Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Na-akwụ Ndị Na-efe Ya Ụgwọ Ọrụ

Onye Na-akwụ Ndị Na-efe Ya Ụgwọ Ọrụ

Bịaruo Chineke Nso

Onye Na-akwụ Ndị Na-efe Ya Ụgwọ Ọrụ

Ọ BỤRỤ na i meere mmadụ ihe ma ọ bụ nye ya ihe, onye ahụ asị gị “i meela,” obi ọ́ naghị adị gị ụtọ? Obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ ekele anyị maka ihe ọma anyị mere, nke ka nke ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye anyị hụrụ n’anya. N’eziokwu, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị ka anyị kacha hụ n’anya. Ọ̀ na-echefu mbọ anyị na-agba ife ya? Ka anyị tụlee otú o si meso Ibed-melek ihe. Ibed-melek chebere otu n’ime ndị amụma Jehova n’agbanyeghị na ọ ma na nke a nwere ike ịkpatara ya nsogbu.—Gụọ Jeremaya 38:7-13 nakwa 39:16-18.

Ònye bụ Ibed-melek? Ọ ga-abụ na ọ na-eje ozi n’obí Zedekaya, bụ́ eze Juda. * Ibed-melek na Jeremaya dịkọrọ ndụ. Ọ bụ Jeremaya ka Chineke zigara ka ọ gaa gwa ndị Juda na-eme ihe ọjọọ na a ga-ebibi ha. Ibed-melek na-atụ egwu Chineke ma na-asọpụrụ Jeremaya nke ukwuu, ọ bụ eziokwu na ndị isi ha na ya na-arụkọ ọrụ anaghị atụ egwu Chineke. A nwalere àgwà ọma Ibed-melek mgbe ndị isi na-anaghị atụ egwu Chineke boro Jeremaya ebubo ụgha na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru, ma tụba ya n’olulu bụ́ apịtị apịtị ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ. (Jeremaya 38:4-6) Gịnị ka Ibed-melek ga-eme?

Ibed-melek atụghị ụjọ ihe ndị isi ahụ nwere ike ime ya, ọ katara obi gaa gwa eze okwu ozugbo. Ọ gakwuuru Zedekaya n’ihu ọha ma gwa ya na ihe a na-eme Jeremaya adịghị mma. Ọ ga-abụ na ọ nọ na-atụ ndị ahụ tụbara Jeremaya n’olulu aka, ma gwa eze, sị: “Ọ bụ ihe ọjọọ ka ndị a mere . . . Jeremaya.” (Jeremaya 38:9) Eze gere Ibed-melek ntị ma kpọnye ya mmadụ iri atọ ka ha gaa kpọpụta Jeremaya n’olulu ahụ a tụbara ya.

E nwere àgwà ọma ọzọ Ibed-melek nwere. O gosiri Jeremaya obiọma mgbe a chọrọ ịkpọpụta ya. Ọ chịịrị “nkịrịka ákwà na iberibe ákwà kara nkà . . . ma kegide ha n’ụdọ wee sedara ya Jeremaya n’olulu ahụ.” Gịnị mere o ji sedara Jeremaya nkịrịka ákwà na iberibe ákwà? Ọ bụ ka Jeremaya tinye ha na mkpaabụ ya ka eriri ahụ ghara imerụ ya ahụ́ mgbe a na-adọpụta ya.—Jeremaya 38:11-13.

Jehova hụrụ ihe a Ibed-melek mere. Ọ̀ dị ya mma? Chineke si n’ọnụ Jeremaya gwa Ibed-melek na ya ga-ebibi Juda n’oge na-adịghị anya. Chineke kwere Ibed-melek nkwa ise. Jehova sịrị ya: “M ga-anapụta gị . . . A gaghị enyefe gị n’aka ndị ị na-atụ egwu . . . M ga-emere gị ụzọ mgbapụ . . . Mma agha agaghị egbu gị . . . Mkpụrụ obi gị ga-abụrụ gị ihe nkwata.” Gịnị mere Jehova ji kwe Ibed-melek nkwa na ya ga-anapụta ya? Jehova gwara ya, sị: “N’ihi na ị tụkwasịrị m obi.” (Jeremaya 39:16-18) Jehova maara na ihe mere Ibed-melek ji mee ihe ahụ o mere bụ na ọ tụkwasịrị Chineke obi, nweekwa okwukwe na Chineke, ọ bụghị naanị maka na ahụhụ Jeremaya na-ata metụrụ ya n’obi.

Akụkọ a na-akụziri anyị na Jehova anaghị echefu ozi anyị na-ejere ya. Baịbụl mesiri anyị obi ike na Jehova anaghị echefu ihe anyị ji obi anyị niile na okwukwe rụọrọ ya, n’agbanyeghị otú ihe ahụ hà. (Mak 12:41-44) Nke a ó kwesịghị ime ka ị bịarukwuo Chineke nso? Ya bụrụ otú ahụ, ka obi sie gị ike na ọ ga-emezu ihe a Baịbụl kpọrọ ya, ya bụ: “Onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”— Ndị Hibru 11:6.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Mee:

Jeremaya 32-50

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Baịbụl kpọrọ Ibed-melek “ọnaozi.” (Jeremaya 38:7) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ nwoke a pịrị amụ ka a na-akpọ ọnaozi, a na-akpọkwa onye na-eje ozi n’obí eze ọnaozi.