Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Ndịda Ndịda Yurop

Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Ndịda Ndịda Yurop

Akwụkwọ Ozi Si Gris

Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Ndịda Ndịda Yurop

ANYỊ si na Krit, bụ́ obodo mmiri gbara gburugburu, kwọrọ ụgbọ mmiri gawa otu obere obodo aha ya bụ Gavdọs. Oké Osimiri Mediterenian gbara Gavdọs gburugburu. Ka ụgbọ mmiri anyị na-aga, otu nnukwu ugwu aha ya bụ Ugwu Lefka bịaziri na-epe mpe n’anya anyị ruo mgbe anyị na-enwekwaghị ike ịhụ ya. Anyị dị mmadụ iri na atọ n’ụgbọ mmiri ahụ. Anyị na-aga ikwusa ozi ọma na Gavdọs. Gavdọs dị n’ebe ndịda ndịda Yurop.

Ka ụgbọ mmiri anyị na-aga, anyị chere na anyị agaghị enwe nsogbu ọ bụla maka na oge a bụ oge okpomọkụ. Ma n’oge na-adịghị anya, oké ifufe malitere ife n’oké osimiri ahụ, na-ebugharị ụgbọ anyị. Ahụ́ kpaghasịrị m, mụ echeta na Baịbụl kọrọ na oké ifufe fere n’oké osimiri a n’otu oge Pọl onyeozi mere njem n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. N’oge ahụ, ihe a na-akpọ Gavdọs bụ Kọda. (Ọrụ Ndịozi 27:13-17) M nọ na-ekpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka ka anyị ruo Gavdọs n’udo.

Anyị mechara hụ obodo ahụ anyị na-aga. Ebe ahụ bụ okwute okwute. Okwute ndị ahụ si n’oké osimiri nupụta. Obere obodo a dị larịị, ma e nwere ebe ndị dị elu karịa ibe ha. Obere osisi juru n’ọtụtụ ebe n’obodo a. Obodo a dịkwa naanị ihe dị ka kilomita iri abụọ na isii n’ogologo nakwa n’uhiè. N’ebe ụfọdụ, e nwedịrị osisi junipa n’ikpere mmiri ya.

O nwere mgbe ndị bi n’obodo a dị ihe dị ka puku mmadụ asatọ. Ma ugbu a, ndị bi na ya erughị mmadụ iri anọ. E nwere ike ikwu na mmepeanya erutebeghị obodo a. Ọ bụ eziokwu na ụgbọ mmiri ndị na-ebu ibu na ndị nke na-ebu mmanụ na-agbafekarị na mmiri gbara obodo a gburugburu, ma ọ na-esi ike inweta ụgbọ mmiri si obodo a aga Krit. E nwetakwanụ enweta, ọ naghị apụ mgbe e kwuru na ọ ga-apụ, mgbe ụfọdụkwa, a naghị ekwe ka ụgbọ mmiri pụọ n’ihi oké ifufe ma ọ bụ ebili mmiri.

Anyị bịara n’obodo Gavdọs ka anyị zie ndị bi na ya ozi ga-eme ha obi ụtọ. Ozi ọma anyị ga-ezi ha bụ na Chineke ga-eme ka ihe dị mma n’ọdịnihu, na ọ dịghị onye ga-arịa ọrịa mgbe ahụ, o nwekwaghị onye ga-anwụ anwụ. Ozugbo ụgbọ mmiri anyị chọrọ ịkwụsị, onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ịpụta gaa zie ndị obodo a ozi ọma a.

Ebe ọ bụ na ifufe nọ na-ebugharị ụgbọ mmiri anyị ihe karịrị awa anọ na ọkara, onye lere anyị anya n’ihu ga-ama na anyị hụsiri anya na njem a. Ma ozugbo anyị hitụrụ ụra ma ṅụọ kọfị, ahụ́ bịara gbasie anyị ike. Ihe ọzọ anyị mere tupu anyị amalite ikwusara ndị obodo a ozi ọma bụ ịgụ ebe Baịbụl kwuru banyere njem Pọl onyeozi mere. Mgbe anyị gụchara, anyị kpere ekpere.

Ndị bi n’obodo a na-anabata ndị ọbịa nke ọma. Ha nabatara anyị n’ụlọ ha ma lee anyị ọbịa. Ma ọ bụghị naanị ozi ọma ka anyị ziri ha, anyị nyekwaara ụfọdụ n’ime ha aka. Mgbe anyị na-ezi otu nwaanyị ozi ọma, otu onye n’ime anyị hụrụ na e nwere ihe mebiri n’ụlọ ahịa nwaanyị ahụ, ya enyere ya aka mezie ya. Aka a e nyeere nwaanyị ahụ mere ya obi ụtọ. Ọ naara akwụkwọ e ji amụ Baịbụl anyị nyere ya, ya ekelee anyị ma jaa anyị mma maka ozi ọma anyị na-ekwusa. Otu nwaanyị ọzọ kelere anyị nke ọma ma kwuo, sị, “Ebe ọ bụ na unu bịara n’ime ime ebe a anyị bi ikwusara anyị ozi ọma, o doro anya na ọrụ a unu na-arụ bụ ọrụ Chineke, ọ bụghị ọrụ mmadụ.”

