgwa gị ihe niile otu okwu nwere ike ịpụta. Ụfọdụ akwụkwọ ọkọwa okwu na-ebudị ụzọ edepụta ihe ndị okwu ahụ na-apụtakarị. Ma, ọ bụ ihe a na-ekwu mgbe e kwuru okwu ahụ ga-enyere gị aka ịmata kpọmkwem ihe ọ pụtara. Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na ị matụ banyere ọgwụ ma chọọ ịmata ihe na-arịa gị. I nwere ike ịgụ akwụkwọ ọkọwa okwu na-ekwu banyere ọrịa na ọgwụ. O nwere ike ịgwa gị na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị niile ihe ahụ na-eme gị na-eme nwere otu ụdị ọrịa, gwakwa gị na mmadụ ole na ole ihe ahụ na-eme gị na-eme nwere ọrịa ọzọ dị nnọọ iche. Ọ ga-adị gị mkpa ịghọtakwu nnọọ ọtụtụ ihe tupu gị amara kpọmkwem ihe na-arịa gị. N’otu aka ahụ, na otu okwu na-apụtakarị otu ihe agaghị enyere gị aka mgbe ị na-agụ ihe dị mkpa bụ́ ebe okwu ahụ pụtara ihe ọzọ. Ọ dị mkpa ka ị ghọtakwuo ihe a na-ekwu tupu gị aghọta ihe okwu ahụ pụtara n’ebe ahụ.

A bịa n’ịmụ okwu ndị dị na Baịbụl, ọ dịkwa mkpa ka ị mara ihe a na-ekwu n’ebe okwu pụtara. Dị ka ihe atụ, okwu Hibru na Grik a sụgharịrị “mmụọ” nwere ike ịpụta ihe dị iche iche, dabere n’ihe a na-ekwu. Mgbe ụfọdụ, e nwere nnọọ ike ịsụgharị ha “ifufe.” (Ọpụpụ 10:13; Jọn 3:8) N’ebe ndị ọzọ, ha na-apụta ike ndụ dị n’ihe niile dị ndụ, ma mmadụ ma anụmanụ. (Jenesis 7:22; Abụ Ọma 104:29; Jems 2:26) A na-akpọkwa ndị e kere eke a na-anaghị ahụ anya bi n’eluigwe mmụọ. (1 Ndị Eze 22:21, 22; Matiu 8:16) A na-akpọkwa ike Chineke nke nọ n’ọrụ mmụọ nsọ ya. (Jenesis 1:2; Matiu 12:28) Otu okwu ahụ na-apụtakwa ikike na-eme ka mmadụ na-akpa otu ụdị àgwà, ma ọ bụ na-ele ihe anya otú o si ele ya, ọ na-apụtakwa àgwà otu ìgwè mmadụ nwere.—Jọshụa 2:11; Ndị Galeshia 6:18.

Ọ bụ ezie na akwụkwọ ọkọwa okwu Hibru ma ọ bụ Grik nwere ike idepụta ihe a dị iche iche okwu ahụ pụtara, ọ bụ ihe a na-ekwu ga-enyere gị aka ịmata nke a na-ekwu. * Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ma ị̀ na-agụ Baịbụl n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya ma ọ bụ na ị na-agụ nke a sụgharịrị n’asụsụ gị.

Ọ̀ Dị Njọ Ịgụ Baịbụl A Sụgharịrị Asụgharị?

Ụfọdụ ndị agbaala ezigbo mbọ ịmụ Hibru ma ọ bụ Grik e ji dee Baịbụl ma ọ bụ ha abụọ. Ọ bụ ezie na ha maara na ọ bụghị ihe niile ka ha ga-aghọta, obi na-adị ha ụtọ na ha na-agụ Baịbụl n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya, ha na-echekwa na mbọ ha gbara efughị ọhịa. Ma, ya bụrụ na ị gaghị emeli otú ahụ, obi ò kwesịrị ịda gị mbà, gị akwụsịkwa ịgbalị ịghọta eziokwu Baịbụl? Mbanụ! E nwere ihe dị iche iche mere anyị ji kwuo otú ahụ.

Nke mbụ bụ na o kwesịrị ekwesị ịgụ Baịbụl a sụgharịrị asụgharị. N’ezie, ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke a sị na ọ bụ Agba Ọhụrụ, si ná nsụgharị Grik nweta ihe ha dere mgbe ha na-ekwu ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. * (Abụ Ọma 40:6; Ndị Hibru 10:5, 6) Ọ bụ ezie na ha na-asụ Hibru, nweekwa ike isi na Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ nweta ihe ha ga-ede, o doro anya na obi ruru ha ala isi n’amaokwu ndị ahụ a sụgharịrị asụgharị, bụ́ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị ga-agụ ihe ha dere nwere, nweta ihe ha ga-ede.—Jenesis 12:3; Ndị Galeshia 3:8.

Nke abụọ bụ na ya bụrụgodị na mmadụ nwere ike ịghọta asụsụ ndị e ji dee Baịbụl, ọ bụ naanị okwu Jizọs a sụgharịrị asụgharị ka o nwere ike ịgụ. Nke a bụ n’ihi na ndị dere Oziọma (ya bụ, Matiu, Mak, Luk na Jọn) ji Grik dee ihe ndị Jizọs kwuru na Hibru. * Onye ọ bụla chere na mmadụ inwe ike ịgụ okwu ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi dere n’asụsụ mbụ ndị ha ji dee ha na-eme ka onye ahụ nwee amamihe pụrụ iche kwesịrị ichebara ihe nke ahụ pụtara echiche. Na Jehova nyere mmụọ nsọ ya iji chebe okwu Ohu ya kasị ukwuu naanị n’ụdị a sụgharịrị asụgharị, n’asụsụ mmadụ niile na-aghọta nke ọma n’oge ahụ, gosiri na ihe dị mkpa abụghị asụsụ anyị ji gụọ Baịbụl. Ihe dị mkpa bụ ka anyị gụọ ihe e dere n’ime ya nke si n’ike mmụọ nsọ n’asụsụ anyị ga-enwe ike ịghọta ya ma mee ihe o kwuru.

