Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl

Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl

Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl

ỤMỤAKA DỊ AFỌ ATỌ GBADAWA

Mmiri na-ezo.

Toochi ekwuo, sị,

“Mmiri a ekweghị m pụọ èzí.

Gịnị mere na mmiri a ekweghị akwụsị akwụsị?”

Ma, o juru Toochi anya

ịhụ na anyanwụ awaala,

mmiri ahụ akwụsịkwa izo.

Obi tọrọ Toochi ụtọ!

Ọ gbapụrụ n’èzí. Ị̀ ma ihe ọ hụrụ mgbe ọ gbapụrụ n’èzí? Ihe ọ hụrụ mara ezigbo mma.

Toochi kwuru, sị, “Amaghị m na ọ bụ mmiri ozuzo nke si n’aka Chineke na-eme ka okooko osisi puo!”

IHE NDỊ NNE NA NNA GA-EME

Gwa nwa gị ka o gosi gị:

Windo Toochi Okooko osisi

Nnụnụ Osisi

Lee ma ị̀ ga-ahụ ihe ndị a zoro ezo.

Abụzụ Ụgbọelu

Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:17. Gịnị mere Jehova ji mee ka mmiri na-ezo?