Akwụkwọ e ji amụ Baịbụl ndị anyị ji bịa masịrị ndị obodo a. Otu nwoke natara anyị Ụlọ Nche na Teta! ma kwuo na ya chọkwuru akwụkwọ anyị ndị ọ ga-agụ n’oge oyi. Otu nwoke ọzọ natakwara anyị akwụkwọ ọ ga-agụ, gwakwa anyị ka anyị nyekwuo ya akwụkwọ ọ ga-edebe n’ụlọ ọrụ ya maka ndị ọ na-arụrụ ọrụ. O nyekwara anyị adres ya ka anyị nwee ike ịna-ezitere ya Ụlọ Nche na Teta! kwa ọnwa. Obi tọrọ otu ezinụlọ ezigbo ụtọ mgbe anyị gosiri ha aha obodo ha na Baịbụl. Ha natakwara anyị Ụlọ Nche na Teta!

Ọ bụ eziokwu na otú ndị bi na Gavdọs si gee anyị ntị tọrọ anyị ụtọ, ma obi jọrọ ụfọdụ n’ime anyị njọ mgbe ha chetara ihe mere n’obodo a n’oge gara aga. Ha chetara ihe ahụ mgbe anyị hụrụ otu ụlọ dị n’ikpere mmiri a na-akpọ Sarakiniko. N’oge gara aga, ọ bụ n’ụlọ a ka ndị gọọmenti na-akpọga ndị ha chụpụrụ n’obodo. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a kpọgara otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Emmanuel Lionoudakis n’ihe dị ka afọ 1938 maka na ọ na-ekwusa ozi ọma. * E kwuru na n’oge ahụ, Gavdọs bụ “ala kpọrọ nkụ nke akpị juru, ala nke ọtụtụ ndị . . . na-anwụ na ya n’ihi agụụ na ọrịa, [ala] mmiri gbara gburugburu nke na-ata isi ndị bi na ya.” Lionoudakis na-aga na mmiri egbu azụ̀ iji nweta ihe ọ ga-eri. Ma, ọ na-ekwusara ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ n’ebe ahụ ozi ọma n’agbanyeghị na ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova nọ n’obodo a. Mgbe nwa ya nwaanyị, ọgọ ya nwoke, na nwa nwa ya, bụ́ ndị anyị na ha so bịa, hụrụ ebe ahụ o biri n’ihe dị ka iri afọ asaa gara aga, anya mmiri gbara ha. Ma otú Lionoudakis si tachie obi ma rubere Chineke isi mere ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-erubere Chineke isi ma na-ejere ya ozi.

Ndị niile gọọmenti kpọtara na Gavdọs tara ezigbo ahụhụ n’ebe a. Ma obi tọrọ anyịnwa ụtọ ịbịa ná ngwụsị izu a kwusaa ozi ọma n’ebe niile na Gavdọs. Anyị nyere ndị bi n’ebe a Ụlọ Nche na Teta! iri anọ na isii na broshọ itoolu. Anyị na-atụ anya na anyị na ndị enyi ọhụrụ anyị a ga-ahụ ọzọ!

Mgbe anyị na-amatala ihe na-emenụ, oge anyị ji ala eruola. Ma a malitere inwe oké ifufe na ebili mmiri n’oké osimiri nke mere na ụgbọ anyị apụghị n’elekere ise nke mgbede, bụ́ mgbe e kwuburu na ọ ga-apụ. Ọ bụzi n’etiti abalị ka anyị banyere n’ụgbọ, ma o doro anyị anya na anyị ga-atakwa ahụhụ na njem a otú anyị tara mgbe anyị na-abịa. Ụgbọ anyị mechara pụọ n’elekere atọ nke isi ụtụtụ. Ebili mmiri ahụ nyere ụgbọ anyị ajọ nsogbu, ma anyị mechara rute Krit. Njem ahụ were anyị awa ise. Mgbe anyị pụtara n’ụgbọ, ụkwụ nọ na-ama anyị jijiji. Ma obi dị anyị ụtọ na anyị emeela ka ndị bi na Gavdọs mara aha Chineke. (Aịzaya 42:12) Onye ọ bụla n’ime anyị kwetara na mbọ anyị gbara ịga Gavdọs efughị ọhịa. N’oge na-adịghị anya, anyị ga-echefu ahụhụ niile anyị tara, ma o doro anyị anya na anyị agaghị echefu njem a echefu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ akụkọ ndụ Emmanuel Lionoudakis, gaa n’Ụlọ Nche Septemba 1, 1999, peeji nke 25-29.

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ikpere Mmiri Trepiti, bụ́ ebe ndịda Yurop gwụrụ

[Foto dị na peeji nke 25]

Ikpere Osimiri Sarakiniko, bụ́ ebe e nwere ụlọ ebe ndị a chụpụrụ n’obodo biri. E ji ihe a e dere n’ebe a echeta ndị biri na ya

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 25]

Courtesy of Hellenic Post