Nke atọ bụ na ọ bụ ndị dị umeala n’obi si ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ka a ga-ezi “ozi ọma” dị na Baịbụl. (Mkpughe 14:6; Luk 10:21; 1 Ndị Kọrịnt 1:27-29) N’ihi nke a, ihe ka nnọọ ọtụtụ ná ndị mmadụ taa nwere ike ịmụta nzube Chineke na Baịbụl e dere n’asụsụ nke ha n’amụghị asụsụ ọzọ. N’ọtụtụ asụsụ, e nwere nsụgharị Baịbụl dị iche iche, bụ́ nke ga-eme ka mmadụ nwee ike ịhọrọ nke ọ chọrọ ịgụ. *

Oleezi otú i nwere ike isi jide n’aka na ị ghọtara eziokwu dị na Baịbụl? Ndịàmà Jehova achọpụtala na ịgụ Baịbụl n’isiokwu n’isiokwu, na-eburu n’obi ihe amaokwu ndị dị na ya na-ekwu, na-eme nnọọ ka a ghọta ihe dị n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ha na-ewepụta otu isiokwu, dị ka “Alụmdi na Nwunye,” ma gụọ amaokwu Baịbụl niile kwuru banyere ya. Nke a na-enyere ha aka ịhụ otú otu ebe na Baịbụl si eme ka a ghọtakwuo ihe ebe ọzọ pụtara. Ọ́ gaghị adị mma ka ị nabata aro Ndịàmà Jehova na-atụrụ mmadụ niile ka ha mụwara ha Baịbụl n’ụlọ ha n’efu? N’agbanyeghị asụsụ ị na-asụ, Chineke chọrọ ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4; Mkpughe 7:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 E dere akụkụ ụfọdụ nke Baịbụl n’Arameik, bụ́ asụsụ yiri Hibru e ji dee Baịbụl. Ebe ụfọdụ n’ime ha bụ Ezra 4:8 ruo 6:18 na 7:12-26, Jeremaya 10:11, na Daniel 2:4b ruo 7:28.

^ par. 14 E kwesịrị iburu n’uche na ụfọdụ akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ọkọwa okwu Baịbụl na-edepụta naanị otú e si sụgharịa okwu ndị a n’otu nsụgharị Baịbụl, dị ka ná nsụgharị King James Version, kama ịkọwa ihe okwu nke ọ bụla pụtara.

^ par. 17 Ka ọ na-erule n’oge Jizọs Kraịst na ndịozi ya, e nweela akwụkwọ niile dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik. E mechara kpọwa nsụgharị a Septuagint, ndị Juu na-asụ Grik gụkwara ya mgbe niile. Ọ bụ na Septuagint ka e si nweta ihe ka ọtụtụ n’ọtụtụ narị ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

^ par. 18 E kweere na Matiu onyeozi bu ụzọ dee Oziọma ya na Hibru. Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, Oziọma Matiu anyị nwere taa bụ nke a sụgharịrị na Grik, ikekwe nke Matiu sụgharịrị n’onwe ya.

^ par. 19 Iji hụ ebe a tụlere ụdị nsụgharị Baịbụl dị iche iche e nwere na otú ị ga-esi họta nke ziri ezi, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị nke Ọma?” nke dị ná mbipụta nke May 1, 2008 nke magazin a.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

Septuagint

Ndị Juu na-asụ Grik n’oge Jizọs na ndịozi ya na-agụchi nnọọ Septuagint Grik anya. Nke a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị na Grik. Septuagint pụrụ iche n’ihi na ọ bụ ya bụ Akwụkwọ Nsọ mbụ a maara a sụgharịrị n’asụsụ ọzọ, ọ pụkwara iche n’ihi oge o were iji sụgharịa ya. Otu ìgwè ndị nsụgharị malitere ọrụ na Septuagint na narị afọ nke atọ Tupu Oge Anyị, ndị ọzọ asụgharịchaa ya mgbe ihe karịrị otu narị afọ gasịrị.

Ndị Kraịst oge mbụ mere ngwá iji Septuagint mee nnọọ ka o doo ndị mmadụ anya na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. Ha ji Septuagint rụpụta nnọọ ihe nke na ụfọdụ ndị lewere ya anya ka nsụgharị Baịbụl “Ndị Kraịst.” Nke a mere ka ọtụtụ ndị Juu gharazie inwe mmasị na ya, meekwa ka e nwee nsụgharị ndị ọhụrụ na Grik. Otu n’ime nsụgharị ndị ahụ bụ nke onye na-eso ụzọ ndị Juu nke aha ya bụ Aquila sụgharịrị na narị afọ nke abụọ Oge Anyị. Mgbe otu ọkà mmụta Baịbụl na-akọwa nsụgharị ahụ, o kwuru banyere otu “ihe a na-atụghị nnọọ anya ya dị na ya.” Aha Chineke, bụ́ Jehova, nke e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru ochie dee pụtara ọtụtụ ebe ná nsụgharị Baịbụl Grik Aquila.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Israel Antiquities Authority

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọ dị mkpa ka anyị gụọ ihe e dere n’ime ya nke si n’ike mmụọ nsọ n’asụsụ anyị ga-enwe ike ịghọta ya ma mee ihe o kwuru